Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Akwụkwọ Nsọ N’Ozuzu Dịka Ihe Nduzi

    Mgbe ọ bụla a na-esiteghị na mmọ nke ekpere na nke ewedara n’ala banye n’ọmụmụ nke Akwụkwọ Nsọ, a ga-adọkapụ ama okwu ndị karịsịrị mfe ịghọta, pụa n’ezi nghọta ya. E kwesiri iwere Akwụkwọ Nsọ n’ozuzu nye ndị mmadụ dịka ihe ọ na-ekwu si dị.OdU 21.4

    Chineke nyere okwu amụma ahụ nke guzosiri ike; ndị mmụọ ozi, ọ bụna Kraịst n’onwe Ya bịara mee ka Danịel na Jọn mata ihe ndị “na-aghaghị ịpụta n’isi nso” (Nkpughe 1:1). E gosighị okwu ndị dị mkpa banyere nzọpụta anyị n’ụzọ imenye ụjọ na iduhie onye ahụ na-achọ eziokwu n’ezie. Okwu Chineke pụtara ihe nye ndị nile ji obi ekpere na-amụ ya.OdU 21.5

    Site n’iti mkpu nke ozizi nke mgbasa aka (nke bụ ịnabata okwu ọ bụla, na-ajụghị ma ha na Akwụkwọ Nsọ o nwere otu olu), a na-eme ka ndị mmadụ kpuo isi nye ihe nzupụta dị iche iche nke onye ahụ na-emegide ha. Ọ na-aga n’iru iwere echiche mmadụ dota n’ọnọdụ Akwụkwọ Nsọ; iwu Chineke abụrụ ihe ewepụrụ n’ọnọdụ ya, ndị nzụkọ dị iche iche anọrọzie n’agbụ nke mmehie mgbe ha na-akụrụ na ha nweere onwe ha.OdU 22.1

    Chineke emewo ka oke ihe zokwasị ụwa site na nchọpụta dị iche iche nke sayensị. Ma ọ bụna echiche ndị kachasị omimi, ga-abụ ihe ike gwụchasịrị na mgbalị ha inyochasị mnwekọ nke sayensị ma ọ bụrụ na-eduzighị ha site n’okwu Chineke.OdU 22.2

    Ihe ọmụma nke mmadụ dị na mkpirikpi ma bụrụkwa ihe na-ezughị oke, ya mere ọtụtụ apụghị ime ka nghọta ha banyere sayensi na Akwụkwọ Nsọ nwee otu olu. Ọtụtụ na-anabata ihe bụ nanị ozizi a na-anwapụtabeghị ma were ha dịka eziokwu nke sayensị; wee na-eche na a ga-eji “ihe na-abụghị sayensị a, a kpọrọ sayensị” nwalee okwu Chineke. (1 Timoti 6:20). N’ihi na ha apụghị isite n’iwu nke okike kọwaa Onye Okike na Ọlụ Ya, e weere akụkọ nke ihe mere eme dị na Akwụkwọ Nsọ dịka ihe a naagaghị adabere na ya. Ndị na-enwe obi abụọ n’ebe Agba Ochie na Agba Ọhụụ dị, na-aga otu nzọ ụkwụ ọzọ, ọtụtụ mgbe, inwekwa obi abụọ banyere na Chineke dị. Ebe ha wepụworo arịlịka nke ụgbọ nke okwukwe ha, ha na-awagharị n’elu nkume dị iche iche nke ekweghị ekwe.OdU 22.3

    Ọ bụ ọkaibe n’ọlụ nduhie Setan nile idebe ndị mmadụ ịnọ na-akọ nkọ banyere ihe ahụ Chineke na-emeghị ka a mara. Lusifa enweghịrị ojuju afọ n’ihi na-emeghị ka ọ banye n’izu nzuzo ịmata nzube nzuzo nke Chineke; ọ hapụkwara iji nke ekpughere kpọrọ ihe. Ugbu a, ọ na-achọ iwere otu mmụọ ahu yikwasị ụmụ mmadụ ma meekwa ka ha ghara iwere iwu Chineke pụtara ihe kpọrọ ihe.OdU 22.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents