Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 30—OFufe Mụọ-ỌJọọ

    A hụrụ m nduhie nke ntakwu na ite-aka. Ekwensu nwere ike nke o ji e weta ọdịdị ndị ga apụta n’iru anyị dịka a si na ha bụ ndị ezi-n’ụlọ anyị na ndị enyi anyị ha ndị n’ararụ ụra-ọnwụ ugbua n’ime Jisọs.NUA 182.1

    Ọ g’eme dịka ha pụtara n’iru anyị, ụdị okwu ha kwuru mgbe ha dị ndụ, nke anyị makwaara nke ọma, ka a g’ekwu kwa, ọbụna ụda olu-okwu ha mgbe ha dị ndụ g’adakwa na ntị. Ihe ndịa niile bụ iji duhie ụwà, ma makwa ha n’ọnya n’ikwenye ụdị nduhie a.NUA 182.2

    A hụrụ m na ndị nsọ aghaghị inwe ezi nghọta zuru oke banyere ezi-okwu nke oge ugbua, nke ha g’anagịde site n’akwụkwọ-nsọ. Ha aghaghị ighọta ọnọdụ nke ndị nwụrụ-anwụ; n’ihi na mụọ nke Ekwensu g’abiakutekwa ha, n’ekwupụta na ha bụ ndị-enyi na ndị ezi-n’ụlọ ha, ndị g’ekwupụtara ha ụkpụrụ dị iche-iche n’esiteghị n’akwụkwọ nsọ. Ha g’eme ihe niile dị n’ike ha ikpali obi ahizi, ma meekwa ihe iribama n’iru ha, imejupụta ihe ha n’ekwu. Ndị nke Chineke aghaghị ịnọ na njikere iguzogịde mụọ ndịa site n’ezi-okwu nke akwụkwọ-nsọ na onye nwụrụ-anwụ a mataghị ihe ọbụla, na ndịa bụkwa ndị mụọ-ọjọọ nke Ekwensu.NUA 182.3

    A hụrụ m na anyị a ghaghị inyocha nto-àlà nke olileanya anyị, n’ihi na anyị g’enye nkọwapụta banyere ya site n’akwụkwọ-nsọ; n’ihi na anyị g’ahụ nduhie a ka ọ n’agbasa, ma anyị alụsọkwa ya ọgụ iru n’iru. Ma Ọ bụghị naanị ma anyị nọ na njikere n’ihi ya, a g’amata anyị n’ọnya ma meriekwa anyị. Kama Ọ bụru na anyị e mee ihe anyị pụrụ ime n’onwe anyị inọ na njikere n’ihi agha ahụ nke chere anyị n’iru, Chineke g’amekwa oke Ya, n’aka ya karịrị ike ka o g’echekwa anyị. Na ngwa-ngwa Ọ g’ezitekwa mụọ-ozi ọbụla site n’ebube igba-ogịge ndị niile kwesịrị ntụkwasi-obi, karịa na a g’eduhie ha ma dufuekwa ha site n’ọlụ-ebube ụgha niile nke Ekwensu.NUA 183.1

    A hụrụ m ka nduhie a si a gbasa ọsọsọ ebe niile. E gosịrị m ahịrị nke ugbọ-àlà nke n’agba oke ọsọ. Mụọ-ozi ahụ gwara m ka m lezie anya nke ọma. M wee tụkwasị anya m n’ugbo-àlà ahụ. Ọ dịka ụwà niile nọkwa n’ime ya. Mgbe ahụ o gosịrị m onye nduzi nke ụgbọ-àlà ahụ, onye ahụ dịkwa ka ezi nwa amadị new-àlà, onye ndị niile nọ n’ugbọ-àlà ahụ na elekwasị anya n’asopụrụkwa. O juru m anya nke ukuu, m wee jụa mụọ-ozi ahụ n’edu m sị: onye bụ onye ahụ? O wee sị, ọ bụ Ekwensu. Ọ bụ ya bụ onye nduzi nke ụgbọ-àlà ahụ na ọdịdị mụọ-ozi nke ihè. O jidewo ụwà niile n’orù. E nyefewo ha n’aka nduhie sịrị ike, ikwenyere ụgha, ka ha bụrụkwa ndị a jụrụ ajụ. Onye n’anọchite anya ya, nke n’esojekwa ya n’ịdị ukuu, bụ onye n’akwọ ụgbọ-àlà ahụ, ma ndị ọzọkwa n’anọchite anya ya ka o tinyere n’ọlụ na ọnọdụ dị iche-iche dịka o ji ha alụ ọlụ, ma ha niile na agbakwa oke ọsọ rue ila n’iyi. A juru m mụọ-ozi ahụ m’ọbụ na ọ dịghị onye fọdụrụ. O wee si m lee anya n’ofe ụzọ nke ọzọ, m wee hụ ọgbakọ nta ka ha na eme njem ha n’ụzọ kpachiri akpachi dịkwa warara. Ha niile dịkwa ka ndị e jikọrọ n’otu nke ọma, bụrụkwa ndị e kekọtara otu n’ezi-okwu ahụ.NUA 183.2

    Ọgbakọ nta nka dịka ndị magbọrọ amagbọ, dịka ha a gabigawo ọtụtụ ọnwụnwa na ọgụ sịrị ike. Ọ dikwara ha ka anwụ na a wapụtara ha site n’azụ igwe-ojii, nke n’achakwasikwa n’egedege iru ha, na emekwa ka ha bụrụ ndị n’emeri emeri, dịka a sị na nmeri ha a diwo nso.NUA 184.1

    A hụrụ m na Onyenwe-anyị e nyewo ri ụwà ohere ichọpụta ọnya nka. Otu ihe nka a buruwo ihe ngosi zuru oke nye onye nke Krasit a gasikwa na ọdịghị ihe ngosi ọzọ. Ọ dịghị ihe dị iche e meworo n’etiti ihe nsọ na ihe rụrụ-arụ.NUA 184.2

    Thomas Paine, onye anụ-arụ ya sụkọrọ n’aja ugbua, onye a g’akpọpụtakwa n’ọgwụgwụ nke puku afọ ahụ, na nbilite nọnwụ nke abụa ahụ, ịnara ụgwọ-ọlụ ya, na ịta ahụhụ nke ọnwụ nke ugbo abụa ahụ, bụ onye Ekwensu n’asị na ọ nọ n’eluigwe ugbua a, bụrụkwa onye e buliri-elu ebe ahụ. Ekwensu jiri ya lụa ọlụ n’elu ụwà n’oge niile o nwere ike, ma ugbua ọ n’agakwa n’iru n’otu ọlụ ahụ site n’ime dịka a sị na Thọmas Paine bụ onye e buliri-elu ma kwanyekwara ùgwù; ma dịka o ziri ihe n’ụwà, Ekwensu n’eme ka a sị na ọ n’ezikwa ihe n’eluigwe. Ma ụfọdụ ndị nọ n’ụwà ndị ibubo nwụru n’arụ mgbe ha legịdere ndụ ya na ọnwụ ya, na ozizi ya niile rụrụ-arụ mgbe ọ n’adị ndụ, n’ekwenyekwa ugbua ka o zie ha ihe bụ onye bụworo otu n’ime ndị rụkasịrị arụ jọkasikwara na njọ; onye lelikwara Chineke na iwu ya.NUA 185.1

    Onye ahụ nke bụ Nna nke ụgha niile, n’ekpu ụwà ìsì n’eduhiekwa ha site n’izipụ ndị mụọ-ozi ya ikwuchịtara ndị ozi, ma n’emekwa ka ọ dịka ha na emegịde ihe ha dere n’akwụkwọ mgbe ha nọ n’ụwà, nke Mụo-nsọ gwara ha. Ndị mụọ-ozi ụgha ndia na eme ka ndị ozi merụa ozizi nke aka ha ma kpọ ha ozizi e meluru-emelu. N’ime nka,ọ pụrụ itinye ndị nke Kraist, ndị nwere áhà n’adị ndụ, bụ ndị nwụrụ-anwụ, n’ụwà niile, n’ọnọdụ n’eweghị anya banyere okwu Chineke; n’ihi na nka megịdere ụzọ ya, bụrụkwa ihe pụrụ itụgharị ụkpụrụ ya niile. N’ihi nka ọ n’eme ka ha nwe obi-abụa megide akwụkwọ-nsọ dịka ihe sitere na Chineke, ma were onye a nekweghị ekwe dịka Thomas Paine chee n’iru, dịka a sị na e dubara ya n’eluigwe mgbe ọ nwụru, dịka ya na ndị-nsọ nke Kraist dị n’otu ugbua, bụ ndị ozi ahụ ọ kpọrọ asị n’elu ụwà, dịka ha na akuziri ụwà ihe.NUA 185.2

    Ekwensu n’enye onye ọbụla n’ime ndị mụọ-ozi ya òkè nke ya a g’alu. Ọ n’agwasi ha ike ka ha nwe aghụghọ, oka, na ùchì. Ọ n’adụ ụfọdụ n’ime ha ọdụ ka ha lụa ọlụ n’ọnọdụ nke ndị ozi Krasit, ma kwuchitekwara ha okwu, mgbe ndị ọzọ g’alụ ọlụ nke ndị n’ekweghị-ekwe na ndị nmebi-iwu ndị nwụrụ n’akọchakwa Chineke, ma ugbua n’adị ka ndị nwere ezi-okpukperechi. Ọ dịghkwa ihe dị iche e mere n’etiti ndị ozi dịkarị nsọ na ndị n’ekweghị ekwe jọkasịrị njọ. Ha niile ka e mere ịkuzi otu ihe ahụ. Ihe dị nkpa a bụghị onye Ekwensu n’eme ka o kwue okwu, ma ọ bụru na ebum n’obi ya g’emezu. Ọ nọdụrụ Thọmas Paine nso nke ọma n’elu-ụwà, ma nyerekwa ya aka nke ukuu, na ọ dịrị ya mfe ị mara mkpụrụ-okwu niile o kwuru, na aka ihe-ọdịde nke otu n’ime ndị jeere ya ozi n’ikwesi ntụkwasị-obi, ma mezuekwa ọchichọ ya niile nke ọma. Ekwensu gụpụtara ya ọtụtụ n’ime ihe odịde ya, ọ bụkwa ihe dịrị ya mfe igụpụta ihe ọbụla dị ya mma site n’ọnụ ndị mụọ-ozi ya ugbua meekwa ka a sị na o sitere n’aka Thoma Paine, bụ ezi onye ọlụ ya mgbe ọ dị ndụ. Ma nka bụ ọlụ Ekwensu n’ozuzu-oke ya. Ozizi ndịa niile nke dị ka ha sitere n’aka ndị ozi, na ndị nsọ, na ndị nmebi-iwu nwụworo-anwụ, n’abia site n’obi Ekwensu n’onwe ya.NUA 186.1

    Nka kwesịrị izu-oke n’iwezuga ihe inyoghị-inyoghị ọbụla n’obi ma chọpụta n’ime ihe niile ọchịchịri, na ihe omimi niile nke olu Ekwensu; na o nwetawo otu onye ọ hụrụ n’anya nke ọma, na onye kpọrọ Chineke asị nke-ukuu, na ndị ozi niile dị-nsọ, na ndị mụọ-ozi n’ebube; n’asikwa ụwà niile na ndị niile n’ekweghị-ekwe, n’aghanyeghị ụdị onye nmehie ị bụ; n’agbanyeghịkwa ma ikwenyere na Chineke m’obụ n’akwụkwọ-nsọ m’ọbụ na ị kwenyeghị; bie ndụ otu ọ masịri gị, eluigwe bụkwa ụlọ gị; n’ihi na madụ niile matara na ọbụrụ na Thọmas Paine nọ n’eluigwe, bụrụkwa onye e buliri-elu, ha a ghaghị ijerukwa ebe ahụ. Nka were anya nke ọma na madụ niile pụrụ ihụ ma ọ bụrụ na ha chọro. Ekwensu na eme ugba ihe ahụ nke ọ na achọ ị me sitekwa n’oge ọ dara, site n’aka ndị madụ dịka Thọmas Paine. Ọ bụ ya onwe ya, site n’ike ya na ọlụ ebube ụgha ya niile, na adọkapụ ntọ-àlà nke olileanya ndị nke Kraist, n’emenyụkwa ihè anyanwụ ha nke kwesịrị imụnyere ha n’ụzọ warara ahụ gara eluigwe. Ọ n’eme ka ụwà kwenye n’akwụkwọ-nsọ adịghị mm’ọbụla karị akwụkwọ akụkọ ọzọ, nke n’esiteghị na Mụo-nsọ, wee n’ewepụtakwa ihe ọzọ inọchi ọnọdụ ya; nke bụ, ngosị ọlụ dị iche-iche nke ndị mụọ!NUA 187.1

    Nka bụ usoro ọ tụpụtara nye naanị onwe ya, nke nọkwa n’okpuru ya onwe ya, na ọ pụrụ ime ka ụwà kwenye n’ihe ọbụla ọ chọrọ. Akwụkwọ nke kwesịrị ikpe ya na ndị n’eso ụzọ ya ikpe, ka o welara azụ n’ime itiri ebe ọ chọrọ ka ọ nọrọ. Onye-nzọpụta nke ụwà ka o mere ka ọ ghara ịkarị madụ ọzọ ọbụla; ma dịka ndị nche Rom ahụ chegịdere ili Jisọs, gbasara akụkọ-ụgha ahụ nke ndị-isi nchụ-àjà na ndị okenye tinyere n’ọnụ ha, otua ka ndị n’enweghị uche, na ndị e duhiere-eduhie n’eso ụzọ nke ihe nlụpụta niile nke mụọ-ọjọọ ndịa, g’ekwukwa, ma gbaliakwa igosi na ọ dịghị ihe ebube dị na ọmụmụ Onye-nzọpụta anyị, ma n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Ya; ha wee tighachikwa Jisọs n’akwụkwọ-nsọ, n’ime itiri a kpachiri-akpachi, ebe ha chọro ya, ma meekwa ka ndị ụwà lekwasị ha anya n’ọlụ ebube ụgha ha na ihe iribàmà ha dị iche-iche, bụ nke ha n’ekwu na ọ karịrị ọlụ niile nke Krist. N’ụzọ dị otua ụwà niile ka ejidere n’onya, ma rarakwa ya nye n’aka nchekwa; n’agaghị a chọpụta nduhie ọjọọ nka e duhiere ha, rue mgbe a wụsara ihe-otiti asaa ahụ. Ekwensu na achị-ọchị mgbe ọ n’ahụ nmezu nke atụmatụ ya niile, n’ahụkwa ụwà dum n’ime ọnya ya.NUA 188.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents