Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ihe Nādọrọ Uche Onye Hụrụ Ihe Ụtọ N’anya

    Nye ndị nke nāchọ ihe nke aka ha, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya, ndị akpịrị, ofufe mụo-ọjọ nēji ihe dị mfe a ghọgbụ ha. Ọbụna n’ujụ nke ọdịdị ihe obụla, ha nāhụ ụdị ihe nāgụ ha agụ. Ekwensu nēleta ụdị nmehie nke onye ọbụla nādabakarị nime ya ma hụkwa na ohere a gaghị akọ onye ahụ imejụputa ọchịchọ ahụ. Ọ nānwa umụ-madụ site na ndụ nke e merughị ihe n’oke, wee mee ka ịdamba dị n’anụ-arụ, n’akọ-nuche, ọbụna n’ike nke ezi-agwa. Ọ nēbibikwa nnụkuru-nnụ madụ site na ihe ụtọ nke anụ-arụ, nākwarukwa ọdịdị nile nke madụ. Ma n’ịluzukwa ọlụ ya, ndị mụọ wee nēkwukwa sị na “inwe amamihe nēbụli madụ elu kari iwu nile”; na “ihe ọbụla nke dị-adị, bụ ihe ziri ezi; na “Chineke adịghị ama ikpe”; na ọbụna mehie nile dị......... ọcha.” Mgbe ndị madụ si otua kwenye na ọchịchọ bụ iwu dịkasịrị elu, na nnwere-onwe bụ ikike ọlụ, na madụ gāhaziri onwe ya ọnọdụ ya, onyekwa pụrụ inwe ihe iju-anya na iri-ngàrì nāsọgharị site n’aka fere n’aka? Imerimè madụ nādị ngwangwa ịnabata nmetụta nke-ihe-ụtọ nke anụ-arụ. Ekwensu nāchịkọta nnukurunnụ madụ nime ọgbà ya bụ ndị sị na ha nēso-ụzọ Kraist.OdU 43.4

    Kama Chineke enyeworị ìhè zuru-oke ịchọpụta ọnya ọbụla. Ntọ-ala nke ofufe mụo-ọjọ nọkwa n’agha ya na ihe e deworo n’akwụkwọ-nsọ. Akwụkwọ-nsọ nēkwupụta na ndị nwụrụ-anwụ adịghị-ama ihe ọbụla, na echiche niie ha alawokwa niyi; ha enweghikwa òkè n’ọñụ nile ma-ọbụ iri-ujụ nile nke ndị nọ n’ụwa.OdU 44.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents