Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 8—Ikpé Nke Ekpèrè Jisọs

    Ndị mụọ-ozi, ka ha rapụrụ eluigwe, n’obi dị ilu, kpupusia okpu-eze oma ha niile. Ha apụghị iyiri ha mgbe Onye-isi ha na ahuju-anya, n’ekpukwa okpu-ogwu. Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya nọkwa n’ọlụ n’ime ụlọ-ikpe ahụ ịla obi ndị madụ n’iyi. Nhụku ha merụrụ ọnọdụ ebe ahụ. Ndị isi nchụ-àjà na ndị okenye ka ha kpalikwara ikwụtọ na ịkparị Jisọs, n’ụzọ dịkasịrị njọ nke anụ-arụ n’apụghị inagịde. Ekwensu nwekwara olile-anya na ụdị mkparị ndịa na nhụju-anya nka g’edubara Ọkpara Chineke ime mkpesa m’ọbu ịtamu-ntamu; m’ọbukwa na Ọ g’egosiputa ike nke O ji bụrụ Chi, ma dọpụta onwe ya site n’aka igwe- madụ ahụ, sitekwa n’ụzọ dị otua mee ka atụmatụ nke nzọpụta ahụ daa.NUA 45.1

    Pita sogịdere Onye-nwe ya sitekwa na mgbe ahụ a raara Ya nye. O nwere ọnụnụ-ọku n’obi ihụ ihe a g’eme Jisọs. Ma mgbe e boro Ya ebubo ibu otu n’ime ndị n’eso ụzọ Ya, ọ gọnarịrị nka. Ọ n’atụ ụjọ ndụ ya, ọbụna mgbe e kwutara na ọbụ otu n’ime ha, o kọwara na ya a mataghị onye ọ bụ. Ndị n’eso ụzọ ya bụ ndị a màara nke-ọma site n’izi-ezi nke okwu-ọnụ ha, ma n’ụzọ iduhie ha na ime ka o wee ha anya na ya abụghị otu n’ime ndị n’eso ụzọ Karist, Pita gọnarịrị nke ugbo atọ site n’ikpọ iyi na ịdụ-isi. Ma Jisọs, onye nọkwa Pita nso, tụgharịrị anya iri-uju Ya ma lee ya n’ụzọ ịta ya ụta. Mgbe ahụ ka o chetara okwu Jisọs gwara ya n’ụlọ-elu, na nke ya onwe ya kwuwọkwara sị, asịkwa na madụ niile ga-àmà n’ọnya a pụghị ime ka mu-onwe m ma n’ọnya n’arụ Gị. O gọnarịrị Onyenwe ya ọbụna site nikpọ-iyi na idụ-isi. Kama anya ahụ nke Jisọs lere ya tiwara ya obi n’otu oge ahụ, ma zọpụtakwa ya. Ọ kwara akwa dị ilu ma cheghariakwa site n’oke nmehie a ma bụrụkwa onye a gbanwere na onye a kwadebere iji mee ka ụmụnna ya guzozie.NUA 46.1

    Igwe madụ ahụ nọkwa n’eme ùzù nke ukuu n’ọhichọ ighọ Jisọs ọbara. Ha piara Ya ihe arụrụ-àlà, werekwa nkịkara-akwa uhie uwe-nwụda onye-eze yikwasị ya n’ọnọdụ ikwa Ya emo, werekwa okpu-eze nke e jiri ogwu mee kpukwasi n’isi Ya dị nsọ. Ha werekwa nkpa-n’aka eze nkwam-emo tụkwasị ya n’aka, ma rudatakwa àlà ekele ikwa-emo n’asi Ya, ekele-o eze ndị Juu. Mge ahụ ka ha napụkwara Ya mkpa-naka ahụ ma werekwa ya kụa Ya n’isi, nke mere ka ogwu ndị ahụ kpọsfusie Ya isi na ọbara sọchiri n’iru ya na afụ-ọnụ YaNUA 46.2

    Ọnọdụ nka sịrị ike ndị mụọ-ozi ịnagịde. Ha pụrụ inapụta Jisọs site n’aka ha; kama onye isi ha gbochiri ha, n’asị na ọ bụ ụgwọ dị ukuu ka a ga akwụ n’isi madụ; na a ghaghị imezukwa ya, ọ bụ kwa ya ga akpata ọnwụ nke onye ahụ nwere ike nke ọnwụ. Jisọs matara na ndị mụọ-ozi n’ahụkwa ọnọdụ nweda n’àlà niile ndịa. A hụrụ m na ọbụna mụọ-ozi nke dịkasịrị àlà n’ike g’eme ka igwe madụ ahụ daa n’àlà, ma napụtakwa Jisọs. Ọ matara na ọbụrụ na Ọ chọrọ nka n’aka Nna ya, a ga ezipụtakwa ndị mụọ-ozi n’otu oge ahụ inapụta Ya. Kama ọ bụ ihe dị nkpa na Jisọs hụrụ ọtụtụ ahụhụ ndịa site n’aka madụ ndị n’emebi iwu, ka e wee mejupụta atụmatụ nke nzọpụta.NUA 47.1

    N’ebe ahụ ka Jisọs guzoro, n’obi dị ume-àlà na nnweda n’àlà n’iru igwe madụ ahụ obi tara-miri mgbe ha n’akpọ Ya iyi niile jọkasịrị njọ. Ha bụrụ Ya ọnụ miri n’iru — iru ahụ nke otu ụbọchị ha g’achọ izonarị onwe ha, nke g’enyekwa ihìe n’obodo nke Chineke, n’enwụkwa karị anyanwụ - kam’ọbụna anya-iwe ka Ọ n’eleghị ndị nmehie ahụ. Naanị site n’obi dị ume-àlà ka O weliri aka Ya hichasia ya. Ha jiri akwa ochie wee kpuchie iru Ya, ma kpuchiekwa anya ya abụa, ma tie ya aka-ntị, wee tikue ya sị, bue amụma gwa anyị onye tiri gị aka ahụ. Ndị mụọ-ozi nwetara ọgbaghara n’ime onwe ha. Ọ bụ nmasị ha ịbịa napụta ya n’otu ntabi anya ahụ; kama onye-ndu ha gbochiri ha.NUA 47.2

    Ndị na eso-ụzọ ya e nwetawo ri agbam-ume ibanye n’ebe Jisọs nọ, ilere otu e si ekpe ya ikpe. Ha tụrụ anya na Ọ g’egosipụta ike Ya dịka Chineke, ma zọpụta onwe Ya site n’aka ndị iro ya, ma taakwa ha ahụhụ n’ihi omume-ọjọọ ha n’emegịde Ya. Olileanya ha n’ebili n’adakwa site na ọnọdụ dị iche-iche nke ije ikpe ahụ. Mgbe ụfọdụ ha n’enwe obi-abụa, n’atụkwa egwu na ha bụ ndị e duhieworo. Kama olu ahụ nke ha nụworo na ugwu nke nnwoha ahụ, na ebube ahụ nke ha hụkwara, gbara ha ume na onye a bụ Ọkpara Chineke n’ezie. Ha chetara ọtụtụ ọnọdụ itu-n’anya dị iche-iche nke ha bụkwa ndị àmà ya, ọtụtụ ihe iribama dị iche-iche nke ha hụworo Jisọs mere n’ịgwo ndị ọria, imehe anya ndị-ìsì, ịgbahe ndị ntị-ike, ịchapụrụ ndị mụọ-ọjọọ anya na ịchụpụ ha, ime ka ndị nwụru-anwụ bilie na ndụ, ọbụna ibara oke-ifufe mba o wee ñaa Ya ntị. Ha e kwenyeghị na Ọ g’anwụ. Ha nwere olile-anya na ọ gerukwa mgbe Ọ g’amalite ike ya werekwa olu-ike chụsasịa ndị ogbu-ara-ọbara niile ahụ, dịka mgbe ahụ Ọ banyere n’ụlọ ukuu Chineke wee chụpụsịa ndị ahụ ji ụlọ Chineke mere ebe a nọ a zụ ahia; mgbe ha gbapụrụ n’iru Ya ka a gasị na ụsụụ ndị-agha n’achụ ha ọsọ. Ndị n’eso ụzọ ya nwere olile-anya na Jisọs g’egosipụta ike Ya ka madụ niile kwenye na Ọ bụ ya bụ eze Izrel.NUA 48.1

    Judas jupụtara n’obi-ilu na ihere n’ihi omume aghụghọ ya n’irara Jisọs nye. Ma mgbe ọ hụrụ mkparị niile e nyere Ya, o wutere ya nke ukuu. O hụrụ Jisọs n’anya kama ọ hụrụ ego n’anya karịa. Ọ bụghị n’obi na Jiso ga ekwe ka ndị ahụ o dutere jide ya. O chere na Jisọs g’eme ihe iribama ịnapụta onwe ya n’aka ha. Kama mgbe ọ hụrụ igwe madụ a kpasuru iwe n’ụlọ-ikpe, ndị n’achọ ighọ Ya ọbara, nmehie ya wutere ya nke ukuu, m’ọbụna mgbe ọtụtụ nọgịdere n’ebo Jisọs ebubo, Judas gbapụtara n’iru igwe madụ ahụ n’ekwupụta na ya e mehiewo n’irara Onye aka ya dị ọcha nye ha. O nyeghachi kwara ha ego ahụ ma rịọkwa ka ha rapụ Jisọs, n’ekwukwa na ọ dịghị ihe ọjọ ọbụla O mere. Iwe na ngbagwoju-anya jidere ndị nchụ-àjà nwoge na ka ha nọ n’ekwughị okwu ọbụla. Ha achọghị kwa ka ndị madụ mara na ha zụtara otu n’ime ndị n’eso ụzọ Ya ịrara ya nye n’aka ha. Na ha n’achụ Jisọs ijide ya n’ụzọ nzụzọ ka ha chọrọ ikpuchi. Kama nkwupụta nke Judas, na ọdịdị ya dịka alụghara madụ onye ikpe mara, mebọrọ ndị nchụ-àjà ahụ n’iru ọha madụ, n’egosipụtakwa na ọ bụ n’ihi ikpọ asị ka ha jiri dọkpụrụ Jisọs. Ka Judas ji oke iti-mkpu n’ekwupụta na aka Jisọs dị ọcha, ndị nchụ-àjà zara si, Gịni ka nka bu nye anyị? Gị onwe gị lekasịa nke ahụ. Ha e jidewo Jisọs n’ike ha, na nkpebi ime ya ihe masịrị ha. Judas, dịka o jupụtara n’iri-uju nke obi, wụsara ego ahụ a jụrụ-aju ugbua n’ụkwụ ndị ahụ zụworo ya ọlụ, na n’ime mgbafu obi na ụjọ banyere ihe arụ ahụ o mere, o wee ga kwugbue onwe ya.NUA 49.1

    Jisọs nwere ọtụtụ ndị n’eriri Ya ahuzi n’ime ọgbakọ ahụ, ma a zaghị ihe ọbụla nye ọtụtụ ajụjụ a jụrụ ya juru igwe madụ ahụ anya. Nye nkparị na nkwam-emo niile, ọdịghịkwa mgbarụ iru ọbụla m’ọbụ ngosi nke nmekpa-aru ọbụla n’iru Ya. O nwere ùgwù nweeka ụdị nke onye kwadoro onwe ya nke ọma. O nwere ọdịdị nke izu-oke niile na nke onye a n’asopụrụ asọpụrụ. Ndị gbakọrọ ebe ahụ lekwasịrị ya anya dị ebube. Ha tulere ọdịdị nke izu-oke ya, iguzosi-ike ya, na ùgwù nke o nwere, n’atụnyere nke ndị ahụ na anọdụ àlà n’ikpe megide ya, wee kwasara onwe ha na Onyea yikarịrị dịka onye-eze kwesịrị ka e nye ya àlà-eze karịa onye ọbụla n’ime ndịa n’achi-achi. O bụghị akara ọbụla nke onye n’eme mpụ. Anya ya doro-edo dịkwa nro, egedege iru Ya dị obosara dịkwa elu. Ọdịdị ya niile nwere ejiri-mara nke onye dị elu a maara ahà ya nwekwara ukpụrụ. Ndịdi ya na ogogogo-ntachi obi ya adịghị ka nke madụ ọbụla e kèrè-eké nke mere na ọtụtụ ndị tụrụ egwu. ọbụna Herọd na Pailet tụrụ egwu n’ịdị-ukuu ya na ọdịdị Chineke O nwere.NUA 50.1

    O doro Pailet anya sitekwa na nmalite na onyea abụghị madụ e ledara anya, kama na Ọ bụ onye zuru-oke na ndụ ya. O kwenyere na aka ya dị ọcha n’ụzọ niile. Ndị mụọ-ozi na agba àmà ọnọdụ ndịa niile letakwara obi nwute nke Pailet, ma hụkwa obi ahụzi na omiko o nwere n’ebe Jisọs nọ, ma n’izọpụta ya ka o ghara itinye aka na omume ọjọọ nke inye Jisọs ka a kpọgịde ya n’obe, e zigaara nwụnye ya otu mụọ-ozi ịkpanyere ya ụka site na nrọ na ọ bụkwa ỌkparaChineke ka Pailett n’aga itinye aka n’ikpe ya, na ọ bukwa onye aka ya dị ọcha n’ata ahụhụ. Nwanyịa mere ngwa-ngwa zigara Pailet ozi na ya e nwewo ọtụtụ mkpagbu na nrọ gbasara Jisọs ma dọọkwa ya aka n ntị ka ọ ghara inwe ihe ọbụla megide nwoke a dị nsọ. Onye bu ozi ahụ mekwara ngwa-ngwa lụkara n’etiti igwe-madụ ahụ wee gbarue ma nye Pailet ozi ahụ n’aka. Ka ọ gụrụ ya, ọ mara jijiji, iru ya gbanwekwara. N’otu oge ahụ o nwere nchekube na ya agaghị e tinyekwa aka n’okwua; na ọbụrụ na ha ga anara ọbara Jisọs aka ya a gaghị adi na ya, kama na ya ga agbali inapụta ya.NUA 51.1

    Mgbe Pailet nụrụ na Herọd nọ na Jerusalem obi tọrọ ya ụtọ, ma nwekwa olileanya inwere onwe ya pụa n’okwua n’enweghị nkwekorite na ya, na ya agaghị etinye aka n’ima Jisọs ikpe ọnwụ. O wee ziga ya, na ndị n’ebo ya ebubo ijekuru Herọd. Herọd nwere obi ike. Ogbugbu o gburu Jọn nyere ya ntụpọ n’ime-mụọ nke n’ọdịghị mgbe o nweere onwe ya site na nka, ma mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, na ọlụ ukuu niile ọ luworo, o chere na ọ bụ Jọn biliri n’ọnwụ. Ọ tụrụ ụjọ maakwa jijiji n’ihi na o nwere obi ọmụma-ikpe n’ime onwe ya. Pailet tinyere Jisọs n’aka Herọd. Herọd hụtara nka dịka ụzọ Pailet jiri nabata ikike, na oche-ikpe nke ya. Ha a bụwori ndị-iro ochie, ma ugbua ha n’abụ ndị enyi. Obi tọrọ Herọd ụtọ ihụ Jisọs, n’ihi na ọ tụrụ anya na ọ g’eme ụfọdụ ihe iribama ukuu g’eju ya afọ. kama Ọ bụghị ọlụ Jisọs imejupụta ọchịchọ obi ya. Ike nke Chineke o nwere n’ime ihe-iribama ka ọ g’eji zọpụta ndị ọzọ, ọbụghị n’ihi onwe ya. Jisọs a zaghị ihe ọbụla nye ajụjụ niile nke Herọd jụrụ ya; ọdịghịkwa ihe o nwere n’ebe ndị iro ya dị bụ ndị nọgịdesịrị-ike n’ibo ya ebubo. Oke iwe jupụtara Herọd obi n’ihi na Jisọs e gosịghị itu-egwu ọbụla n’ebe ike ya dị, ya mere na ya na ndị-agha ya sitere n’ime ya ihe-ọchị, na njakịrị, we meso Ọkpara nke Chineke. Herọd nwere ihe iju-anya nke ukuu n’ebe Jisọs nọ. ka ọ na ele ịdị ogo ya na ọdịdị Chineke o nwere, ọbụna mgbe a n’eme ya ihe ihere, o wee tụa-egwu ima ya ikpe ọnwụ, ma zighachikwa ya ọzọ n’ebe Pailet.NUA 51.2

    Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya n’anwakwa Pailet, n’agbalikwa iduba ya rue nbibi nke onwe ya. Ha tinyere n’uche ya na ọbụrụ na o tinyeghị aka n’ịma Jisọs ikpe-ọnwụ, ndị ọzọ g’eme ya; igwe madụ ahụ n’achọsi ọbara ya ike; ọbụrụkwa na o nyeghị Jisọs ka a kpọgịde ya n’obe, ọ g’etufu ike ya na ùgwù ya nke ụwà, na a g’akpọkwa ya onye kwenyere na onye-nmegịde ahụ, dịka ha kpọrọ ya. Pailet, site n’ụjọ nke itufu ikike ya na ọchịchị, kwenyere n’ọnwụ Jisọs. N’agbanyeghị na ọ tụkwasịrị ọbara Jisọs n’isi ndị n’ebo ya ebubo, nke ha nakweere, na etikwa mkpu si: ka ọbara ya dị n’isi anyị dịkwa n’isi ụmụ anyị, kama a gọpụghị Pailet, ọ bụkwa onye ikpe mara n’ihi ọbara Jisọs. N’ihi ọchịchọ nke onwe ya, na ihụnanya nke o nwere nye ùgwù sitere n’aka ndị a maara áhà ha n’ụwà, o nyere onye aka ya dị ọcha ka ọ nwụa. A sị na Pailet soro ezi akọ-n’uche ya, ọ dịghị mgbe ọ gaara etinye aka na ima Jisọs ikpe-ọnwụ.NUA 52.1

    Ikpe na ọmụma-ikpe ọnwụ nke Jisọs nọkwa ri na alụ ọlụ n’ime obi ọtụtụ madụ; n’enwekwa nhuku dị iche-iche nke ga apụta ihè mgbe nbilite n’ọnwụ ya gasịrị; ọtụtụ madụ kwa g’esokwa nzukọ ndị amamihe na nghọta ha malitere n’oge a n’ekpe Jisọs ikpe.NUA 53.1

    Ekwensu wekwara oke iwe mgbe o hụrụ na obi-ọjọọ ya nke oji dubara ndị-ìsì nchụ-àjà imegịde Jisọs adịghị mgbe ọ kpọpụtara ntamụ ọbụla site n’ọnụ ya. A hụrụ m na, ọ bụ ezie na Jisọs weere ọdịdị nke madụ, ike na nnagịde nke dị ka nke Chineke kwadoro ya, na o chipụghị ụkwụ site nọchịchọ nke Nna ya ọbụna n’ihe dịkasịrị nta.NUA 53.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents