Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 11—Isi Iri Na Out Mmeri Nke Ịhụnanya

    Na ngwụcha nke otu puku afọ, Kraịst na ndị agbapụtara na igwe ndị mọ ozi ga-alọghachi n’ụwa. Ọ ga-eme ka ndị mmehie nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie ịnata ọlila n’iyi ha. Ha ga-abịa n’igwè a na-apụghị ị gụta ọnụ dịka aja nke osimiri, na-ebukwa ihe ọmụma nke ọrịa na ọnwụ. nke a ga-abụ ihe dị iche ya na ndị e mere ka ha bilie na mbilite n’ọnwụ nke mbụ.OdU 100.1

    Anya niile ga-ahụ ebube nke Nwa Chineke. N’otu olu, ndị mmehie na-ele ndị agbapụtara ga-eti mkpu n’oke olu sị: “Ngọzi ga-adịrị onye ahụ na-abịa n’aha Onye Nwe Anyị!”Matiu 23:39. Ọ bụghị ịhụnanya ga-eme ka ha kwupụta okwu dị otu a. Ike nke naagbaso eziokwu ga-eme ka okwu ndị a si n’ire ndị na-enweghị mmasị pụta. Mgbe ndị mmehie na-aba n’ili, otu a kwa ka ha ga-eji ịkpọ asị megide Kraịst ya na mmụọ nke nnupu isi. Enyeghịkwa ha ohere nke nchegharị ohụụ iji mezie ihe mebiri emebi na ndụ ha gara aga.OdU 100.2

    Otu a ka onye amụma sịrị: “Ụkwụ ya abụọ ga-eguzokwa n’ụbọchị ahụ n’elu ugwu Oliv...Ugwu Oliv ga-agbawakwa n’etiti abụọ ya” Zekarịa 14:4. Dịka Jeruselem ọhụụ ahụ si n’elu ugwu na-agbadata n’ala, ọ na-anọkwasị n’elu ebe ahụ a kwadebere, Kraịst, na ndị Ya na ndị mmọ ozi we bata na obodo nsọ ahụ.OdU 100.3

    Mgbe a ga-ekewapụ ya n’ọlụ nke nduhie, eze nke ihe ọjọọ ga-abụ onye ihu ọjọọ kpọrọ, onye eweturu mmọ ya ala, ma mgbe emere ka ndị mmehie nwụrụ anwụ si n’ọwụ bilie, o we hụkwa igwè ọnụ ọgụgụ ha dị ka aja dị n’ala, olile anya ya tutekwara ọzọ. Ọ kweghị ka emerie ya n’oke ndọrọndọrọ ahu. Ọ ga-akpọkọtakwa ndị ahụ furu efu bata n’ime ọkọlọtọ ya. Site n’ịjụ Kraịst, ha nabatara ọchịchị onye isi nnupu isi, dịkwa njikere ime ihe ọ naachọ. Mana dịka aghụghọ ya nke mbụ siri di, ọ hụtaghị onwe ya dịka Setan. O were onwe ya dịka onye kwesiri ekwesi inwe ụwa a, onye a napụrụ ihe nketa n’ụzọ na-ekwesighi ekwesi. Ọ naanọchita anya onwe ya dịka onye mgbapụta, na-emesikwa obi ya na ndị otu ya eduhiere eduhie ike na ọ bụ site n’ike ya onwe ya ka e jiri mee ka si na ili ha bilie. Setan mere ka ndị na-adịghị ike dị ike, we werekwa ike nke ya onwe ya duru ha ịnata obodo nke Chineke. Ọ na-egosikwa ha igwe mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si n’ọnwụ bilie, we kwupụtakwa na dịka onye isi ha, na ya gaeweghachi oche na ala eze ya.OdU 100.4

    N’ime igwè ndị mmadụ a, bụ ọgbọ nke birilarịị n’ụwa tupu oge uju mmiri, ndị ikom tozuru etozu, ndị akọnuche ha dị elu, ndị ikom ndị ọlụ ebube ha mere ka ha fee nghọta dị elu ofufe dị ka chi, kama ọ bụ ndị obi ọjọọ ha na nrụpụta ọjọọ ha mere ka Chineke hichapụ ha na ihe O kere eke. E nwere ndị eze na ndị ọchị agha a na-emeribeghị n’agha nke mbụ. N’ọnwụ, ndị dị otu a e nweghị mgbanwe ọ bụla ha nwetara. Mgbe ha si n’ili na-apụta, ọ bụkwa otu nkwali ahụ bụ ka ha merie bụkwa ihe chịrị achị n’ime ha mgbe ha dara.OdU 101.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents