Ekwensu jiri ọhụhụ gbaba n’etiti, n’achọ ikpasu igwe madụ ahụ ka ha malite ọgụ. Kama ọkụ nke sitere n’ebe Chineke nọ n’eluigwe ka e zosara n’isi ha, na madụ ndị uku niile, na ndị á maara áhà ha niile, na ndị dimkpa niile ahụ, ma ndị ogbenye na ndị ụwà-ọjọọ niile, ha niile ka e repịara n’otu. A hụrụ m na ụfọdụ lara n’iyi ngwa-ngwa, mgbe ndị ọzọ tara ahụhụ ogologo mgbe karị. A tara ha ahụhụ dịka omume niile nke anụ-arụ ha. Ụfọdụ n’ere ọtụtụ ụbọchị, ma dịka ogologo oge nke akụkụ-arụ ha ọbụla regịdere ọkụ, ka ha nọgịdekwara mata na ha n’ata ahụhụ. Mụọ-ozi ahụ sịrị, ikpuru nke ndụ agaghị anwụ; ọkụ ha agaghịkwa anyụ-anyụ ụbọchị niile nke ihe ọ g’eri fọdụrụ. NUA 232.1
Ma Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya tara ahụhụ ogologo oge. Ekwensu abụghị naanị na O buru ibu-arọ na ahụhụ nmehie nke ya onwe ya, kama nmehie niile nke ndị niile a gbapụtara ka e bọkwasịrị ya; ma ọ haghị ịtakwa ahụhụ nke mbibi nke mkpụrụ-obi niile ndị ahụ ọ kpatara. Mgbe ahụ a hụrụ m na Ekwensu, na igwe ndị ajụọ-omume niile, ka e mezuru; na igwe ndị mụọ-ozi niile, na ndị-nsọ a gbapụtara, sitere n’oke-olu tie-mkpu si, Amen! NUA 233.1
Mụọ-ozi ahụ sịrị, Ekwensu bụ nkpọrọgwu, ụmụ ya bụkwa àláka ya. E ripịawọkwa ha, mkpọrọgwụ na àláka ya. Ha anwụwọkwa ọnwụ ebighị-ebi. Ọ dịghị mgbe ha g’ebilikwa ọzọ, ma Chineke g’enwekwa ụwà dị ọcha. M wee welie anya ma hụ ọkụ ahụ nke repiaworo ndị nmehie ka ọ n’erepia ọrụrụ niile, ma n’emekwa ka ụwà dị ọcha. Ọzọ, e weliri m anya wee hụ ụwà ka e mere ka ọdị ọcha. O dịghịkwa otu ihe ọbụla n’egosi ọbụbụ-ọnụ ahụ. Mbibi niile, na mbakoro niile nke elu-àlà, yiri ugbua dịka ebe dị larịị, sakwara mbara. ụwà niile nke Chineke dị-ọcha, ma ndọndọ-ukuu ahụ agwụsiwo ebighị-ebi. Ebe ọbụla anyị lere anya, ihe ọbụla nke anya tụkwasịrị na ya, mara mma dịkwa nsọ. Ma igwe ndị niile a gbapụtara, okenye na ntorọbia, onye uku na onye nta, wụsara okpu-eze ha n’enwụ-enwụ n’ụkwụ-àlà Onye mgbapụta ha, ma rudatakwa onwe ha n’ọjịja-mma n’iru Ya, ma fekwa Ya ofufe, bụ onye ahụ nke n’adị ndụ mgbe niile ebighị-ebi. ụwà ọhụụ ahụ magburu onwe ya, n’ebube ya niile, bụ ihe nketa ebighị-ebi nke ndị-nsọ. Àlà-eze ahụ, na ọchịchị, na ịdị-ukuu nke àlà-eze n’okpuru eluigwe niile, ka e nyekwara ndị-nsọ nke onye kachasị ihe niile elu, ndị g’enwekwa ya ebighị-ebi, ọbụna rue mgbe niile ebighị-ebi. NUA 233.2