Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 15—Ndị Juu Kpebiri Igbu Pọl

    NDị isi nchụ-àjà na ndị n’achi achi jupụtara n’ịkpọ-asi megide Pọl, ka ha hụrụ nhụku nke amamihe ya. Ha hụrụ na o ji anya-ike n’ekwusa Jisọs, n’emekwa ihe-iribama dị iche-iche n’aha ya, na ọtụtụ igwe madụ n’añakwa ya ntị, n’echegharikwa site na ndụ nke omen’àlà ha, ma n’elekwa ha anya dịka ndị ahụ gburu Jisọs Ọkpara Chineke. A kpasuru ha iwe, ha gbakọkwara itụpụta atụmatụ ihe kwesịrị ka e mee iji menyụa ọgbaghara ahụ. Ha kwekọritere na ụzọ kachasị udo ime nka bụ iwepụ ndụ Pọl. Ma Chineke matara ebum n’obi ha, O wee zipụ ndị mụọ-ozi ichegịde ya, ka o wee dị ndụ luzue ọlụ ya, ma takwa ahụhụ n’ihi áhà Jisọs.NUA 92.1

    E mere ka Pọl mara na ndị Juu na achọ ndụ ya. Ekwensu duru ndị Juu n’ekweghị-ekwe ichegịde ọnụ ụzọ-àmà niile nke Damaskos ehihe na abali, ka ọ g’abụ na mgbe Pọl n’agabiga ọnụ-ụzọ àmà ndị ahụ; ha ga egbukwa ya n’otu mgbe ahụ. Ma ndị n’eso ụzọ ya n’ime abali, tinyere ya n’ime ekete ma tụda ya site n’azụ-mgbịdị. N’ebea ihere mere ndị Juu n’ọdịda ha, ebum n’obi nke Ekwensu ka e merikwara. Ma Pọl jere na Jerusalem ijikọta onwe ya na ndị n’eso ụzọ Kraist; kama ụjọ dị ha n’ebe ọ nọ. Ha e kwenyeghịkwa na Ọ bụrụwo onye n’eso ụzọ Kraist. Ndụ ya ka ndị Juu chụworo na Damaskọs m’ọbụna ụmụnna nke aka ya a nabataghịkwa ya, kama Banabas kpọtaara ya ndị-ozi, ma kọpụtara ha otu o si hụ Onyenwe-anyị n’etiti ụzọ na o kwusawo kwa áhà Jisọs na Damaskọs.NUA 93.1

    Kama Ekwensu n’akpali ndị Juu ịla ndụ Pọl n’iyi, ma Jisọs dụrụ ya ọdụ ka ọ rapụ Jerusalem. Ma mgbe o jere obodo ndị ọzọ ikwusa áhà Jisọs , n’emekwa ihe-iribama dị iche-iche, ọtụtụ madụ chegharị-kwara, ma mgbe a gwọrọ otu nwoke bụ onye daworo ngwọrọ mgbe niile, ọtụtụ igwe madụ ndị n’efe arụsi pụtara ịchụrụ ndị n’eso ụzọ Kraist àjà. Pọl were iwe, ma gwakwa ha na ha onwe ha bụkwa madụ ibe ha, na ọ bụkwa naanị Chineke onye keworo eluigwe n’ụwà na oke osimiri, na ihe niile dị ya n’ime ka ha g’efe. Pọl buliri Chineke elu n’iru ha; kama ha e kwenyeghị ka o gbochie ha. Mgbe ahụ bụ nke mbu ha n’anụ banyere inwe okwukwe na ezi-Chineke nke okike, ọbụna ife Ya ofufe na nsọ nke ruru Ya, ka a n’etinye n’uche ha ma mgbe ha na aña Pọl ntị, Ekwensu na arụgịdekwa ndị Juu n’ekweghị-ekwe nọ nàlà ndị ọzọ isogbu Pọl na ilalu ọlụ-ọma niile a lụrụ site n’aka ya. Ndị Juu kpaliri ọgbaghara, ma mụnyekwa ọkụ n’echiche ndị ahụ n’ekpere arụsi site n’ịgba àmà -ụgha megide Pọl. Ugbua anya-ọma ahụ na obi-oma ndị madụ ghọrọ ikpọ asị, na ndị ahụ jikeworo ife ndị n’eso ụzọ Kraist ofufe nwa-oge nta gara-aga, tụrụ Pọl nkume, ma kpụrụ ya pụa n’azu obodo, n’eche na ọ nwụwo. Ma dịka ndị n’eso ụzọ Kraist n’eguzogịde Pọl, n’erikwa uju n’ihi ya, ha ñurịkwara ọñụ mgbe o biliri, ma sorọkwa ha banye n’ime obodo.NUA 93.2

    Ka Pọl n’ekwusa Jisọs, otu nwanyị nke nwere mụọ n’agba afa, wee soro ha, n’eti mkpu, ndị ikom ndịa bụ ndị-oru nke Chineke onye kachasị ihe niile elu, nke n’ezikwa anyị ụzọ nzọpụta. Otua ka o sogịdekwara ndị n’eso ụzọ ya ọtụtụ ụbọchị. Kama nka gburu Pọl mgbu n’obi; n’ihi na iti mkpu nke nwanyị a n’ewepụ akọ-n’uche ndị madụ site nezi-okwu ahụ. Ebu m n’obi Ekwensu na-iduru nwanyị a ime nka bụ itinye ida-mba n’obi ndị madụ, na ime ka ọlụ ndị-ozi ahụ ghara inwe nhụku ọbụla. Ma nka kpaliri mụọ nke Pọl, o wee tụgharịa n’ebe nwanyị ahụ nọ, wee sị mụọ ahụ n’adịghị ọcha, a na m enye gị iwu n’aha Jisọs Kraist ka ị si n’ime ya pụta, ma mụọ ahụ n’adịghị ọcha natara ịba-mba ahụ, wee rapụ ya.NUA 94.1

    O masịrị ndị nwe ya na o n’eti mkpu n’eso kwa ndị n’eso ụzọ Krasit n’azu; ma mgbe mụọ-ọjọọ ahụ rapụrụ ya, ka ha hụkwara ya dịka onye n’eso ụzọ Kraist nke dịkwa ume-àlà n’obi, ha were iwe nke ukuu. Ha a kpakọwori ọtụtụ ego site n’ịgba afa ya, ma ugbua olileanya nke uru ha n’erite a gabigawo. E meriwọkwa ebum n’obi Ekwensu; kama ndị oru ya jidere Pọl na Sailas, dọkpụrụ ha rue na ọgbọ-ahia, ruekwa n’iru ndị n’achi achi, na ndị ọk’ikpe, n’asị, ndị-ikom ndị Juu ndịa n’esogbukwa obodo anyị nke ukuu. Mgbe ahụ igwe madụ ahụ biliri megide ha, ndị ọk’ikpe dọwakwara uwe ha, wee nye iwu ka e tie ha ihe. Ma mgbe apiasịrị ha ọtụtụ ihe, ha tinyere ha n’ụlọ nkpọrọ, n’enyekwa onye-isi ụlọ nkpọrọ iwu, ka o chebe ha nke-ọma, onye ahụ, mgbe ọ natara iwu dị otua, o tinyere ha n’uso ụlọ nkpọrọ ma gbachiekwa ụkwụ ha abụa n’igodo. Ma ndị mụọ-ozi Chineke sokwara ha n’ime ụlọ-nkpọrọ ahụ. Nkpọrọ a tụrụ ha bụ n’otuto nke Chineke gosikwa ndị madụ na Chineke nọkwa n’ime ọlụ ahụ, n’anonyekwara ndị-oru ya Ọ rọputaworo, na mgbịdị ụlọ nkpọrọ pụrụ ima jijiji, na ọbụna okporo-igwe ha dị ike ka ya onwe ya pụrụ imeghe.NUA 95.1

    N’etiti abali Pọl na Sailas kpere ekpere bụakwa abụ-otuto nye Chineke, ma n’otu ntabi anya àlà-ọma jijiji dị ukuu mara, nke mere ka ntọàlà ụlọ nkpọrọ ahụ kwaa eneke; a hụkwara m na mụọ-ozi nke Chineke tọghepụrụ agbụ madụ nile n’out-oge ahụ. Onye nche ụlọ nkpọrọ biliri ma tụa-egwu nke ukuu mgbe o hụrụ na ọnụ-ụzọ niile nke ụlọ nkpọrọ ghere oghe. O chere na ndị nkpọrọ niile a gbapusiwori, nke bụ na a ghaghị ịta ya ahụhụ nke ọnwụ. Ma mgbe ọ chọro igbu onwe ya, Pọl tiri-mkpu n’oke-olu, sị, Emerukwala onwe gị arụ ọbụla, n’ihi na anyị niile nọ n’ebea. Ike nke Chineke bara n’obi onye nche ụlọ-nkpọrọ ahụ. O wee kpọọ-oku ka ewetara ya ọkụ, o wee gbaba n’ime, n’atụ egwu, o wee daa n’àlà n’iru Pọl na Sailas, wee kpọpụta ha, n’asi, ndị nwe m, gịnị ka m n’aghaghị ime ka e wee zọpụtam? Ha wee sị ya, kwere na Onyenwe-anyị Jisọs Kraist, a ga azọpụtakwa gị onwe gị na ezi-n’ụlọ gị. Onye-isi ụlọ-nkpọrọ ahụ wee kpọkọta ezi-n’ụlọ ya niile, Pọl we kwusara ha Jisọs. Obi onye-isi ụlọ-nkpọrọ ahụ ka e jikọtara na nke ụmụnna ndịa, o wee sachaa ọnya nke ihe e tiri ha, e wee meekwa ya, na ezi-n’ụlọ ya niile baptizim n’abalị ahụ. O wee weta ihe-oriri che n’iru ha, ma ñurikwa ọñụ, na ekwerekwa na Chineke ya na ezi-n’ụlọ ya niile.NUA 96.1

    Ozi a dị-ebube gbasara ebe niile bụ ike ọlụ-ebube nke Chineke nke pụtaworo ihè site n’imeghe ọnụ-ụzọ ụlọ-nkpọrọ niile ndịa, na ncheghari na baptizim nke onye-isi ụlọ-nkpọrọ na ezi n’ụlọ ya. Ndị n’achi achi nụrụ ihe ndịa, wee tụa-egwu, ma zigakwara onye-isi ụlọ-nkpọrọ ahụ ozi, ka o rapụ Pọl na Sailas ka ha laa. Kama Pọl jụrụ irapụ ụlọ-nkpọrọ ahụ n’ụzọ nzụzọ. O wee sị ha, ha tiri anyị ihe n’iru ọha madụ n’amaghị kwa anyị ikpe ọbụla, ebe anyị bụkwa ndị Rom, ha tinyekwara anyị n’ụlọ nkpọrọ; ma ugbua ha n’ezipụ anyị na nzuzo? N’ezie, a gaghị eme ya otua mọlị; kama ha onwe ha g’abịakwa, ma kpọpụta anyị. Pọl na Sailas achọghị ka ọlụ-ebube nke Chineke pụtara ihè otua bụrụ ihe e kpuchiri ekpuchi. Ndị ozi kọwara ihe ndịa nye ndị ok’ikpe ahụ; ha wee tụa egwu mgbe ha nụrụ na ha bụ ndị Rom. Ha wee bia riọ ha kpọpụtakwa ha, ma riọkwa ha ka ha si n’obodo ha pụa.NUA 97.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents