Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Okwu Mmalite

    Mgbe ihe egwu na ọtụtụ ihe ike na-ebili na mberede ibibi ezi na ụlọ anyị; mgbe ebumnobi anyị maka ọganiru anyị bụ ihe agbariri agbari, mgbe nrịrịa na ọnwụ na-esogharị ndị anyị hụrụ na anya, ọ dị nanị otu ihe nke ga-ebuli anya na ob-i anyị elu we tụọrọ anyị aka maka ọdịnihu kasị mma - ihe ahụ bụ OLILEANYA. Olileanya maka echi ọma, ọdịnihu na-egbuke egbuke na ụbọchị ịñụrị ọñụ ga-abịakwa ọzọ. Olileanya a na-agwa anyị na ndụ a karịrị ihe anyị na-ahụ ma na-agabigakwa n’oge ndị a.OdU ii.1

    Ihe niile akwụkwọ a na-ekwti maka ya bụ olileanya - sitekwa na ntọala ụwa, rue ọbụnadị n’oge ndị a. Ọ na-akọwa gbasara ịhụnanya nke Chineke, Chineke nke na-echekwa ma naazọpụta mmadụ O kere eke tupurịị mmadụ agagharịwa n’elu ụwa. Mgbe nhuju anya na ọnwụ batara n’ime ụwa, Chineke agbachighị nkịtị na-ele mbibi dị otu a nanị anya. O kpughere ụkpụrụ Ya maka nzọpụta nke mmadụ. Ụkpụrụ a ka nọkwa na ọrụ ruo taa.OdU ii.2

    Akụkọ niile akọrọ site n’ọgbọ ndị gara aga ruokwa n’ọgbọ nke anyị a jupụtara na akụkọ gbasara ụfọdụ mmadụ ndị na-ekwu na ọ dị ha n’aka ịkọwa ma me ka ozizi nke akwọkwọ nsọ bụrụ ihe ga-edo mmadụ dum anya. Mmadụ ndị a, ndị weliri onwe ha elu ịza ndị nnọchite anya nke Chineke na ndị Chineke nyere ikike pụrụ iche atụtụrụla ihe niile gbasara olileanya na udo nke ụmụ mmadụ bibie ha. Ụwa we bụrụ ihe nọ na ọchịchịrị site na aghọtaghị n’ezie onye Chineke bụ, ya na ịma kpọmkwem ma o nwedịrị ihe dịka Chineke ma ọlị.OdU ii.3

    Kama, n’agbanyeghị ihe ndị a niile, ịhụnanya Chineke n’ebe mmadụ nọ ka nọgidesiri ike. Ọ bụ ezie na ebola Chineke ebubo ụgha dị iche iche site n’ọnụ ndị a sị na ha na-anọchita anya Ya, kama akwụkwọ nsọ ka jupụtara na eziokwu niile gbasara Chineke; ndị niile ji ezi obi na-agụ akwụkwọ nsọ ga-achọpụta eziokwu ndị a.OdU ii.4

    Ị na-achọ eziokwu? Ị na-achọ udo? Ị na-achọ olileanya? Mba ụwa dị iche iche na-akụ udu agha ha. Ọba ego nke ụwa bụ ihe na-agharịpụkwa ha n’ụzọ a na-amaghị otu e si eme ya. Ala. ọma jijiji, oke ebili mmiri nke na-eme ka mmiri gafee ọgba ya ma bibisiekwa ndụ na akụ ndị mmadụ, tinyekwara anyanwụ nke ịdị ọkụ ya dịzi uku karịa na mbụ mere ka elu ụwa niile nọrọ n’oke egwu. Amamihe niile nke mmadụ kụrụ afọ n’ala n’ihe gbasara iweta olileanya ma ọ bụ obi iru ala.OdU iii.1

    Kama, OLILEANYA dị! Legharịa anya na nzọ ụkwụ Chineke site na ntọala nke mmadụ ma were anya gị lee ihe Chineke kwadoro maka nzọpụta anyị. Chọpụta imerime eziokwu ndị ga-anapụta gị n’ụgha niile nke Ekwensu, tụgharịa ndụ gị taa, ma gosi gị nkwa nke ndụ ebighị ebi.OdU iii.2

    Na ngwụcha, lepụ anya ka ịhụ amụma, dị iche iche jupụtara n’ime akwụkwọ nsọ e dere gbasara ihe ndị na-eme n’oge ndị a mgbe ọ na-abatabeghị n’echiche mmadu na ọ pụrụ ime eme. Ka ụwa na-eme ngwa ngwa ịla n’iyi, Chineke jigidesiri aka anyị ike. Ọdịnihu anyị kwụ chịm chịm, nani ma anyị hapụ aka anyị n’ime ọba aka Ya..OdU iii.3

    N’agbanyeghị ihe na-eme n’ime ndụ gị ugbu a, ma ọ bụ n’ime ụwa ị nọ n’ime ya, anyj nwere Oke Olileanya maka echi. Meghee obi gị jnabata Olileanya a dị ukuu thineke na-enye gị n’efu taa.OdU iii.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents