Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Enweghị Afọ Ojuju N’etiti ndị Mmụọ ozi

    Lusifa hapụrụ ọnọdụ ya n’iru Chineke, wee pụa je gbasaa enweghị afọ ojuju n’etiti ndị mmụọ ozi. N’ịdị nzuzo dị omimi, ya na iji ụdị nke nsọpụrụ Chineke kpuchie ihe bụ kpọmkwem ebumnobi ya, o wee gbalịsie ike ịkpali enweghị obi ụtọ na enweghị afọ ojuju banyere iwu ndị ahụ e ji achị ndi bi n’eluigwe, na-akọwa na ha bụ ihe mgbochi na-ekwesighị ekwesi nye nnwere onwe ha. O wee na-ekwusi ike na ndị mmụọ ozi kwesiri ige akọ n’uche nke ha onwe ha ntị, ebe ha bụ ndị dị nsọ site n’okike ha. Na Chineke emewo ya ihe ọjọọ site n’iyikwasị Kraịst otuto nke kachasị. Na ọ bụghị na ya na-achọ ibuli onwe ya elu, kama na ya na-achọ inwetara ndị bi n’eluigwe nnwere onwe onye, otu ha gaaba na ndụ dị elu.OdU 3.2

    Chineke nwere ogologo ntachi obi nye Lusifa. E wedaghị ya ala site n’ọnọdụ ya dị elu, ọ bụna mgbe ọ malitere iji okwu ụgha chee n’iru ndị mmụọ ozi. Otutu ugbo ka e kwere ya nkwa nke mgbaghara ma ọ bụrụ na ọ ga-echegharị ma rube isi. Mgbalị dị uku nke naanị ịhụnanya nke na-enweghị nsọtụ pụrụ ichepụta ka a gbalịrị ime ka ndahie ya wee ya anya. Ntamu na enweghị afọ ojuju bụ ihe a na-ahụbeghị mbụ n’eluigwe. Lusifa na onwe ya aghọtaghị na mbụ kpọmkwem bụ ihe ọ bụ bụ ihe na-agabiga n’echiche ya na ihe ga-abụ ihe nlụpụta ya. Ka e gosiri ya nke ọma na iwe ya enweghị ihe kpatara ya, o were Lusifa anya na ihe ndị a Chineke na-arụtụ aka, na-achọ ka o mee bụ ihe ziri ezi n’ezie; na ya kwesiri inabata ya n’iru ọra eluigwe niile. A sị na o mere nke a, ọ gaara azọpụta onwe ya na ọtụtụ ndị mmụọ ozi. A sị na o nwere mkpebi oge a niile ịlọghachikute Chineke, ma nwee afọ ojuju ịnọ n’ọnọdụ ahụ nke Chineke do were ya, a gaara e doghachi ya n’ọnọdụ ọrụ ya. Ma mpako gbochiri ya irube isi. O wee nọgidesie ike na-ekwu na mkpa nchegharị adịghị ya, wee nyefee onwe ya kpam kpam n’òke ndọrọ-ndọrọ nke ọnụma megide onye kere ya.OdU 3.3

    Ihe niile nke akọ n’uche ya dị omimi ka ọ ñagharịrị ugbu a nye nduhie, ka o wee nweta ọmiko nke ndị mmụọ ozi. Ekwensu wee na-ekwupụtara ha na e kpere ya ikpe na ezighị ezi ma napụkwa ya nnwere onwe ya. Site n’ịkpacha anya ñagharịa okwu ndị Kraịst kwuru, o wee bata kpọmkwem ibo ya ebubo ụgha, naekwu na Ọkpara Chineke nwere atụmatụ ime ya ihere n’iru ọra ndi bi n’eluigwe.OdU 4.1

    Ka ha ra bụ ndi ọ na-enweghị ike ịghọgbu ka ha bata n’akụkụ ya ka o boro ebubo na ha enweghị mmasị n’ihe banyere ọdịmma nke ndị bi n’eluigwe. O wee malite igosipụta Onye okike n’ụzọ mmegide nke eziokwu na-adịghị n’ime ya. O wee ghọọ ụkpụrụ ya iji nchepụta nke okwu aghụghọ dị omimi nye ndị mmụọ ozi nsogbu banyere ebumnobi dị iche iche nke Chineke. Ihe niile were anya ka o yikwasịrị uwe mgbagwoju anya dị omimi, o wee si otu a were ndụhie ahaziri ahazi mee ka ọ bụna okwu Chineke nke kachasị iwe anya bụrụ ihe mgbagwoju anya na ihe a ia-enyo enyo. Ọnọdụ ya dị elu nyekwara nduhie ike dị ukuu. Ọtụtụ wee si otu a bụrụ ndị e duhiere iso ya na nnupu isi ya.OdU 4.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents