Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Akwụkwọ Nsọ Ka Edowere Na Ọnọdụ Akụkọ Ifo

    Ndị-ozi nke Kraist, nke ndị mụọ-ugha pụtakwara n’oyiyi ha, ka e mere ka ha kwue ihe-ọzọ dị-iche megide nke ha deworo n’akwụkwọ mgbe ha nọọrọ n’ụwa. Ekwensu nēme ka ndị ụwa kwenye na akwụkwọ-nsọ bu akụkọ-ifo, na ọ bụ akwụkwọ nke dịworo ọgbọ ndị malitere ụwa, nke oge ya gafewororịị n’adịrịghịkwa oge ugbụa. Akwụkwọ nke gēkpe ya na ndị nēsoụzọ ya ikpe ka ọ nēdote n’okpuru, Onye-nzọpụta nke ụwa ka ọ nēme dịka madụ ọbụla ọzọ n’adịghi iche. Ma ndị kwenyere n’ihe-ngosi nke ikike nke ihe-mụọ nāgbalịkwa ime ka a sị na ọdịghị ihe ebụbe obụla dị na ndụ nke Onye-nzopụta anyị. Ihe iribama nile nke ha, ka ha nēkwu, dị ukuu karị ọlụ nile nke Kraist.OdU 45.2

    Ofufe mụọ-ọjọ nke oge ugbua nēyiri ụdị ofufe ndị nke Kraist. Kama ozizi ya nile enweghị ngọpụ ma-ọbụ nke ihe-nzuzo. N’ọdịdị ya nke ugbụa, ọ bụwo ihe aghọm karia, ọbụna dịkwa aghụghọ na nduhie ya nile. Ọ nēkwupụta mkpa ọ dị ugbua ịnara Kraist na akwụkwọ-nsọ. Kama akwụkwọ-nsọa ka a n’akọwasị n’ụzọ ọ nāmasị obi ndị n’ewugharịghị ọhụ. Ịhụnanya ka a tụkwasịrị uche dịka isi-ihe e jiri mara Chineke, kama e wedakwara ya n’ụzọ ihe nke anụ-arụ. Okwu nile nke Chineke kwuru megide nmehie, ọbụna ụkpụrụ nile nke iwu Ya dị nsọ, ka e mere ka elepụ anya. Akụkọ-ifo dị iche iche nēduru ụmụ-madụ ijụ ịnara akwụkwọ-nsọ dịka ntọ-ala nke okwukwe ha. Kraist ka a nāgọnarịkwa dịka mgbe mbụ, kama nduhiea ka a n’adịghị eleta.OdU 45.3

    Naanị ole na ole nwere ezi nghọta banyere ikike nke ndụhie dị n’ofufe mụo-ọjọ. Otụtụ madụ n’etinye aka na ya naanị imejụputa ọnụnụ-ọkụ nke obi imara ihe ọ bụ. Ha gējupụta n’ọbi mgbafu mgbe ha nēche ibanye n’aka ọchịchị nke ndị mụọ. Kama ha nāzonye ukwu n’ogige n’adịghị abanye-abanye nke onye ogbụara-ọbara ahụ gēgosikwa ike ya n’arụ ha n’ụzọ ha n’achọghị. Mgbe ọbụla e dubara ha itinye uche n’ihe bayere ya, ọ nējidekwa ha ndị oru ya. Ọdịghịkwa ihe ọzọ pụrụ ịnapụta mkpuru-obi ndịa ma-ọbụghị ike nke Chineke site n’ọziza ekpere sịrị ike.OdU 46.1

    Ndị nile leziri anya nọgide na nmehie nke ha matara nke ọma nākpọtara onwe ha ọnwụnwa Ekwensu. Ha nēwezuga onwe ha site n’ebe Chineke nọ na sitekwa n’ezi nlekụrụ-anya nke ndị mụọozi Ya, n’enweghịkwa nchekwa.OdU 46.2

    Mgbe ha gāsị unu, chọọnụ ndi mụọ nājụ-ase, na ndị mgba-nsi nātakwu ntakwu, ọbụ ndị madụ agaghị achọ Chineke ha? Ka ọbụ na ndị dị ndụ gējekuru ndị nwụrụ-anwụ? “Anyị dịrị iwu dịrikwa ihe àmà: ọ bụrụkwa na ha adịghị ekwu dịka okwua sị di, n’zie ọdịghị chi ọbụbọ dịrị ha” Azaia 8:19, 20.OdU 46.3

    Asị na ụmụ-madụ chọworo ịnara ezi-okwu banyere odịdị nke madụ na ọnọdụ ndị nwụrụ-anwụ, ha gāhụkwa nime ofufe mụo-ọjọ bụ ike nke Ekwensu na ọlụ-ebụbe ụgha ya nile. Kama ọtụtụ madụ nēmechi anya ha n’ebe ìhè nọ, ya mere Ekwensu nēfegharị ihe ọnyà ya nile gbụrugbụru ha. “Nihi na ha anaraghị ịhunanya nke eziokwu ahụ, ka e wee zọpụta ha,” nihi nkaa “Chineke nēzigakwara ha ịlụsi-ọlụ-ike nke njehie ka ha kwere ugha.” Ndị 2Tesalọnịka 2:10, 11.OdU 46.4

    Ndị nile nēmegide ofufe mụọ-ọjọ nēbuso Ekwensu na ndị mụọozi ya agha anya-ikc. Ekwensu adịghịkwa mgbe ọ gārapụ ebe ọ nēguzo ma ọ bụghị dịka ndị ozi nke elu-igwe na achụghachi ya azu. Ekwensu pụrụ ikwupụta okwu sitere n’akwụkwọ-nsọ ọbụna ugbua dịka o meworo n’oge ụbọchị nile nke Kraist, ma ọ gākowakwa ozizi ya n’ụzọ gbagọrọ agbagọ. Ndi nile gēgụzọsike n’ajọ oge nkaa aghaghị ịmatara onwe ha ọgbụgba-ama nke ihe edere n’akwụkwọ-nsọ.OdU 47.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents