Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Mgbaghara Nmehie Ọ Nēye Anyi Nnwere-Onwe Pụa N’ige Ntị?

    Ọ bụ na onye nmehie nke a gbagharaworo nmehie ya nwere onwe ya ugbua imebi iwu Chineke? Pọl nāsikwa; “Ayi nēsitekwa n’okwukwe wee mee ka iwu ghara idi ire? Chineke ekwela: kama anyi nēme ka iwu guzosie-ike.” Anyị onwe-anyị bụ ndị nwụworo n’ebe nmehie dị, anyi gēsi anaa nādịkwa ndụ ọzọ n’ime ya?” Jọn Kwuputakwara si: “Nihi na nkaa bụ ihụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ma ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ” N’ọmụmụ-ọhụ ahụ, obi ka a nēme ka ya na Chineke nwe otuolu, na inwe nkwekọrita na iwu Ya. Mgbe mgbanwe nkaa weere ọnọdụ nime onye nmehie, mgbe ahụ ka ọ gabigara site n’ọnwụ banye na ndụ, sitekwa na mmebi-iwu na nnupu-isi rue n’ige nti na ikwesi ntukwasi obi. Ndu ochie ahụ agwusiwokwa, ma ndụ ọhụ nke nkwekọrịta n’otu, okwukwe, na ịhụnanya amalitewokwa. Mbe ahu “ka ezi-omume nke sitere n’iwu ahụ” ka a “gēmezukwa n’ime anyi, bụ ndi n’adighikwa ejegharị nānụ-arụ, kama site nime mụọ.” Okwu nke mkpụrụ-obi gābụkwa: “Lee kam si hụ iwu Gi nanya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m’nātụgharị n’uche.” Ndị Rom 3:31; 6:2; lJọn 5:3; Ndị Rom 8:4; Abụ-ọma 119:97.OdU 55.1

    Ma ọ bụghị site niwu ahụ ụmụ madụ agaghi enwe ezi ita-ụta nke nmehie ha: agaghi ahụkwa mkpa nke ncheghari. Ha adighi echetakwa nkpa ọ di bụ ikwụ-ụgwọ nmehie site n’ọbara nke Kraist. Olileanya nke nzọpụta ka a nānarakwa n’enweghi mgbanwe nke obi ma-ọbụ n’nwogha nke ndụ ọhụ. N’ụzọ di otua naanị mgbanwe nke elu-ọnụ gādi, ma imerime madụ nābanyekwa nzukọ n’adịghikwa enwe njikọ-aka n’otu ha na Kraist.OdU 56.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents