Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 3 —Isi Nke Atọ Nrafu Di Njọ

    Ndọndọ ukuu ahụ nke dị n’etiti Kraịst na Setan na-abịaru ọgwụgwụ osọsọ, ma ajọ onye ahu na-eme ka mgbalị ya dị okpukpu abụọ imeri olụ Kraịst n’ihi mmadụ. Ijidesi ndị mmadụ ike n’ime ọchịchịrị na na-enweghị mwute rue mgbe ọlụ ogbugbo nke Onye Nzọpụta anyị gwụsịrị bụ ihe Setan na-achọ ịluzu. Ọ naghị emetụ ya mgbe omume nke ejighị ihe kpọrọ ihe na-aga n’iru n’ime nzukọ. Ma mgbe ọ bụla ọtụtụ mkpụrụ obi na-ajụ sị, “Gịnị ka m ga-eme ka e we zọpụta m?”, ọ na-agbagidesi ụkwụ n’ala ike iji we megide Kraịst na ime ka nhuku nke Mọ Nsọ ghara ịdị ire.OdU 19.1

    N’oge otu emume, mgbe ndị mmụo ozi bịara igosi onwe ha n’iru Jehova, Setan bịakwara n’etiti ha, ọ bụghị ịkpọ isi ala nye Eze Ebighị-ebi ahu, kama ọ bịara iwere ajọ olụ ya imegide ndị eziomume gaa n’iru. Lee Job 1:6. Ọ na-anọ mgbe ndị mmadụ zukotara ịkpọ isi ala, na-alụsi ọlụ ike ịchị isi n’uche ndị bịara ịkpọ isi ala. Ka ọ na-ahụ ka onye ozi nke Chineke na-enyocha Akwụkwọ Nsọ, ọ na-arịba isi ihe a ga-ekwu ama. Mgbe ahụ, ọ naetinye aghụghọ na amamihe ya n’ọlụ ime ka ozi ahụ ghara irute ndị ahụ ọ na-eduhie n’ihe ahụ a na-ekwu. Onye ahụ nke ịdọ akana-ntị ahụ kachasị mkpa ka a ga-adọpụ uche ya gaa n’ụfọdụ azụmahịa ma ọ bụ esite n’ụzọ ọzọ gbochie ya ịnụrụ okwu ahụ.OdU 19.2

    Setan na-ahụ ndị oru Jehova ka ibu na-anyị ha n’ihi ọchịchịrị ahụ nke kpuchiri ndị mmadụ. Ọ na-anụ ekpere ha ka amara na ike Chineke gbajie ike nnapụ-uche nke ejighị ihe kpọrọ ihe na ume ngwụ. Mgbe ahụ, ọ na-eji ọnụnụ ọkụ n’obi ọhụụ nwaa ndị mmadụ inye onwe ha n’agụụ ma ọ bụ ihe na-atọ anụ arụ ha ụtọ, nke ga-egbochi ike nile nke nghọta ha ka ha ghara ịnụrụ ihe ndị ahụ kachasị ha mkpa ịmụta.OdU 19.3

    Setan maara na ndị nile rapụrụ ekpere na Akwụkwọ Nsọ ga-abụ ndị emeriri site n’obubu agha ha. Ya mere, ọ na-ewepụta ngwa agha ọ bula o nwere iji wepụ eehiche ndị mmadụ. O nwekwara ndị dị ike mgbe ọ bụla I nyere ya aka na-alụsi ọlụ ike mgbe Chineke nọ n’ọlụ. Ha ga-egosi ndị oru Kraịst bụ ndị kachasị ịnụ ọkụ n’obi na ịjụ onwe onye dịka ndị eduhiere ma ọ bụ ndị nduhie. Ọ bụ ọlụ ha igosi ebumnuche na ọlụ ọma nile n’ọnọdụ ọjọọ, ikesa ebubo, na ịkpali ile anya n’obi abụọ n’uche ndị naenweghị ihe ọmụma. Ma na ngwa ngwa ka a pụrụ ịhụ onye ha bụ ụmụ ya, onye ha na-eñomi, na onye ha na-alụ ọlụ ya. “Unu ga esite na mkpụrụ ha mazuo ha” Matiu 7:16; Leekwa Nkpughe 12:10.OdU 20.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents