Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    N’ime Obodo Nsọ Ahụ

    N’ime ọnụ ọgụgụ ndị agbapụtara nke na-enweghị ịgụta ọnụ, ha lekwasịrị Jisọs anya. Anya niile legidere ebube Ya bụ “onye iru Ya bibiri ebibi nke uku karị onye ọ bụla, ụdị arụ Ya kwa karị ụmụ mmadụ” Aịsaịa 52:14. N’isi ndị ahụ meriri ka Jisọs kpukwasịrị okpu ebube. Onye ọ bụla nwere okpu bu “aha ọhụụ ya” (Nkpughe 2:17) na ihe odide nke sị, “Nsọ ka Jehova dị”. N’aka ọ bụla ka a hụrụ igu nkwụ nke mmeri na opi na-egbu mara mara. Dịka ndị mọ ozi na-amalite abụ, aka niile ewe malite ịkpọ ụbọ n’ụzọ kwesiri ekwesi. Olu ọ bụla na-enye otuto sị: “Onye ahụ Nke na-ahụ anyị n’anya, Onye tọpụkwara anyị na mmehie niile anyị n’ime ọbara Ya; O we mee ka anyị bụrụ ala eze, ndị nchụ aja nye Chineke na Nna nke Ya, ọ bụ Ya ka otuto niile, na ike niile dịịrị rue mgbe niile ebighi ebi.” Nkpughe 1:5,6.OdU 94.3

    Obodo Nsọ ahụ dị n’iru igwe mmadụ ndị agbapụtara. Jisọs ewee meghe ọnụ ụzọ Ya, mba niile bara n’ime ya bụ ndị debere eziokwu ahụ. Ewe nụ olu Ya, “Bịanụ, ndị agọziri agọzi nke Nnam, keta nụ ala eze ahụ edoziworo unu site na ntọ ala nke ụwa.” Matiu 25:34. Kraịst nyere Nna Ya ndị o jiri ọbara Ya gbapụta, we sị, “Le, mụ onwem na ụmụntakịrị Chineke nyere m”. “Ndị I nyeworo m, echekwara m ha”. Hibru 2:13, Jọn 17:12. O! Oge mweli nke awa ahụ, mgbe Nna ebube, ihu ndị agbapụtara gaahụ ụdị Ya, ewe wezuga mmehie niile, mmadụ ewe bụrụ onye ya na Chineke ga-anọ n’udo.OdU 95.1

    Onye nzọpụta ga-enwe ọñụ ịhụ ndị agbapụtara site na ahụhụ na ihere emere Ya. Ndị agbapụtara ga-eso Ya ñụrịkọ ọñụ; ha ga-ahụkwa ndị ha ritere n’uru site na ekpere ha. Ọñụ ga-ejụpụta obi ha mgbe ha hụrụ na ndị ahụ kpọbatara ndị ọzọ.OdU 95.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents