Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ọmụma Ikpe Megide Ndị Nnupu Isi

    N’iru ndị bi n‘ụwa na eligwe akpọkọtara ọnụ ka e kpukwasịrị Nwa Nke Chineke okpu eze. Ugbu a, e nyefela n’aka Ya ike niile nke ọchịchị, Eze ndị eze ekwubiela okwu megide ndị na-enupu isi, ndị mebiri iwu Ya ma kpagbuekwa ndị na-eso ụzọ Ya. “M we hụ oke oche eze dị ọcha, na Onye na-anọkwasị ya, Onye ụwa na eligwe gbapụrụ n’iru Ya, ahụghịkwa ebe ọ bụla nye ha. M we hụ ndị nwụrụ anwụ niile, ndị uku na ndị nta, ka ha naeguzo n’iru ochc eze ahụ; e wee saghe akwụkwọ dị iche iche: a saghekwara akwụkwọ ọzọ nke bụ akwụkwọ nke ndụ: e wee kpe ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe edererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche, dịka ọlụ ha si dị” Nkpughe 20:11, 12.OdU 102.4

    Dịka anya jisọs na-elekwasị n’arụ ndị ajọ omume, ha matararịị mmehie nile ha mere. Ha hụkwara ebe ụkwụ ha sitere n’ụzọ nke ịdị nsọ we chipu. Ọnwụnwa nile nke nduhie nke ha kwadoro site n’inye ohere nke ime ihe ọjọọ, ileda ndị ozi Chineke anya, ịjụkwa ịdọ aka na ntị, ịlelị ifufe nke ebere site na ekweghị ekwe, obi nke na-enweghị nchegharị; ha nile dịka ihe e dere na mkpụrụ okwu nke ọkụ.OdU 103.1

    N’elu oche eze ahụ ka ekpughere obe ahụ. Dịka ebe ihe emere sara mbara ka a na-ahụta ka Adam siri we daa, ya na ihe so ya emere maka ngbapụta nke mmadụ. Ịdị ala nke ebe ọmụmụ nke Onye Nzọpụta, ndụ nke Ya dị nnọọ mfe; baptizim emere Ya na osimiri Jọdan, obubu ọnụ Ya na ọnwụnwa a nwara Ya n’ọzara; ime ka ngọzi nke eligwe pụtara ndị mmadụ ihe site n’ije ozi Ya;ụbọchị ndị jupụtara n’ọlụ ebere, abalị ndị e kpere ekpere n’elu ugwu, izu a gbara nke sitere n’obi ọjọọ na anya ụfụ bụ ihe ndị ejiri kwụghachi Ya dịka ihe nrita; ihe omimi dị n’ime ahụhụ ọ tara na Getsemane nke dị n’okpuru mmehie nke ụwa; nrara araara Ya nye n’aka igwe ogbu mmadụ; ihe ndị mere n’abalị ahụ dị oke egwu - onye mkpọrọ ndi na-eso ụzọ Ya gbaghapụrụ, Onye akpọpụtara ikpe Ya ikpe n’ụlọ onye isi nchụ aja, n’ime ụlọ ikpe nke Paịlet, n’iru Herọd onye a na-atụ ụjọ, akwara ya emo. me Ya akaja, taa Ya ahụhụ, makwa Ya ikpe ọnwụ - ihe ndị a niile ka e gosipụtara nke ọma.OdU 103.2

    Ma ugbu a, n’iru igwe mmadụ na-echigharị echigharị ka ekpughere ihe omume nke ikpeazụ: Onye ji ndidi na-ata ahụhụ ka ọ na-aga n’okporo ụzọ Kalvarị; Eze nke eligwe ka o koro n’elu obe; ndị nchụ aja na ndị ozizi ka ha na-akwa oge ọnwụ Ya emo; ọchịchịrị nke karịrị nkọwa nke mmadụ nke na-egosikwa mgbe Onye Mgbapụta nke ụwa nyere ndụ Ya.OdU 104.1

    Ihe ngosi a jọrọ nnọọ njọ dị ka ọ dị. Setan na ndị otu ya enweghị ike ha ga-eji wezuga onwe ha n’ime onyonyo a. Onye ọ bụla n’ime ha na-akpọghachi echiche ya azụ banyere ndị ya onwe ya mere. Herọd, onye gburu ụmụntakịrị Betlehem n’enweghị ihe ọjọọ ha mere; nwunye ya, onye ọbara Jọn na-eme baptizim dị n’isi ya; ndị na-adịghị ike; Pailet, onye e ji emezu ihe oge kwuru; ndị agha na-akwa emo; igwe mmadụ ndị kwara akwa, “ọbara Ya gaadị n’isi anyị na n’isi ụmụ anyị!” - ha niile na-achọ izopu n’anya Onye kachasị ihe niile elu, ebe ndị agbapụtara na-atụsa okpu eze ha n’ụkwụ Onye Nzọpụta, na-eti mkpu na-asị, “Ọ nwụrụ n’ihi m!”OdU 104.2

    E nwekwara Nero, onye ọjọọ nke jupụtara n’obi ọjọọ na arụ dị iche iche, ka ọ na-elegide anya ka a na-ebuli ndị ahụ o sitere n’ọlụ Setan kpagbue oke mkpagbu dị elu. Nne ya gbakwara ama banyere ọlụ Ya, ebe oke mmetụta ya nke nwetara agbamume sitere na nhuku na nlere anya Ya bụ ndị mịtara mkpụrụ n’ime ime mpụ nke mere ka ụwa maa jijiji.OdU 104.3

    E nwere ndị ụkọ Chukwu, ndị sooro Popu, nakwa ndị ụkọ Chukwu ọkwa ha dị elu, ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị nnọchita anya Kraịst, ma ha ji okporo osisi e ji ata mmadụ ahụhụ na ụlọ mkpọrọ dị n’ime ala ebe a na-ekedo mmadụ ma gbue ma ọ bụkwanụ kpọọ ya ọkụ, we na-achịkọ ndị mmadụ. E nwere Popu ha ndị na-anya isi ndị buliri onwe ha elu karịa Chineke, ha lezikwara anya we gbanwee iwu Onye kachasị ihe Niile Elu. Ndị ụkọ Chukwu ga-enyerịrị nguzi nye Chineke. Oge adịghịkwara ha ịhụta na Onye mazuru Ihe niile ejighị iwu Ya eti egwuregwu. Ugbu a, ha matara na Kraịst na-egosi mmasị Ya n’ebe ịta ahụhụ ndị Ya dị.OdU 104.4

    Uwa ọjọọ a niile ka a ga-akpọpụta ka ha kwụrụ ka e kpee ha ikpe banyere mgba okpuru ha gbara megide ọchịchị nke eligwe. Ha enweghị onye ọ bụla ga-arịọrọ ha arịrịọ, ha enweghịkwa ngọpụ ọ bụla, e we ma ha ikpe ọnwụ ebighi ebi.OdU 105.1

    Ndị ọjọọ a hụkwara ihe ha tufuru site na nnupu isi ha. “Ihe ndị a niile, ‘bụ akwa mkpụrụ obi ndị a furu efu, a gaara m. O, obi ọmịko a na-amaghị ebe o si! A gbanwerela m, udo, ọñụ, na nkwanye ugwu we họrọ e nweghị obi ụtọ, ihe ọjọọ na ịda mba”. Onye ọ bụla ga-ahụ na ngụpụ a gụpụrụ ha bụ ihe kwesiri ekwesi. Site na ndụ ha, ha kwupụtara sị: “Anyị agaghị ekwe ka nwoke a (Jisọs) chịa achị n’ime ndụ anyị”.OdU 105.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents