Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 10—Isi Nke Iri Nnukwu Mbgap Ụta

    Mgbe aga ewezuga nchekwa iwu nke mmadụ n’ebe ndị naedebe iwu Chineke nọ, n’ala ọ bụla, a ga-enwe mbibi ndị dị otu a. Dịka oge akara aka n’iwu na-eru nso, n’otu abalị, ndị mmadụ gaagbakọta aka mee ihe ġa-egbochi echiche na ịta ụta.OdU 88.1

    Ndị nke Chineke ụfọdụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ụfọdụ nọ n’ọhịa na oke ugwu na-arịọ maka nchekwa si n’elu. Ndị ji ngwa ọgụ dị iche iche bụ ndị mọ ọjọọ na-achị, na-akwado ọlụ nke ọnwụ. Ugbu a, n’oge awa nke ikpeazụ, Chineke ga-ewere ọnọdụ: “Abụ ka unu ga-enwe dịka n’abalị edowere ememme nsọ; na ọñụ obi, dịka onye nke ji ọja eje ịba n’ugwu Jehova, rue Oke Nkume nke Isrel. Jehova ga-emekwa ka anụ ebube nke olu ya, Ọ ga-emekwa ka ahụ ndakwasị nke ogwe aka ya, na ọnụma nke iwe ya, na ire ọkụ nke ọkụ na-erichapụ erichapụ, na ntipịa, na oke mmiri ozuzo, na aku mmiri igwe” Aịsaịa 30:29, 30.OdU 88.2

    Ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ ga-eme ngwa zute mbibi ha mgbe ha ji oke obi ụtọ na ịkwa emo na-agba ọsọ ikpochapụ ndị ezi omume, ma lee, n’otu ntabi anya, ọchịchịrị karịrị nke abalị gaadakwasị elu ụwa. N’oge ahụ, egugu mmiri nke na-enwu n’ike na ebube nke sitere na oche eze Chineke na-ekpuchi eluigwe niile ya na ụmụ Chineke ndị nọ n’uwa n’obere ọgbakọ dị iche iche naekpe ekpere. A ga-ejide ọtụtụ igwe mmadụ ahụ ndị oke iwe ji. Ha ga-echefukwa ihe bụ iwe ha. Ha ga-ahụ ihe nọchiri ọgbụgba ndụ Chineke ma chọọ ka ekpuchie ha site n’ihè ya.OdU 88.3

    Nye ndị nke Chineke, olu na-ada na-asị, “Legide anya n’eluigwe”. Dika Stefen, onye bụ onye nke Kraịst mbụ atụgburu na nkume, ha we legide anya n’eluigwe, we hụ ebube Chineke, na Nwa nke mmadụ ka Ọ nọ n’oche eze ya. Lee Ọlụ Ndị Ozi 7:55, 56. Ha hụrụ akara eji mee ya ihe ihere, we nụ olu nke na-asị, “Ihe I nyeworom, ana m achọ, ebe mụ onwem nọ, ka m chọrọ ka mụ na ndị ahụ nọdịkwa” Jọn 17:24. Olu we daa na-asị: “Ha abịawo n’ịdị nsọ, na-enweghịkwa ntụpọ, bụ ndị emerụghị onwe ha. Ha edebewokwa okwu ntachi obi m”.OdU 88.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents