Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Anwụghị-Anwụ Mgbe Jisọs Nālọghachi

    Izu-ike dị ngọzi nye ndị ezi-omume ike gwụrụ! Oge ma ọ dị ogologo ma ọ dị mkpirimkpi, ọ bụ naanị otu nkeji nye ha. Ha nārarụ-ụra; a nākpọtekwa ha site n’olu-opi ike nke Chineke nye anwụghị-anwụ dị ebube. “Nihi na a gāfụ opì, na a gēmekwa ka ndị nwụrụ-anwụ si n’ọnwụ bilie nāpụghị ire ure....... Otuakwa mgbe arụa nke pụrụ ire ure gēyikwasịworị ereghị-ure, ma arụa nke pụkwara ịnwụ-anwụ gēyikwasịwokwarị anwụghị-anwụ, mgbe ahụ ka okwua e deworo n’akwụkwọ-nsọ gēmezu sị, E lomiwo ọnwụ n’ime nmeri” Ndị lKọrịnt 15:52-54.OdU 39.4

    Ka a kpọlitere ha site n’ụra ha, ha nāmalitekwa iche uche ebe ha kwụsiworo. Nmetụta nke ikpeazụ n’akọ-nuche bụụrụ naanị ntagide na ihe-ọgbụgba nke ọnwụ. Echiche ikpeazụ ha bụworo na ha nādabara ikike nke ala-ili. Ma mgbe ha nēbilite site n’ala-ili a, echiche obi-ụtọ ha nke mbụ gābụ nke ụda ya gādị nime mkpu ọñụ nmeri ahụ. “Ọnwụ olee ebe ihe-ọgbụgba gi dị? Ili, olee ebe nmeri gị dịkwa? Ndị lKọrint 15:55.OdU 40.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents