Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ibuli Ịchị Isi Nke Mmadụ Elu

    Kraịst hụtara amụma nke ọlụ ibuli ịchị isi nke mmadụ elu ka ọ bụrụ ihe ga na-achị akọnuche, nke bụrụla ihe ịbụ ọnụ dị egwu n’ọgbọ nile. Ndụmọdụ ya ka ahapụ ịgbaso ndị ndu kpuru isi ka edere n’akwụkwọ ka ọ bụrụ ndụmọdụ nye ọgbọ ndị a na-abịa n’iru.OdU 64.3

    Na chọọchị Rom, nanị ndị nchụ aja ka e nyere ohere ịkọwa akwụkwọ nsọ. Ọ bụ ezie na nhazi ahazigharịrị ihe mere ka akwụkwọ nsọ rute rute onye ọ bụla ma otu ụkpụrụ ahụ nke ndị Rom naara eme gbochiri igwe mmadụ ndị nọ na nzukọ ndị ọzọ ha inyocha akwụkwọ nsọ na onwe ha. A na-ezi ha ka ha nabata ozizi Ya dịka chọọchị si tụgharịa ya. Ọ kaara igwe mmadụ mma ịhapụOdU 64.4

    inweta ihe ọ bụla karịa ịnabata eziokwu nke ya na ihe ha kweere na-enweghị otu olu na agbanyeghị ụzọ were anya akwụkwọ nsọ ji kọwaa ya. Otụtụ dị na njikere iwere mkpụrụ obi ha nye n’aka ndị pastọ. Ha na-agabiga ihe ozizi nke Onye Nzọpụta na amaghị maka ya. Ma ndị ozi Chineke, ha na-eme mmehie? Olee otu anyị ga-esi nwee ntụkwasị obi na odudu ha ma ọ bụghị ma anyị matara site na akwụkwọ nsọ na ha bụ ndị n’ebu ihè. Enweghị ihe ịgba ume ziri ezi n’eduba otụtụ ịgbaso ndị ọka mmụta ma bụrụ ndị ejikọrọ olile anya ha n’ụzọ kwesiri ekwesi. Ha na-ahụ eziokwu banyere oge a na akwụkwọ nsọ na-enwekwa nhuku ike nke Mọ Nsọ n’ebe okwu ahụ dị, ma ha ekwerekwa ka ndị ozi ha kpọpụta ha site n’ebe ihè dị.OdU 65.1

    Ekwensu na enweta igwe mmadụ site na iwere ụdọ nke ịhunanya kekọta ha na ndị ahụ bụ ndị iro nke obe Kraịst. Nkekọta a nwere ike ịbụ na etiti nne na nna, ụmụ, di na nwunye, ma ọ bụ mmekọrịta dị n’etiti ndị obodo. Mkpuru obi ndị nọ n’okpuru ha anaghị enwe ume ige ntị ime ihe ha maara kwesiri ka ha mee.OdU 65.2

    Otụtụ na-asị na ọ dịghị ihe ọ pụtara bụ ihe mmadụ kweere ma ọ bụrụ na ọ ga-ebi ndụ dị mma. Ma okwukwe ka eji azụlite ndụ. Ọ bụrụ na anyị na eziokwu nọ nso ma anyị ajụ ya, anyị jụrụ ha nile, na-ahọrọ ọchịchịrị karịa ihe. Amaghị ihe abụghị ihe ngọpụ nye imejọ ihe ma ọ bụ ime mmehie, ebe e nwere ohere dị ukwuu ịmata Chineke. Nwoke na-eme njem pụtara ebe ụzọ dị ọtụtụ, ihe ngosi nke na-atụ aka ebe ụzọ nke ọ bụla gara dịkwa. Ọ bụrụ na o jighi ihe ngosi ahụ kpọrọ ihe ma soro ụzọ nke o chere dị mma na anya ya, o nwere ike, o ji obi ya nile ma ọ ga-ahụtarịrị onwe ya na ya anọghị n’ezi ụzọ.OdU 65.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents