Mgbe Ekwensu nwasịrị ọnwụnwa ya, ọ rapụrụ Jisọs nwoge nta, ndị mụọ-ozi doziiri Ya ihe oriri n’ọzara, ma gbaakwa Ya ume, ngọzi nke Nna ya n’adinyekwara Ya. Ekwensu adawori n’ọnwụnwa ya dịkasi egwu, kama ọ nọkwa n’echere Jisọs n’oge ije ozi ya, mgbe ọ g’etinyekwara ya ụkwụ aghụghọ ya n’oge dị iche-iche. O nwekwara olile-anya imeri Ya site n’ikpasu ndị ahụ n’agaghị anabata Jisọs, ka ha kpo ya asi ma chọọkwa ila ya n’iyi. Ekwensu nwere nzukọ pụrụ iche ya na ndị mụọ-ozi ya. Ha nwetara mkpọchụ-iru nwekwa oke iwe na ọnụma n’ihi na ọ dịghị ihe ha metara Ọkpara Chineke ahụ. Ha kpebiri na ha g’adi aghụghọ karịsia, ma werekwa ike ha n’ụzọ kachasi elu ikpali ekweghị-ekwe n’obi ndị obodo nke aka Ya nihe banyere Jisọs ibu onye- nzọpụta nke ụwà, ma sitekwa n’ụzọ dị otua mee ka obi Jisọs daa mba n’ije ozi ya. Nagbanyeghị otu ndị Juu pụrụ iji hazie ememe nile ha na nchụ-àjà niile ha, ọbụrụ na ha pụrụ ime ka anya ha kpue ìsì n’ihe banyere okwu niile nke amụma, ma meekwa ka ha kwenye na ọ bụ onye-eze uku nke ụwà, bụ onye g’emezu amụma ndịa, ha ga edebe uche ha na—agbatikwa ya ka Mesaia ahụ bia. NUA 29.1
Mgbe ahụ ka e gosịrị m na Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya nọ n’ọlụ nke ukuu n’oge ije-ozi nke Kraist, n’emeju obi ndị madụ n’ekweghị-ekwe, ịkpọ-asị na ịkwa-emo. Mgbe niile, ka Jisọs kwupụtara nke bụ ezi-okwu n’atụ ha nmehie ha n’anya, ha n’abụ ndị a kpasuru iwe. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya rugịdesikwara ha ike iwepu ndụ Ọkpara Chineke ahụ. Otu mgbe ha weliri nkume ịtụ Ya, kama ndị mụọ-ozi chebere ya, ma kuru ya pụa site n’etiti igwe madụ ahụ ndị iwe ji, rue ebe o nwere ahụ udo. Ozọkwa dịka ezi-okwu n’ada site n’ọnụ ya dị nsọ, igwe madụ ahụ jidere ya, wee dọkpụrụ ya rue elu-ugwu, ka ha kwatue ya n’àlà. Oke ndọndọ wee pụta n’etiti onwe ha banyere ihe ha g’eme Ya, mgbe ndị mụọ-ozi zonarikwara ya n’anya igwe madụ ahụ o wee n’esitekwa n’etiti ha gabiga, ma chọro ụzọ ya. NUA 30.1
Ekwensu nọgịdekwara n’olile-anya ya na atụmatụ ya niile ime ka obi madụ niile sie ike, ma nwekwa uche ọjọọ medgịde Jisọs. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka ọnụ-ọgụgụ ndị g’anabata ya dịka Ọkpara nke Chineke dị naanị ole-na-ole, ka Jisọs hụta nhụju-anya ya na ịchụ-àjà ya dịka ihe karịrị akarị ime n’ihi ọgbakọ nta dị otua. Kama a hụrụ m na asikwa na o bụ naanị nkpụrụ madụ abụa bụ ndị g’anabata Jisọs dịka Ọkpara Chineke ikwenye na ya rue nzọpụta nke nkpụrụ-obi ha, ọ g’emejupụtakwa atụmatụ ahụ. NUA 30.2
Jisọs malitere ọlụ ya site n’itiwa ikike ahụ nke Ekwensu nwere n’aru ndị n’ata ahụhụ. Ọ gwọrọ ndị taworo ahụhụ site n’ikike ọjọọ ya. O nyeghachiri ndị orịa aru-ike ha, Ọ gwọrọ ndị ngwọrọ, ma meekwa ka ha wulie elu nime ọñụ nke obi ha, nyekwa Chineke otuto. O mere ndị-ìsì ka ha hụ ụzọ, nyeghachikwa arụ-ike site n’ike ọjọọ nke Ekwensu ọtụtụ afo. Ndị n’adịghị ike, ndị nọ n’ụjo, na ndị dara mba, Ọ kasichara ha niile obi site n’okwu amara. O mere ndị nwụru anwụ ka ha bilie, ndị madụ nyekwara Chineke otụtọ n’ihi ike Ya nke e mere ka o pụta ihe n’ụzọ dị ukuu. O lụrụ oké olu-ebube nye ndị niile kwere na Ya. Ọbụna ndị niile n’adịghị ike nọkwa na nhụju-anya ndị Ekwensu jidere na nmeri ya. Jisọs napụtara ha site n’aka ya, ma wetara ha site n’ike nke ya, izu-oke nke arụ, na oke ọñụ na obi-ụtọ. NUA 31.1
Ndụ nke Kraist jupụtara na ọmiko, obi-ebere na ihụnanya. Ọ n’etinye uche n’anakwa ntị, n’emekwa ka ndị biakutere Ya nwere onwe ha pụa n’ọnọdụ ọjọọ ha niile. Igwe madụ n’ebu ihe-àmà ndịa n’arụ ha n’egosi ike nke Chineke. Ma otu ọdị, ọtụtụ nime ha, ngwa-ngwa a luzuru ọlụa, n’emekwa ihere n’ebe Ọ nọ bụ onye a dị ume-àlà nke bụkwa Onye-ozizi ukuu. N’ihi na ndị-isi ekwenyeghị na ya, ha achọghị isoro Ya taa ahụhụ. Ọ bụ onye n’eri uju marakwa ihe mgbu. Kama naanị madụ ole na ole nagịdere ụdi ndụ ya nke anya-udo, na ndụ Ya nke ijụ onwe-onye. Ọ bụ ihe ụtọ ha inwe nsọ nke ụwà n’enye. Ọtụtụ sokwara Ọkpara Chineke, n’añakwa ntị n’ozizi Ya niile, n’erijukwa afọ n’ime okwu-amara niile nke si n’ọnụ Ya pụta. Okwu ya niile jupụtara n’amamihe, ma dịkwa larịị, nke ọbụna onye n’adịghị ike pụrụ ighọta. NUA 31.2
Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya nọkwa n’ọlu. Ha mere ka anya ndị Juu kpue isi ma meekwa ka echiche ha gbaa itiri. Ekwensu kpaliri onye-isi ha na ndị-ọchịchị ka ha were ndụ ya. Ha zigara ndị-isi ozi idọkpụta Jisọs nye ha, ma ka ha n’abiaru nsọ ebe Ọ nọ, ha hụrụ ihe iju-anya nke ukuu. Ha hụrụ Jisọs ka o jupụtara n’obi ahụzi na ebere mgbe Ọ n’ele ọnọdụ ọjọọ nke madụ. Ha hụrụ ya nime ihụn’anya na obi dị nro ka Ọ n’ekwu okwu agbam-ume nye ndị n’adịghị ike na ndị e tiri ihe-otiti. Ha nụkwara ya, ka o ji olu-ike, n’abara ike nke Ekwensu mba, n’akpọkwa ndị a dọtara n’agha, ka ha nwere onwe ha. Ha gere-ntị n’okwu amamihe ndịa si n’ọnụ ya pụta. Ha apụghịkwa imetụ ya aka. Ha wee gbara-aka laghachikuru ndị nchụ-àjà na ndị okenye n’akpụtaghị Jisọs. A jụrụ ndị ozi ahụ ajụjụ, gịnị mere unu akpụtaghị ya? Ha wee gba-àmà ihe ha hụrụ banyere ihe iribama Ya dị iche-iche, na okwu-nso nke ezi ako-nuche, ihụnanya na amamihe nke ha nụworo, ma kwupụtakwa n’ikpeazụ si, na ọdịghị mgbe ọbụla madụ kwuworo okwu dịka nwoke a. Ndị-ìsì nchụ-àjà bọkwara ha ebububo na e duhiewọkwa ha. Ụfọdụ n’ime ha mekwara ihere na ha lọtara na akpụtaghị Ya. Ndị-ìsì nchụ-àjà jụkwara ajụjụ nkwam’emo ma ọdị ndị-isi kwenyere na Ya. A hụrụ m na ọtụtụ ndị ọkikpe na ndị okenye kwenyekwara na Jisọs. Kama Ekwensu gbochiri ha ikwupụta nka. Ha n’atụ egwu ịta-ụta nke madụ karị ka ha n-atụ egwu Chineke. NUA 32.1
Ka ọdị ugbua, aghụghọ na ikpọ-asi nke Ekwensu ak’emebighị atụmatụ nke nzọpụta ahụ. Oge nmezu nke ihe Jisọs bụ n’obi bia n’elu ụwà n’abiaru nso. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya wee nwee nzukọ, ma kpebie ikpali obodo nke aka Kraist ka ha tisie nkpu ike ighọ ya ọbara, ma chọta ihe ọjọọ na nkwam-emo a g’ebogịde Ya. O nwere olileanya na Jisọs g’enwe obi-ọjọọ megide nmeso dị otua, ma rapụ inọgịde na nweda onwe ya àlà na ịdị umeàlà n’obi. NUA 33.1
Ka Ekwensu n’ahazi atụmatụ ya ndịa, Jisọs nwere nlekụrụ-anya n’ikpuhere ndị n’eso ụzọ Ya bụ nhụju-anya nke n’ọghaghị igabiga. Na a g’akpọgịde ya n’obe, kama na ya g’ebilikwa ọzọ n’ụbọchị nke atọ. Kama nghọta ha dị ka nke ntị-ike. Ha aghotaghị nke ọma ihe Ọ gwara ha. NUA 33.2