Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Iweghachi Eziokwu Ahụ

    Ime ka ụbọchị izu ike dị kpọmkwem ka Chineke si chọ n’ụbọchị ikpeazụ bụ nke Aịsaịa kwuru maka ya: “Otu a ka Jehova sịrị, debenu ikpe ziri ezi, mekwanụ ezi omume: n’ihi na nzọpụta m dị nso ịbịa, ezi omume m dịkwa riso ka ekpughe ya. Onye ihe na-agara nke ọma ka onye na-eme nke a, na nwa mmadụ nke naejigidesi ya ike bụ; onye nedebe ụbọchị izu ike, ghara ime ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nke nedebekwa aka ya ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla...ka nwa ala ọzọ nke rapaworo na Jehova ghara ikwu okwu, sị, Jehova aghaghị ikewapụ m na ndị Ya: Ka onozi gharakwa ịsị, Le mụ onwem bụ osisi kpọnwụrụ akpọnwụ. Ụmụ ala ọzọ kwa, ndị na-arapara Jehova, ijere Ya ozi, na ịhụ aha Jehova n’anya, na ịbụrụ Ya ndị oru, onye ọ bụla nke na-edebe kwa ụbọchị izu ike ghara ime ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nke na-ejigidesikwa ọgbụgba ndụ m ike; m ga-eme ka ha bịarue ugwu nsọ m, m ga-emekwa ka ha ñụrịa n’ụlọ ekpere m; aja nsure ọkụ nile ha ga-abụ ihe na-atọ ụtọ n’elu ebe ịchụ aja m: n’ihi a ga-akpọ ụlọ m, ụlọ ekpere dịrị ndị nile dị iche iche”. Aịsaịa 56:1,2,6,7.OdU 69.4

    Okwu ndị a gbasara ndị nile kwere na Chineke n’ọgbọ anyị, dịka ama okwu anyị gụrụ tupu (amaokwu 8). Ebe a na-egosi na ndị na-abụghị ndị nke Chineke na mmalite ga-emecha bụrụ ndị nke Chineke, mgbe ndị oru Chineke na-ekwusa ozi ọma oke ọñụ nye ụwa nile.OdU 70.1

    Onye Nwe Anyị nyere iwu, “kaa iwu a akara n’etiti ndị mmuta m”Aịsaịa 8:16. Akara iwu Chineke dị na iwu nke anọ. Nanị nke a, n’ime ha iri, na-eche anyị n’iru aha na ejiri mara Onye Nwe iwu ahụ. Mgbe “Pope jiri ike ya gbanwe ụbọchị izu ike, ewepụrụ akara ahụ n’ime iwu a. A na-akpọ ndi na-eso ụzọ Chineke ka ha weghachi ụbọchị izu ike dịka ihe ncheta okike na igosi ike Chineke.OdU 70.2

    Nzukọ na-eme mkpesa (Protestants) na-ekwu na ụbọchị mbu n’izu ghọrọ ụbọchị izu ike n’ihi na Jisọs si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ahu. Ma Jisọs na ụmụazụ Ya, ndị Ya na ha so gagharịa enyeghị ụbọchị mbụ nsọpụrụ ma otu. Ime ka ụbọchị mbụ (Sọnde) bụrụ ụbọchị ofufe malitere “na ihe omimi nke mmebi iwu (2 Ndị Tesalọnaika 2:7): nke bụ na mgbe Pọl dị ndụ, amalitelarịị ịlụ ọlụ. Gịnị ka a na-ekwu dịka ihe kwadoro mgbanwe nke a na-adịghị na Akwụkwọ nsọ?OdU 70.3

    Ndi na-eme mkpesa (Protestants) kwenyere “na Akwụkwọ Nsọ nke agba ọhụụ enweghị ihe ọ bụla na-akwado ụbọchị Sọnde, dịka e nwere iwu doro anya maka ụbọchị nke asaa, mgbe a naekwu maka ụbọchị izu ike.” 4George Elliot, The Abiding Sabbath, P. 184.OdU 71.1

    “Rue mgbe Kraịst nwụrụ, agbanweghị ụbọchị nke asaa”, nakwa, ihe ọ bụla edere ede amaara, ndị soro Kraịst je ozi emeghị nke a...bụ inye iwu doro anya kwadoro ịhapụ ife Chineke ụbọchị nke asaa, mewezie nke ụbọchị mbụ n’izu (Sọnde).” 5A. E. Waffle, The Lord’s Day, pp 186 / 188OdU 71.2

    Chọọchị Roman Katọlik, kwenyere na ọ bụ ha gbanwere ụbọchị izu ike, na-ekwukwa na ndị nzukọ ọ bụla na-eme mkpesa, ndị na-efe ofufe ụbọchị Sọnde, na-anabata na ihe Katọlik Chọọchị mere dị mma. Nzukọ Katọlik kwuru ya otu a: “N’oge iwu ochie, Satọde bụ ụbọchị edoro nsọ; kama site na ntuziaka Jisọs Kraịst nyere nzukọ Katọlik, na nduzi nke Mọ Nsọ, weere Sọnde tinye na ụbọchị izu ike (Satọde); ya mere, anyị doro ụbọchị mbụ (Sọnde) nsọ, ọ bụghị ụbọchị nke asaa (Satọde). Sọnde pụtaziri, site n’ụbọchị taa bụrụ kwa, ụbọchị onye nwe anyị”. 6Catholic Catechism o f Christian ReligionOdU 71.3

    E nyere iwu nke a, “Were akpịrị kpọọ mkpu, egbochila, welie olu gi dịka opi ike; we gosi ndị m njehie ha,“ndị Chineke kewapụrụ dịka “ndị m” bụ ndị Ọ chọrọ ka e gosi njehie ha, ndị naeche na ha bụ ndị ezi omume n’ije ozi Chineke. Ma ịba mba nke Onye na-enyocha obi na-egosi na ha bụ ndị na-azọpịa nkuzi nke Chineke; Aịsaịa 58:1,2.OdU 71.4

    N’ihi nke a, onye amụma rụtụrụ aka n’iwu Chineke ha gbahapụrụ: “Ndị ga-esi n’arụ gị pụta ga-enwu kwa ebe niile bụ mkpọmkpọ ebe site na mgbe ebighi ebi gara aga: a ga-akpọkwa gị onye mmechi ntipu, onye nkwazi okporo ụzọ ibi ebi. Ọ bụrụ na ime ka ụkwụ gị si n’ụbọchị izu ike chigharịa, I we ghara ime ihe na-atọ gị ụtọ ụbọchị nsọ m; ọ bụrụkwa na ị kpọọ ụbọchị izu ike ihe ụtọ, ị kpọkwa ihe nsọ Jehova ihe nsọpụrụ; I we sọpụrụ Ya, ghara ime ihe bụ ụzọ gị nile, ghara ịchọpụta ihe na-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ ihe Jehova ga-atọ gị ụtọ;”Aịsaịa 58:12-14.OdU 71.5

    Emere iwu Chineke “Mkpọ mkpọ ihe mgbe nzukọ Katọlik gbanwere ụbọchị izu ike. Ma ugbu a bụ mgbe a ga-emekwa iwu Chineke ka o nwee nsọpụrụ ya.OdU 72.1

    Mgbe Adam na-emehiebeghị, o debere iwu Chineke. N’ime ogige Iden, Adam dobekwara iwu a mgbe o mehiere nwekwa nchegharị, mgbe Chineke chụpụrụ ya site na Iden. Ndị okenye nke Chineke debekwara ya site na Abel, Noa, Abraham, rue Jekọb. Mgbe Chineke gbapụtara Isrel, Ọ kpọsara iwu a nye otụtụ mmadụ.OdU 72.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents