Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Onye Iro Nke Nọ Na Nche Mgbe Nile

    Onye iro ahụ nke nọ na nche mgbe nile na-ezubata onwe ya n’ezi na ụlọ nile, n’ama nile, n’ime nzukọ, na nzukọ ukwu nke obodo na n’ụlọ ikpe dị iche iche, na-eweta mgbagwoju anya, nghọgbu na nduhie, ma na-ebibikwa mkpụrụ obi na arụ nke ndị ikom, na ndị inyom, na ụmụnta ebe nile. Ọ na-eweta mkposa nke ezi na ụlọ dị iche iche, na-akụnyekwa ịkpọ asị, ọgba aghara, nnupu isi, na igbu mmadụ dịka mkpụrụ. Ụwa wee na-ele ọnọdụ ndị a anya dịka a ga-asị na otu a ka Chineke si chọọ ya, na ha kwesikwara ịdị otu a. Ka ha ra bụ ndị na-enweghị mkpebi siri ike ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ ndị oru Ekwensu. Mgbe ndị nke Kraịst na-ahọrọ ka ha na ndị na-amaghị Chineke na-ejegharị, ha na-eduba onwe ha n’ọnwụnwa. Ekwensu na-ezopụ onwe ya n’anya ha ma werekwa ihe mkpuchi nke nduhie kpuchie anya ha.OdU 11.3

    Ịgbaso omenaala ndị ụwa na-adọta nzukọ Kraịst nye ụwa, o nweghị mgbe ọ na-adọta ụwa nye Kraịst. Iso mmehie na-enwe mkpakọrịta na-eme ka mmehie ghara ịsọ oyi dịka o kwesịrị. Mgbe ọnwụnwa ma ọ bụ ule siri ike bịakwasịrị anyị n’ụzọ nke ije ozi anyị, mgbe ahụ ka o doro anya na Chineke na-ekpuchita anyị, ma ọ bụrụ na anyị ewere onwe anyị weba n’ime ọnwụnwa, anyị gaada mgbe na-adịghị anya.OdU 12.1

    Onye ọnwụnwa ahụ na-ejikarị ndị ahụ bụ ndị a na-echeghị na ha nọ n’okpuru ya nụzọ ọ bụla. Onyinye akara aka mmadụ na omume-owere-ahụ ndị mmadụ bụcha ihe ndị Chineke nyere; ma ọ bụrụ na ihe ndị a emee ka mmadụ si n’ebe Chineke nọ pụa, ha aghọwọ ọnya. Ọtụtụ dị, ndị nwere akọ-na-uche a zụrụ nke ọma, ma nwekwa omume mara mma, ma ha bụ ngwa ọlụ añụchara añụcha n’aka Ekwensu.OdU 12.2

    Echefula ịdọ aka na ntị ahụ nke akwụkwo nsọ nke nọjerịị na-ada site n’ọgbọ ndị gara aga ma na-erutekwa anyị taa: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche; onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe bụ Ekwensu; dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, naachọ onye ọ ga-elomi”. “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu we pụụ iguzogide ihe nile Ekwensu na-ezupụta” (1 Pita 5:8; Ndị Efesọs 6:11). Onye iro uku anyị na-ejikere n’ihi ọgụ ikpeazụ ya. Ka ha ra bụ ndị na-eso Jisọs ka onye iro a ga-aluso ọgụ. Mgbe ọ bụla onye nke Kraịst na-agbaso ụzọ Chineke karịị, mgbe ahụ ka ọ na-apụta ihe karịị ịbụrụ onye Ekwensu na-ebuso agha.OdU 12.3

    Ekwensu ji ọnwunwa ọkụ na nke aghụghọ dị iche iche zute Kraịst n’ụzọ nile; ma achụghachiri ya azụ n’ọgụ nile. Mmeri ndị ahụ na-eme ka ọ dị ire anyị onwe anyị inwe mmeri. Nye ndị nile ndị na-achọ inweta ike, Kraịst ga-enye ha ike. Ọ dịghị onye ọ bụla Ekwensu pụrụ imeri ma ọ bụrụ na o kwenyeghị ka e merie ya. Onye ọnwụnwa enweghị ike ọ bụla ịñagharị akọ na uche ma ọ bụ iji aka dị ike mee ka mkpụrụ obi mee mmehie. O nwere ike iweta nhuju anya, ma ọ bụghị mmerụ. Mmeri ahụ nke Kraịst meriri kwesiri inye ndị na-eso ụzọ Ya agbamume nke obi ike iji lụa ọgụ megide mmehie na Ekwensu.OdU 13.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents