Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ọgwụgwụ Nke Ntaramahụhụ

    Ndị ahụ nile a gụtara dịka “ndị kwesịrị ekwesi” nye mbilite n’ọnwụ nke ndụ bụ ndị “ngọzi nādịrị ma dịkwa nsọ” “Nebe ndị dị otua, ọnwụ nke abụa ahụ enweghịkwa ike ọbụla.” Luk 20:35; Nkpughe 20:6. Kama ndị nile nēnwetaghị ngbaghara site na nchegarị na okwukwe a ghaghị ịnata “ụgwọlụ nke nmehie,” nke bụ ntaramahụhụ “dịka ọlụ ha nile si dị,” nke ụsọtụ ya bụ “n’ọnwụ nke abụa ahụ.”OdU 36.2

    Ebe ọ bụ ihe n’enweghị omume ka Chineke zọpụta onye nmehie nime nmehie ya nile, ọ nānapụkwa ya ndụ ahụ nke nmebi iwu ya dum tufuworo ọbụna nke o gosipụtara onwe ya dịka onye n’ekwesịghịkwa ịnọ ndụ ga n’iru. “Ma ọfọdụrụ nwa mgbe nta, na onye nēmebi-iwu agaghị adịkwa; I gēlekwasịkwa ọnọdụ ya anya ma ọ gaghị anọkwa.” “Ha gādịkwa ka asị na ọdịghị mgbe ha dịworo-adị.” Abọma 37:10; Obidai 16. Ha gēmikpu nime ọnọdụ n’enweghị olileanya ma-ọbụ neheta ọbụla ebighi-ebi nile.OdU 36.3

    Otua ka a gēme ka nmehie gwụsia. “Gị onwe gị ebibiwo ndị ajọ-omume, I hichapuwokwa aha ha rue mgbe ebighi-ebi. Ndị-iro agwụsịwo, ha alawokwa niyi rue mgbe ebighi-ebi.” Abụọma 9:5, 6. Jọn, na Mkpuhe, nānụ ụda abụ òtutò nke zuru ụwa nile nke n’adịghịkwa ụda ihe ọbụla ọzọ meluru ya. Ọdịghịkwa mgbe mkpụrụ obi ndịa furu-efu nēkwulu Chineke ka ha nọ nāsụ udè nime ntaramahụhụ n’adịghị agwụ-agwụ. Ọdịghị ndị nhuju-anya nke ọkụ ala-mụọ nēji isụ udè na ntamu ha gwakọ n’abụ òtutò nke ndị a zọpụtara.OdU 37.1

    Nelu okwu ụgha nke ọdịdị anwụghi-anwụ ka ọ nādabere bụ ozizi nke sị na mkpụrụ obi nādị ndụ ọbụna mgbe madụ nwụsiri anwụ. Dịka nke ntaramahụhụ ebighi-ebi, nkaa kwa megidere akwụkwọ-nsọ, megidekwa ezi echiche, megidekwa ọbụna mmetụta ọdịdị madụ e kere eke.OdU 37.2

    Dịka ọtụtụ madụ kwere, ndị a gbapụtara nọ n’elu-igwe nāmarakwa ihe nile nēme n’elu ụwa. Ma n’ụzọ dị aña ka ọ pụrụ iji bụrụ ihe obi-ụtọ nye ndị nwụrụ-anwụ ịmara nsogbu nile nke ndị dị ndụ, ịhụ ka ha nānagide iri-uju nile, na mkpọchụ iru nile, na ihe mgbu nile nke ndụ? Ọzọ, ọ gābụkwa mgba-okpuru nke okwkwe ikwenye na ọ bụ mgbe ahụ a nēkubi ume ka mkpụrụ-obi onye rike n’eehegharịghị nābanyekwa n’ọkụ ala-mụọ nēre-ere.OdU 37.3

    Gịnị ka akwụkwọ nsọ nēkwu? Madụ e nweghị uche ọbụla n’ọnwụ: “Mụọ ya nāpụ àpụ, wee laghachikwa n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ ka echiche ya nile nālakwa niyi.” “Ndị dị ndụ matara na ha gānwụ: kama ndị nwụrụ-anwụ adịghị ama ihe ọbụla........Ịhụnanya ha, na ịkpọ-asị ha, na ekworo ha, alawokwa n’iyi ugbụa; ọ dịghịkwa oke ọzọ ha nwere rue mgbe ebighi-ebi nihe ọbụla nke a nēme n’okpụrụ anyanwụ”. “Ala-ili apụghị ito gị; ọnwụ apụghịkwa inye gị ekele. Ndị nile nādanye nime olulu ahụ apụghịkwa inwe olileanya nke ezi-okwu gi. Onye nādị ndụ, naanị onye nke nādị ndụ ọ bụ ya gēto gị dịka mụ onwem nēmekwa n’ụbọchị taa.” “N’ọnwụ ọ dịghị ncheta a nēcheta Gi: n’ala-ili onye gēnye Gi ekele? Abụ-ọma 146:4; Eklesiastis 9:5, 6; Azai 38:18, 19; Abụọma 6:5.OdU 37.4

    Pita n’ụbọchi Pentikọst kwupụtara na Devid “nwụrụ-anwụ na e likwara ya eli, ọbụna ili ya dịkwa n’etiti anyị rue ụbọchi taa.” “Nihi na Devid arigoghịkwa n’elu-igwe.” Ọlụndị-ozi 2:29, 34. Ebe ọ bụ na Devid n nānọgide n’ala-ili rue mbilite-n’ọnwụ, nkaa nēgosị na ndị ezi-omume a dịghị a ga elu-igwe n’ọnwụ ha.OdU 38.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents