Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ozizi Ọjọọ Nke Na-Eweta Ihe Ize Ndụ

    Otu ihe kachasị iga n’ihu n’etiti ndị ozi nke onye nduhie uku ahụ bụ ọlụ ebube ụgha dị iche iche nke ndị mmụọ ọjọọ. Ka ndị mmadụ na-ajụ eziokwu, ha na-adaba n’aka nduhie dịka anụ oriri.OdU 23.2

    Ozizi ọjọọ ọzọ bụ ozizi nke na-agọnarị ịbụ chi nke Kraịst, na-ekwu na Ọ dịghịrị adị tupu Ya abịa n’ụwa. Ozizi a na-emegide okwu ndị Onye Nzọpụta kwuru banyere mmekọrịta dị n’etiti Ya na Nna Ya na ụdịdị Ya tupu Ya abịa n’ụwa. Ọ na-akụda okwukwe site n’Akwụkwọ Nsọ banyere ịbụ chi nke Kraịst, Ọ dịghị onye ọ bụla ji ozizi ọjọọ a pụrụ inwe ezi nghọta nke Kraịst ma ọ bụ ụkpụrụ nke Chineke maka mgbapụta nke mmadụ.OdU 23.3

    Ozizi ọjọọ ọzọkwa bụ nkwenye na Setan enweghị ọdịdị dịka onye dị adị, na e weere aha ahụ mee ihe na Akwụkwọ Nsọ naanị igosipụta echiche ọjọọ na agụụ ọjọọ dị ịche iche nke mmadụ.OdU 23.4

    Ozizi ahụ na-ekwu na ọbịbịa abụọ nke Kraịst bụ ọbịbịa Ya nye mmadụ ọ bụla n’ọnwụ, bụ ngwa ọlụ iji wepụ uche ndị mmadụ site n’ọbịbịa Ya n’igwẹ ojii nke eluịgwe. Ya mere, Setan nọ naekwu, “Lee, Ọ nọ n’ụlọ” (Lee Matiu 24:23-26), ma ọtụtụ mmadụ efuola site n’ịnabata nduhie a.OdU 24.1

    Ọzọ, ndị na-amụ sayensị na-ekwu na ọzịza ọ bula n’ezie adịghị nye ekpere; nke a ga-abụ mmebi nke iwu-ihe ịrịba ama, na ihe ịrịba ama dị iche iche adịghị. Ha na-ekwu na ọ bụ iwu dị iche iche ndị nọgidesiri ike na-achị ụwa nile, na Chineke n’onwe Ya adịghị eme ihe ọ bụla megidere iwu ndị a. N’ụzọ nke a, ha naegosi Chineke dịka Onye nọ n’okpuru iwu nke Ya Onwe Ya dịka iwu Chineke, ọ na-egbochi m’nwere onwe nke Chineke.OdU 24.2

    Kraịst na ndị ozi Ya, ọ bụ ha emeghị ọtụtụ ihe ịrịba ama? Otu Onye Nzọpụta ahụ nwere ọchịchọ ịña ntị nye ekpere nke okwukwe ‘dịka na mgbe a hụrụ Ya mgbe O jegharịrị n’etiti ndị mmadụ. Ọdịdị nke anụ arụ na nke ime mmụọ na-alụkọ ọlụ. Ọ bụ otu ụzọ nke ụkpụrụ Chineke inye anyị n’ọzịza ekpere nke okwukwe, ihe ahụ Ọ na-agaghịrị enye anyị mgbe anyị na-arịọghị.OdU 24.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents