Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 6—Isi Nke Isii Ezi Udo

    N’ebe ọbụla nke ẹ kwuworo okwu Chineke n’ikwcsi ntụkwasiobi, e nwetara ihe nlụpụta nke gosiri na o sitere n’aka Chineke. Ndị nmehie nwetakwara nmetụta nke kpaliri uche ha ịta-ụta nke nmehie n’ụzọ di omimi jidekwa ime-mụọ ha na obi ha. Ha nwetakwara nghọta banyere ezi-omume nke Chineke, ma tiekwa mkpu si “Onye gādọpụtam site n’arụ nke ọnwụ a? Ndị Rom 7:24. Ka e mere ka a mata ihe bụ ọnwụ nke obe ahụ, ha hụrụ na ọ dighi ihe ọbụla ọzọ karia naanị ezi-omume nke Kraist pụrụ imezi ọnọdụ nke mmebi iwu nile ha. Site n’ọbara nke Jesus ka ha nwere “ngbaghara nmehie nile nke e mehiere-rị n’oge gara-aga.” Ndị Rom 3:25OdU 49.1

    Mkpụrụ-obi ndia kwenyere ka e mekwara baptizm ma biliekwa ijeghari n’ime ndu ọhụ, site n’okwukwe e kwere n’Ọkpara nke Chineke isoro nzọ-ukwụ Ya nile, ime omume Ya, na idokwa onwe ha ọcha ọbụna dịka Ya onwe-ya di ọcha. Ihe nile ha kpọworo asi na mbụ ka ha hụkwara n’anya ugbua, ma ihe nile ha hụkwara n’anya na mbụ ka ha kpọrọ asị. Ndi mpako wee bụrụ ndị dị umeala, ndị hụrụ onwe ha dịka ọdịghị onye ọzọ wee bụrụ ndi wedára onwe ha. Ndi añụñụ-manya wee bụrụ ndi anya-udo. Ndi nkwari na oke-nmefu wee bụrụkwa ndị nwere akọ. Ndi nke Kraist a choghikwa “nma nke élu-arụ nke bụ ịkpa-isi na iyikwasi ihe ọlaedo ma-ọbụ nke ọtụtụ uwe; kama...... nke ahụ nāpụghị imebi nke bu mụọ dị nwayọ dịkwa udo, nke dịkwa oke ọnụ-ahia n’anya Chineke.” lPita 3:3, 4.OdU 49.2

    Ozi-ntute nile nwewokwara ụdị nke ọkwa di nro nye onye nmehie. Nkpụrụ nile nke ozi ndia ka a hụkwara na ndụ ụmụ madụ ndi nārapụghi ịjụ onwe-onye kama ha ñụrikwara ọñu na a gụrụ ha na ndi kwesiri ịta ahụhụ nihi Kraist. Ụmụ madụ hụrụ ezi n’nwogha n’ime ndi nile kwupụtara aha Jisọs. Ọ bụ ụdị nhuku ndia diworo n’afọ ndi gara-aga n’oge nkpọlite nke okpukperechi.OdU 49.3

    Kama ọtụtụ ntute nke oge ugbua nwere ụdi pụrụ iche. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nēkwupụta mgbanwe ha, oke igwe madụ wee n’awunyekwa na nzukọ di iche iche. N’agụghi nkaa, nlụpụta ihe ndia abụghị n’ụdị nke gēme ka e kwenye na e nwewokwa ụdi ibaụba ahụ n’ezi-ndụ nke ime-mụọ. Ìhè ahụ nke nwupụtara n’otu mgbe nādanyụkwa na mgbe nādịghị-anya.OdU 50.1

    Ntute ndị a maara nke-ọma ugbua na-akpalikari omume echeghi-eche, nēmekwa ka ọchichọ dị n’ihe lọrọ ọhụ nke nātụkwa n’anya. Ndi e ritere n’uru n’ụzọ di otua a dighị enwe óké-ọmà n’obi inụrụ nke bụ ezi-okwu sitere n’akwụkwọ-nsọ. Ma-ọbụghị naani okpukperechi na ofufe nwere ụdi àmàrà nke nākpali anụarụ, ọ dighịkwa atụ ha n’anya.OdU 50.2

    Nye mkpụrụ-obi ọbụla nke nwetara ezi ncheghari ka nmekọrita nke ya na Chineke na nke ihe bayere ndụ ebigh-ebi gābụ isi-okwu nke ndụ. Olee ebe mụọ nke odido-nsọ nime Chineke dikwa na nzukọ ukuu ndị a maara aha ha taa? Ndi e zitere n’ozi a dịghịkwa arapụ mpako ha na ihụ ihe ụwa n’anya. Ha a dịghịkwa na njikere ịjụ onwe-onye ugbua karị mgbe ha nādịghị-chegharia. Agwa nke Chineke ka a nādighi ahụkwa n’ọtụtụ nzukọ di iche-iche.OdU 50.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents