Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ije Ozi Nke Ndị Mmụọ Ozi Na-Enye Aka

    E kpughere ndị mmụọ ozi Chineke na ndị mmụọ ọjọọ nke ọma n’ime akwụkwọ nsọ; ọlụ na ije ozi ha batakwara nke ọma n’akụkọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị mmụọ ozi dị nsọ, ndị “naeje ozi n’ihi ndị gaje iketa nzọpụta (Ndị Hibru 1:14) ka ọtụtụ mmadụ chere na ha bụ ndị mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. Ma akwụkwọ nsọ na-egosi na ha abụghị ndị mmụọ ndị si na arụ ndị nwụrụ anwụ pụta.OdU 13.2

    Tutu ekee mmadụ, ndị mmụọ ozi dịịri adị, n’ihi na mgbe atọrọ ntọala nke ụwa “kpakpando ụtụtụ bụkuru abụ n’otu, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọñụ ike” Job 38:7. Mgbe mmadụ dasịrị, e zigara ndị mmụọ ozi ka ha chee osisi nke ndụ nche; mgbe ahụ mmadụ ọ bụla anwụbeghị. Ndị mmụọ ozi karịrị mmadụ elu, n’ihi na e mere mmadụ “ka ọ dị ala nke nta karịị ndị mmụọ ozi” (Abụ Ọma 8:5).OdU 13.3

    Onye amụma sịrị, “a nụrụ m olu ọtụtụ mmụọ ozi gburugburu oche eze ahụ”. N’iru Eze nke ndị eze ka ha nọ chere“ndị na-ejere ya ozi, bụ ndị na-eme ihe ọ na-achọ”, “ndị na-aña Ya ntị n’olu nke okwu Ya”, “igwe ndị a na-apụghị ịguta ọnụ” (mkpughe 5:11; Abụ Ọma 103:20, 21; Ndị Hibru 12:22). Dịka ndị ozi nke Chineke, ha na-apụ n’oyiyi “nke amụma mgbe ọ naegbu”, ife ufe ha dịkwa oke ngwa ngwa. Mmụo ozi ahụ nke bịaruru n’ili Onye Nzọpụta nke ogbu mara-mara nke iru ya dịka amụma, nke mere ka ndị nche maa jijiji n’ihi egwu, ha we “bịa dị ka ndị nwụrụ anwụ”. Mgbe Senakerib kwulụrụ Chineke ma tinyekwa Isrel n’ọnọdụ egwu, “mmụọ ozi nke Jehova pụrụ, ma tigbuekwa n’ọgbọ agha ndị Asiria, ndị agha dị otu narị puku na puku iri asatọ na ise na ọnụ ọgụgụ” (Ezikel 1:14; Matiu 28:3,4; 2 Ndị-Eze 19:35).OdU 13.4

    A na-ezigakwa ndị mmụọ ozi ịlụ ọlụ ebere nye ụmụ Chineke. E zigara ha gakwuru Abraham iwetara ya nkwa dị iche iche nke ngọzi; garue Sọdọm ịdopụta Lọt pụa na mbibi, gakwuru Elaịja, mgbe ịla n’iyi chere ya iru n’ọzara; gakwuru Elaịsha, na-eji ụgbọ ala ọkụ na ịnyịnya ọkụ mgbe ndị iro ya gbara ya gburu gburu; gakwuru Daniel, mgbe arapụrụ ya ịbụrụ ọdụm ihe oriri; gakwuru Pita, mgbe ọnwụ chere ya iru n’ụlọ mkpọrọ Herọd; gakwuru ndị mkpọrọ nọ na Filipaị; gakwuru Pọl, n’abalị nke ebili mmiri nke osimiri; gaa imeghe obi Kọnịlịọs inabata ozi ọma; gaa iziga Pita iji ozi nke nzọpụta gakwuru onye mba ọzọ nke ọ naamaghị - ya mere, ndị mmụọ ozi abụrụwo ndị na-ejere ụmụ Chineke ozi.OdU 14.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents