Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Eziokwu Ahụ Na-Edo Nsọ

    Onye nduhie uku ahụ nwere ọtụtụ ozizi ụgha ọ kwadebere nye ọchịchọ dị iche iche nke ndị ọ ga-ewetara mbibi. Ọ bụ nzube ya iwebata ndị na-enweghị eziokwu, ndị a na-amụgharịghị n’ime mmụọ n’ime nzukọ ka ha weta agbamume nye obi abụọ na ekweghị ekwe. Ọtụtụ ndị na-enweghị ezi okwukwe na Chineke na-ekwenye n’ụfọdụ ụkpụrụ nke eziokwu ka a hụ ha dịka ndị yiri Kraịst; nke a na-enyere ha aka iwebata ozizi ụgha dịka ozizi nke ime mmụọ. Setan maara na eziokwu a nabatara n’ịhụnanya na-edo mkpụrụ obi nsọ. Ya mere, ọ na-achọ iwere ozizi ụgha, akụkọ ifo na ozi ọzọ dochie. Site na mmalite, ndị oru Chineke agbawo mgba megide ndị ozizi ụgha, ọ bụghị nanị dịka ndị ajọ mmadụ, kama dịka ndị na-akuzi ụgha dị iche iche na-ebute mbibi nye mkpụrụ obi. Elaịja, Jeremaịa, Pọl, guzogidesiri ike megide ndị naara atụgharị ndị mmadụ site n’okwu Chineke. Mgbasa aka ahụ nke gụrụ okwukwe ekweere n’ime eziokwu ka ihe na-adịghị mkpa, enwetaghị iru ọma nke ndị nsọ ndị a gbara mgba ichedo eziokwu.OdU 20.2

    Nkọwasị na-edoghị anya nke Akwụkwọ Nsọ, ndị sitere na mwagharị nke echiche mmadụ pụta, na ozizi ndị na-emegide onwe ha n’etiti ndị na-eso Kraịst bụcha ọlụ nke onye mmegide ukuu anyị ka aghagbuo asụsụ nke ọtụtụ uche. Adịghị n’otu na nkewa n’etiti nzukọ dị iche iche sitere, nke ka nke, na nñagharị nke Akwụkwọ Nsọ ka a kwado ozizi ebuuru ụzọ nara nke ọma.OdU 21.1

    N’ihi ịkwado ozizi ụgha, ụfọdụ na-anwude ụfọdụ ihe e dere na Akwụkwọ Nsọ ma kewapụ ha n’ọnọdụ ha, na-ekwugharị nkera ama okwu iji mesie isi okwu ha ike, mgbe nke fọdụrụ na ama okwu ahụ na-ekwu ihe megidere ihe e ji ya e mesi ike.OdU 21.2

    Ha na-ewere aghụghọ nke agwọ dabere n’okwu ndị naadabaghị n’otu ihe, bụ okwu ndị añagharịrị ka ha kwado agụụ dị iche iche nke anụ arụ. Ndị ọzọ na-ejide akara ọnụ ọgụgụ na ihe ndị ọzọ nọchiri anya ihe, we kọwa ha dịka mwagharị nke echiche ha si dị, na-ejighị ama nke Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe dịka ihe naakọwa onwe ya; mgbe ahụ, ha we na-egosi echiche ha nke naabaghị n’ihe dịka ozizi nke Akwụkwọ Nsọ.OdU 21.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents