Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ịla N’iyi Dị Ọjọọ nke Ndị Mmehie

    Agwa Setan enweghị mgbanwe. Nnupu isi, dịka mmiri naasọ asọ sọpụtakwara ọzọ. Setan kpebiri na ya agaghị ewezuga ọnwe ya na mgbalị ikpeazụ imegide Eze nke eligwe. Kama n’ime igwe ndị ahụ a na-apụghị ịgụ ọnụ, bụ ndị o dubara na nnupu isi, o nweghị otu onye hụtara ọ bụna ịdị uku ya. E mejupụtara obi ndị mmehie a n’ịkpọ asị megide Chineke bụkwa nke na-akwali Setan, kama ha hụrụ na ọnọdụ ha enweghị olile anya.OdU 107.1

    Ọkụ si n’ebe Chineke nọ n’ime eligwe we wụdata. Ụwa we gbawasịa. Ọkụ na-erepịa erepịa we si n’ime mgbawa oghere nke ụwa ghere oghe we pụta n’ike. Oke nkume ndị ahụ we ree ọkụ. Ihe niile dị n’eligwe ga-agba kwa ọkụ we laa n’iyi, ụwa na ọlụ a lụrụ n’ime ya ġa-erechapụkwa. Pita 3:10. Elu ụwa ga-adị ka otu ihe gbara ọkpụrụkpụ, gbazere agbaze, ihe buru ibu, mmiri ọkụ naasụ n’elu ọkụ. Nke a bụ “ụbọchị ịbọ ọbọ Jehova nwere, arọ nkwụghachi dịịrị ise okwu Zaịọn.” Aịsaịa 34:8.OdU 107.2

    A tara ndị mmehie ahụhụ “dịka ọlụ ha si dị”. Ọ bụghị nanị na atara Ekwensu ahụhụ n’ihi nnupu isi ya a takwara ya ahụhụ n’ihi mmehie ụmụ Chineke ndị o dubara n’ime mmehie. Ọ bụ n’ime ọdọ ọkụ ka a lara ndị mmehie n’iyi, mkpọrọgwụ ha, na alaka ha. Ekwensu bụ mkpọrọgwụ ha, ndị na-eso ụzọ ya bụ alaka ya. A kwụọla ụgwọ iwu n’izu oke, e mezuela ihe ikpe ziri ezi naachọ. Ọlụ mbibi nke Ekwensu agaghị adịkwa ọzọ rue ebighi ebi. Ugbu a ka a napụtara ndị Chineke kere eke pụa n’ọnwụnwa niile nke Ekwensu.OdU 107.3

    Dịka e jiri ọkụ kechikọta ụwa a, ndị eziomume bụ ndị nọ na nchekwa nke Obodo Nsọ ahụ. Ebe Chineke bụ ọkụ nrepia nye ndị ajọ omume, Chineke bụ ihe mgbochi nye ndị Ya. Gua Nkpughe 20:6; Abụ Ọma 84: 11.OdU 108.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents