Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 6—Nnwogha Ahụ

    Ahụrụ m na okwukwe nke ndị n’eso ụzọ Ya nwetara agbam-ume nke ukuu site na nwogha ahụ. Chineke họọrọ inye ndị n’eso ụzọ ya ihe ngosi sịrị ike na Ọ bụ ya bụ Mesaia ahụ e kwere na nkwa, ka ọbụna nime iri-uju na mkpọchụ-iru ha adgaghị etufucha ntukwasị-obi ha. Na nnwogha ahụ, Onyenwe-anyị zigara Mosis na Elaija ikwuru Jisọs okwu banyere nhuju anya na ọnwụ ya. Kama ihọrọ ndị mụọ-ozi ikparitere Ọkpara ya ụka, Chineke họọrọ ndị nweworo rị amamihe n’ime ndụ nke ọnwụnwa niile nke elu-ụwà. Naanị ndị n’eso ụzọ Ya ole na ole ka e kwere ka ha nọyere ya ma hụkwa iru ya ka o nwụpụrụ site n’ebube nke Chineke, ma hụkwa uwe Ya ka ọ chapụrụ na ebguke-egbuke, ma nụkwa olu nke Chineke, n’ike n’oke-ebube, ka ọ n’asị Nka bụ Ọkpara m hụrụ n’anya, nụrụ nụ olu Ya. Elaija na Chineke ejekowori ije, ọlụ ya adịghị mgbe ọbụworo ihe obi-ụtọ. Chineke sitekwara n’aka ya maa nmehie ụta. Ọ bụkwaara onye-amụma nke Chineke, bụrụkwa rị onye gbaworo ọsọ site n’otu ebe rue n’ebe ọzọ n’ihi izọpụta ndụ ya. A chụrụ ya nta dịka anụ ndọgbu ka e wee bibie ndụ ya. Ma Chineke kpọọrọ Elaija laa na ndụ. Ndị mụọ-ozi kuuru ya n’ebube n’ọñụ nke nmeri rue eluigwe.NUA 34.1

    Mosis abuwọkwa ri nwoke nke Chineke nyere ùgwù rie nne. Ọ dikwara ukuu karị onye ọbụla ọzọ bụru ya ụzọ bie ndụ n’ụwà. Ọ hụtara amara ikwuru Chineke okwu iru-na-iru dịka madụ na enyi ya si ekwurite okwu. E nyere ya ohere ihụ ìhè ahụ n’enwụ enwụ na ịdị mma nke ebube ahụ n’ekpugịde Nna ahụ. Site n’aka Mosis Onyenwe-anyị napụtara ụmụ Izrel pụa n’oru nke Ijipt. Mosis bụkwaara onye-ogbugbo nye ụmụ Izrel. Mgbe niile ka a ọ n’eguzo n’agbata ha na iwe-ọkụ nke Chineke. Mgbe ọbụla iwe-ọkụ nke Chineke binwụru megide Izrel n’ihi ekweghị-ekwe ha, ntamu ha, na nmehie ha dị ukuu, ihụnanya Mosis n’ebe ha dị ka a n’anwale. Chineke kwere ya nkwa sị ọbụrụ na ọ g’enye ohere, ka ya bibie Izrel, na Ọ g’esitekwa na ya mụta mba ọzọ dị ukuu. Mosis gosịrị ihụnanya ya n’ebe izrel nọ site nịrịosi arịrịọ ike n’isi ha. N’obi nke ịda mba ya ọ riọrọ Chineke ka O chegharịa site n’iwe ya dị oke egwu, ma gbahara Izrel, mọbụ ka O hichapụ aha ya site nakwụkwọ Ya.NUA 35.1

    Mgbe Izrel tamuru ntamu megide Chineke megịkdekwa Mosis, n’ihi na ha e nwetaghị miri, ha boro ya ebubo idupụta ha igbusi ha na ụmụ ha. Chineke nụkwara ntamu ha niile, wee gwa Mosis ka o kwue okwu nye nkume, ka ụmụ Izrel nweta miri. Mosis tiri nkume ahụ ihe n’iwe, wee were otuto nye onwe ya. Inọgịdesike na nkpafu na ntamu nke ụmụ izrel a kpatoworo ya oke iri-uju na ochefuru na nwoge ka ora bụ ịdị ukuu nke nnagịde nke Chineke n’ebe ha nọ, na ọbụna ntamu ha abụghị megide Mosis, kama ọ bụ megide Chineke. Naanị banyere onwe ya ka o chere, otu e mehieworo ya rie nne, na otu ha siri nweghị obi-ekele nye ya, n’ihi omimi nke ihụnanya ya n’ebe ha nọ.NUA 36.1

    Ka Mosis tiri nkume ahụ ihe, ọ rapụrụ inye Chineke nsọspụrụ na ibuli Ya elu n’iru ụmụ Izrel ka ha wee nye Chineke otuto. N’ihi nka, Chineke were iwe megide Mosis, wee kwue na ọ gaghị abanye nàlà nkwa ahụ. Ọ bụ ụkpụrụ Chineke inwapụta Izrel mgbe niile site nịkpọta ha nọnọdụ nkpa, ma n’ ime oke-mkpa ha kwa, igosipụta ike Ya, ka o wee nọgịde nuche ha, ka ha n’ enyekwa Ya otuto.NUA 36.2

    Mgbe mosis rịdatara site nugwu ahụ n’ejidekwa mbadamba nkume abụa ahụ, wee hụ Izrel ka ha n’efe nwa ehi ola-edo ahụ, iwe ya kpaliri nke ukuu, na ọ tọgbọrọ mbadamba nkume abụa ahụ ma kurie ha. Ahụru m na Mosis e mehieghị n’omume nka. Ọ bụ iwe nke Chineke ka o were, nwekwa ekworo n’ihi otụtọ Ya. Kama mgbe ọ danyere n’ọchịchọ-obi nke anụ-arụ, ma nara otuto nye onwe ya, nke dịrị naanị Chineke, o mehiere, n’ihi nmehie nka kwa, Chineke e kweghị ya ka ọ banye àlà nkwa ahụ.NUA 37.1

    Ekwensu nọkwa ri n’achọ ihe o g’esite na ya bo Mosis ebubo n’iru ndị mụọ-ozi. Ekwensu ñụrịrị na nmeri n’ihi na o mewo ya ka o mejọọ Chineke, o wee ñurịa na nka, wee gwa ndị mụọ-ozi na mgbe Onye-nzọpụta nke ụwà g’abia ịgbapụta madụ, na ya g’enwe ike imeriekwa ya. N’ihi nmehie nka Mosis batara n’okpụrụ ike nke Ekwensu — bụ ike nke ọnwụ. Asi na ọ nọgịdesịrị ike, ma meghịkwa nmehie site n’inara otụtọ nye onwe ya, Onyenwe-anyi gaara akpọrute ya àlà nkwa ahụ, ma kpọrọkwa ya na ndụ la eluigwe nahụgh ọnwụ anya. A hụrụ m na Mosis gabigara site n’ọnwụ, kama Maikel rịdatara wee nye ya ndụ tutu arụ ya nata ire-ure. Ekwensu kọọrọ arụ ahụ dịka nke ya, kama Maikel kpọtere Mosis site n’ọnwụ, ma kpọrọkwa ya laa n’eluigwe. Ekwensu nwara ijide arụ ya, wee kọchaakwa Chineke nke ukuu, ma gụa ya n’onye ikpe n’ezighị-ezi, n’inara ya ihe bụ nke ya. Kama Maikel abaghị mba ọbụla nye Ekwensu, ọ bụ ezie na ọ bụkwarị site n’ọnwụnwa na ike ya ka oru nke Chineke ahụ dàrà. Kraist ji obi dị ume-àlà nyefee ya n’aka Nna ya, n’asị, Onyeanwe-anyi baara gị mba.NUA 37.2

    Jisọs gwara ndị n’eso ụzọ ya na ọ dị ụfọdụ n’ime ndịa n’eguzo n’iru ya n’agaghị edetu ọnwụ ire rue mgbe ha g’ahụ àlà-eze Chineke ka ọ n’apụta ihè n’ike. N’ugwu nke nnwogha ahụ, nkwa nka mezuru. Ọdịdị iru nke Jisọs gbanwere, n’enwụkwa dịka iru anyanwụ. Uwe Ya n’enwụ ọcha n’egbukekwa egbuke. Mosis nọkwa n’ebe ahụ, inọchite-anya ndị niile a g’eme ka ha si n’ọnwụ bilie n’ọbịbịa-abụa nke Jisọs. Ma Elaija onye a kpọọrọ laa n’eluigwe nahụgh ọnwụ anya nọchitere anya ndị niile a g’enwogha baa n’anwụghị-anwụ n’ọbịbịa-abụa nke Kraist, nke n’ahụghị ọnwụ anya g’abu ndị akpọrọ na ndụ ha laa n’eluigwe. Ndị n’eso ụzọ ya legịdere anya n’egwù na iju-anya bụ ịdị-mma na ịdị ukuu nke Jisọs, ọbụna igwe ojii nke pkuchiri ha, ma nụkwa olu nke Chineke n’ime ebube nke ịdị ukuu Ya, ka ọ n’asi “Nka bụ Ọkpara m hụrụ n’anya nụrụ nu olu Ya.NUA 38.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents