Go to full page →

Isi Nke 14—Mgbanwe Nke Sọl NUA 89

Ka Sọl n’eje Damaskọs n’ejidekwa akwụkwọ nyere ya ikike ijide ndị nwoke m’ọbụ ndị nwanyị n’ekwujsa Jisọs, ma dọkpụta ha Jerusalem, ndị mụọ-ọjọọ ji ọñụ-nmeri n’agba ya gburu-gburu. Ma ka ọ n’eje, n’otu ntabi-anya ihè sitere n’eluigwe nwụe gburu-gburu ya, nke mere ka ndị mụọ-ọjọọ ndịa gbafusia, ma meekwa ka Sol daa-nàlà ngwa-ngwa. Ọ nụrụ olu nke n’asi, Sọl, Sọl, gịnị mere i ji wee n’akpagbu m? Sol jụrụ sị, I bụ onye, Onye nwem? Ma Onyenwe-anyị sịrị, Mụ onwe m bụ Jisọs onye gị onwe gị n’akpagbu. Ọ bụkwa ihe sịrị ike ka ikpọ ụkwụ gị na nkume. Mgbe ahụ Sọl mara jiji ma sitekwa n’oke ụjọ wee sị, Onyenwe m, ọbụ gịnị ka I chọrọ ka m mee? Onyenwe-anyị sịrị ya, bilie ma jee n’ime obodo, a gagwakwa gị ihe n’ịghaghị ime. NUA 89.1

Ndị-ikom n’eso ya nọkwa n’ekwughị okwu ọbụla. Naanị na ha n’anụ olu, ma ha a hụghị onye ọbụla. Mgbe ihe ahụ gabigara, na Sol bilitere ọtọ, wee meghee anya ya abụa, kama ọ hụghịkwa madụ ọbụla. Ebube sitere na ihè nke eluigwe e mewo ka o kpue-isi. Ha wee jide ya n’aka, duru ya rue Damaskọs, ebe ọ nọrọ abali-ato n’ahụghị ụzọ, n’erighịkwa ihe oriri m’ọbụ ihe-ọñụñụ. Onyenwe-anyị wee ziga mụọ-ozi ya nye otu n’ime ndị ahụ Sọl bu n‘obi ịdọkpụrụ, wee kpanyere ya ụka na ọhụụ ka o jee n’otu ụzọ-àmà a n’akpọ Streti, ma jụa ajụjụ n’ime ụlọ nke Judas banyere otu-onye a n’akpọ Sọl nke Tasiọs, n’ihi na lee, ọ n’ekpekwa ekpere, na o hụwọkwa na ọhụụ otu nwoke áhà ya bụ Ananias ka ọ n’abata, nke n’atụkwasikwa ya aka, ka o wee hụ ụzọ. NUA 90.1

Ananais tụrụ egwu na eleghị anya na okwua ezighị ezi, o wee malite ikwusara Onyenwe-anyị ihe ọ nụworo banyere Sọl. Ma Onyenwe-anyị gwara Ananais, jee n’ụzọ gị; n’ihi na ọ bụ ụgbọ nke a rọpụtara nye m, iburu áhà m rue ndị Jentail, na ndị-eze, na ụmụ IZrel kwa. N’ihi na a ga m egosi ya ọtụtụ ahụhụ nke n’ọghaghị ihụ n’ihi áhà m. Ananais wee soro ntuzi aka niile nke Onyenwe-anyị, wee banye n’ụlọ ahụ, n’atukwasikwa ya aka n’isi ya, wee si, Nwannem-nwoke Sọl, Onyenwe-anyị, ọbụna Jisọs, onye zutere gị n’ụzọ ka I n’abia, e zitewo m, ka iwe hụ ụzọ, bụrụkwa onye e mejupụtara na Mụo-nsọ. NUA 90.2

N’otu-oge ahụ Sọl hụrụ ụzọ, ma biliekwa, e wee meekwa ya baptizim. O wee kwusaa Kraist n’ime ụlọ ikwu niile, na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ndị niile nụrụ ya tụrụ egwu nke ukuu; na- ajụkwa sị, Nka ọ bụghị onye ahụ nke n’ebibi ndị niile n’ekwusa áhà ahụ na Jerusalem? Ma biakwa ebe a n’out-uche ahụ, bụ ijide ha kpugara ha ndị-isi nchụ-àjà . Ma Sọl bara ụba na ike werekwa anya-ike, n’agwa ndị Juu okwu. Ndị a banyere na nsogbu ọzọ. Sọl kọpụtara ije ya niile site n’ike nke Mụo-nsọ. O were onye ọbụla anya banyere ọnọdụ Sọl megide Jisọs, na ọnụ ọkụ nke obi ya ichọpụta na, inyefe ha n’aka ọnwụ bụ ndị niile kwere na áhà ya. Ọlụ-ebube nke mgbanwe ya mere ka o wee ọtụtụ madụ anya na Jisọs bụ Ọkpara nke Chineke. Sọl kọwapụtara ije ya, na dịka ọ naara akpagbu ndị madụ rue ọnwụ, na etinyekwa n’ụlọ nkpọrọ, ndị nwoke na ndị nwanyị ka ọ n’eje Damaskọs, n’otu ntabi anya ihè dị oke-egwu nke sitere n’eluigwe nwuru gburu-gburu ya, nke Jisọs gosikwara ya onwe ya, ma zikwa ya ihe na ya bụ Ọkpara Chineke ahụ. Ka Sọl ji olu-ike na ekwusa Jisọs, ọ bụkwa nhụku sịrị ike n’onwe ya. O nwere ezi amamihe nke akwụkwọ-nsọ, ma mgbe o chegharisịrị ihe nke Chineke wapụtara n’okwu amụma niile banyere Jisọs, nke nyere ya ike ikwupụta ezi-okwu ahụ n’ụzọ were anya, na idozi okwu Chineke arọgharịrị n’ụzọ ọbụla. Site na nnọyere nke Mụo-nsọ, ọ g’eji ụzọ were anya na ike kpọrọ akọ n’uche ndị n’ege ya ntị site kwa n’olu nke amụma niile biarue n’oge ọbịbịa nke mbụ nke Kraist, wee gosikwa ha n’akwụkwọ-nsọ e mezuwori, nke metutara nhụju-anya nke Kraist, ọnwụ na nbilite n’ọnwụ ya. NUA 91.1