Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Mkpepụta Nke E mere N’ihi Mmadụ

    Eluigwe niile hụrụ mkpughe nke ikpe ziri ezi nke Chineke Ekwensu ekwuwo na ọgbọ nke mmadụ nke meworo mmehie enwekwaghị mgbaputa. Ma ọmụma ikpe nke iwu ahụ dakwasịrị Onye ahụ nke ya na Chineke hata n’otu, mmadụ wee bụrụ onyc nweere onwe ya ịnabata ezi omume nke Kraịst, ma site n’inwe nwute banyere mmehie ya na iwedata onwe ya ala wee nwce mmeri n’ebe ike Ekwensu dị.OdU 8.2

    Ma ọ bụghị naanị ịgbapụta mmadu ka Kraịst ji bịa n’ụwa ịnwụ ọnwụ. Ọ bịara igosi ụwa niile dị iche iche na iwu Chineke enweghị mgbanwe ma zikwa na ikpe ziri ezi na ebere bụ ntọala nke ọchịchị Chineke. N’ikpeazụ, a gaje ịhụ na mmehie enweghị ihe kpatara mmalite ya. Mgbe Onye ikpe nke ụwa niile ga-ajụ Ekwensu sị, “Gini mere iji nupu isi megidem?” Onye ahụ nke malitere mmehie agaghị enwe nzaghachi ma ọ bụ ihe nrụtụ aka ọ bụla.OdU 9.1

    Na mkpu akwa ikpe azụ ahụ nke Onye nzọpụta ụwa tiri sị, “Ọ gwusiwo” ka a kụrụ atañụ ọnwụ nke Ekwensu. Mgbe ahụ ka ndọrọ ndọrọ ikpeazụ ahụ nke nọrịrị na-aga n’ihu bịaruru na mkpebi. Mgbe ahụ ka e mesiri ya ike na mmehie ga-enwe mkpochapụ ikpeazụ. Mgbe “ụbọchị ahụ ga-abịaru, bụ nke na-ere dịka ite ọkụ,...ndị nganga niile, na ndị niile na-eme ihe mmebi iwu ga-abụ ahịhịa ọka, ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Jehova nke ụsụụ niile nke ndi agha sịrị, ọ gaghị arapụrụ ha mkpọrọgwụ ma ọ bụ alaka” (Malakaị 4:1).OdU 9.2

    Ihe ọjọọ agaghị apụtakwa ihe ọzọ rue ebighi ebi. A gaasọpụrụ iwu Chineke dịka iwu nke inwe onwe onye. Ndị e kere eke, ndị anwapụtaworo ma hụ na ha kwesịrị ekwesi agaghị alaghachi azụ ọzọ site n’ofufe nke ha na-enye onye ahụ nke e gosiworo agwa ya dịka ịhụnaya na-enweghị ọgwụgwụ na amamihe na-enweghị nsọtụ. Ndọrọ ndọrọ ukuu ahụ nke dị n’etiti Kraịst na Ekensu bụ n’ihi agwa Chineke, ikpe ziri ezi, ya na iwu ya.OdU 9.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents