Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 33—Ajụọ-Omume Di Iche-iche Nke Babịlon

    Ahụrụ m ọnọdụ nke nzukọ dị iche-iche site na mgbe mụọ-ozi nke abụa kwusara ọdịda ha. Ha nọkwa n’aba ụba n’ọrụrụ ha; ma n’azakwa áhà ndị n’eso ụzọ Kraist. A pụghị ihụta ọdị-iche dị n’etiti ha na ndị-ụwà. Ndị ozi ha na ewere ngụpụta ha site n’okwu ahụ, kama n’ekwusa ihe ụtọ dị iche-iche. Obi nke n’achị onwe ya enweghị ihe ọbụla megide nka. Ọ bụ naanị mụọ na ike nke ezi-okwu ahụ, na nzọpụta nke Kraist, ka obi anụ-arụ kpọrọ asị. Ọ dịghị ihe ọbụla nke dị n’ozi ọha-n’eze na akpasu ọnụma nke Ekwensu, mee ka onye nmehie maa jijiji, m’ọbụ mekụrụ obi na akọ-n’uche banyere ihe ụjọ nke dị n’ikpe n’abia n’oge n’eteghị anya. Ndị ajụọ-omume n’enwe ihe ụtọ n’ihe ọbụla nke n’enweghị ọdịdị Chineke, ha g’anoyekwara ma kwadokwa okpukperechi dị otua. Mụọ-ozi ahụ wee sị, ọ dịghị ihe ọbụla dị nta karị ihe-agha niile nke ezi-omume pụrụ imeri, ma jidesiekwa nmeri ahụ ike megide ike niile nke ọchịchịrị. Ekwensu ejidewo nzukọ ndịa niile n’aka ya. Okwu-ọnụ na omume nke ụmụ madụ ka a n’elekwasi anya karị ezi-okwu niile pụtara ihè nke okwu Chineke. Mụọ-ozi ahụ wee si, enyi nke ụwà na mụọ ya dị n’iro n’ebe Chineke nọ. mgbe ezi-okwu na ịdị mfe ya na ike ya, dịka ọ dịkwa n’ime Jisọs, pụtara megide mụọ nke ụwà, ọ n’akpote mụọ nke mkpagbu n’otu oge ahụ. ọtụtụ, ọtụtụ madụ n’ezie, ndị sị na ha bụ ndị nke Krasit, a k’amataghị Chineke. Agwa nke obi anụ-arụ a kagbanweghị, n’echiche nke anụ-arụ n’adịgịde n’iro ya na Chineke. Ha bụ ndị ọlụ nke Ekwensu kwesịrị ntụkwasi obi, n’agbanyeghị na ha n’aza áhà ọzọ.NUA 200.1

    A hụrụ m na site na mgbe Jisọs rapụworo ebe nsọ nke eluigwe, ma banyekwa n’ime ihe mgbochi nke abụa, nzukọ niile ndị a ka a rapụkwara dịka a rapụrụ ndị Juu; ma ha n’ejupụtakwa site n’ajụọ nnụnụ ọbụla n’adịghị ọcha. A hụrụ m oke nmebi na ọrụrụ n’ime ụlọ nzukọ dị iche-iche; ma ha na ekwukwa na ha bụ ndị nke Kraist. Nkwupụta ha niile, ekpere ha na ọkpụkpọ-oku ha niile, bụ ihe arụ n’anya Chineke. Mụọ-ozi ahụ sịrị, Chineke a gaghị e sitụ imi n’ọgbakọ ha ọbụla. Onwe-onye, nghọgbu na nduhie ka ọlụ ha bụ n’agụghị omụma-ikpe nke obi. Ma n’elu ndụ ajụọ-omume ndịa niile ka ha na eyikwasị ọdịdị nke okpukperechi. E gosịrị m ngàngà nke nzukọ ndịa niile. Chineke adịghịkwa n’echiche obi ha; kama uche nke anụ-arụ ha n’adabere n’onwe ha. Ha n’achọ anụ-arụ ha mma, ma na elekwaskikwa onwe ha anya n’ojuju afọ na obi añụrị. Jisọs na ndị mụọ-ozi lekwasịrị ha anya n’iwe. Mụọ-ozi ahụ sịrị, nmehie ha niile na ngàngà ha erutewo eluigwe. E doziwọkwara ha oke nke ha. Ezi-okwu na ikpe ziri-ezi a dawo ri n’ụra ogologo mgbe, ma ọ g’etetakwa n’oge n’eteghị anya. Ibọ-ọbọ bụ nkem, m ga akwụghachikwa, ka Onyenwe-anyị kwuru. Iba mba ahụ dị oke egwu nke mụọ-ozi nke atọ kwesịrị ka e mezuo ya, ma ha g’añụkwa iko nke ọnụma Chineke. Igwe ndị mụọ-ọjọọ n’apụghị igụta ọnụ n’agbasa onwe ha n’àlà niile. Ha ejupụtawọkwa na nzukọ dị iche-iche na otu okpukperechi dị iche-iche. Ha n’elekwa ọlụ okpkperechi ndịa anya ọñụ nke nmeri ha; n’ihi na okpukperechi ka ha yikwasịrị n’elu oke nmekpu ha n’ajụọ-omume ha niile.NUA 201.1

    Eluigwe niile n’elekwasị anya n’oke iwe, madụ, ọlụ-aka Chineke ka e wedakasịrị àlà, ma dote n’ogo nke okike nzuzu nke sitere n’aka madụ ibe ya. Ma ndị sị na ha bụ ndị n’eso onye-nzọpụta ahụ obi-ebereị ya kpaliri mgbe ọ n’ele ọnọdụ ahụhụ nke madụ, jikwa obi ha tinye aka n’ụdi nmehie ukuu nka, n’agba oru na mkpụrụ-obi nke ụmụ madụ. Ndị mụọ-ozi edewo ha niile. E dere ya n’akwụkwọ. Anya miri nke ndị-oru nwoke na ndị-oru nwanyị, nke ndị Nna, na nke ndị nne na ụmụ, nwanne ndị nwoke na nwanne ndị nwanyị, ka a gbakọrọ n’otu n’eluigwe. Ihe mgbua, obi mgbu nke madụ, ka a na ebụgharị site n’otu ebe rue ebe ọzọ, ma n’azu, na n’erekwa. Chineke g’ejide iwe ya naanị nwoge ọzọ. Iwe ya n’ere ọkụ megide obodo nka, karịsia megide ọlụ okpukperechi ndịa kwenyere, ma inyekwa aka n’onwe ha n’udi izu ahia nka jọgburu onwe ya. Ụdị omume ọjọọ nka, ụdị nmegbu nka, ụdị nhuju-anya nka, ọtụtụ ndị sị na ha n’eso ụzọ nke Jisọs onye dị nwayọ n’obi, nke wedakwara onwe ya àlà n’obi, pụrụ ilegịde ọnọdụ nka anya dịka ọ gbasaghị ha. Ma ọtụtụ ha pụrụ inwe ojuju- afọ, na iji aka ha tụkwasị ihe mgbu ndịa n’enweghị ọnụ okwu, ma n’efekwa Chineke. Ọ bụ ikwa-emo dị nro, nke Ekwensu na añurikwa n’elu ya, n’atakwa Jisọs na ndị mụọ-ozi ya ụta n’ihi ekwesịghị ekwesị ndịa, ma n’ejikwa nñụrị-ọñụ nke nmeri ya n’asị, ndị dị otua bụ ndị n’eso ụzọ Kraist!NUA 202.1

    Ndịa sị na ha bụ ndị nke Kraist gụrụ akụkọ banyere ntaramahụhụ nke ndị-ozi e gburu egbu, nke gbara ha anya-miri. O juru ha anya na ụmụ madụ pụrụ inwe ụdị obi sịrị ike otua nke ha g’eji meso madụ ibe ha ụdị omume nka, mgbe ha onwe ha n’otu oge ahụ n’ejidekwa madụ ibe ha n’oru. Ma Ọ bụghị naanị nka. Ha n’egbochi nmekọrite niile nke ọnọdụ, ma n’akpagbukwa madụ ibe ha site n’ụbọchị rue n’ụbọchị. Ha pụrụ iti madụ ibe ha ihe otiti karịsịrị njọ site n’obi-ọjọọ n’ewepụghị aka, nke a pụrụ iji tụnyere ụdị mkpagbu obi-ọjọọ nke ndị Pop na ndị n’ekpere arụsị mesoro ndị n’eso ụzọ Kraist. Mụọ-ozi ahụ wee sị, ọ g’adi mfe nye ndịa na ekpere arụsị na ndị Pop niile n’ụbọchị ikpe nke Chineke karị ụdị madụ ndịa. Akwa niile na nhụju-anya niile nke ndị a n’akpagbu-akpagbu eruwo eluigwe, ma ndị mụọ-ozi n’eguzo n’iju-anya banyere obi-ike na nhuju-anya n’enweghị ọnụ okwu nke madụ dị n’oyiyi nke onye kere ya n’akpatara madụ ibe ya. Mụọ-ozi ahụ wee sị, áhà niile nke ndịa ka e dere n’ime ọbara, nke a kachirị ihe site n’ụtarị, ma gbajuekwa ya site n’anya miri nke ihe mgbu, na nhuju-anya. Iwe Chineke agaghịkwa akwụsị rue mgbe o mere ka àlà nke ihe ñụchapụ iko nke ọnụma ya, ruekwa mgbe ọ kwụghachiri Babilọn ụgwọ-ọlụ ya okpukpu abụa. Kwụghachị ya ọbụna dịka ọ kwụghachiri gị, okpukpu abụa nye okpukpu abụa ya dịka ọlụ ya niile sị dị: n’ime iko nke ọ gbajuworo, a g’agbajukwa ya okpukpu abụa.NUA 203.1

    A hụrụ m na onye n’agba oru g’aza ajụjụ nkpụrụ obi oru ya onye o jideworo n’amaghị ama ; ma nmehie niile nke oru ahụ ka a g’atụkwasị n’isi onye nwe ya. Chineke a pụghị ịkpọrọ oru ahụ la n’eluigwe, onye e doteworo n’amaghị ihe ọbụla na ọnọdụ ihe efu, n’amaghị ihe ọbụla banyere Chineke, m’ọbụ akwụkwọ-nsọ, nke n’atụ naanị ụjọ ụtarị onyenwe ya, n’enweghịkwa ọbụna ogo nke anụmanụ Nna ya uku. Kama ọ g’emere ya ihe kacha mma nke Chineke onye obi-ebere pụrụ ime. Ọ n’emekwa ka ọ dị mgbe ọ dịka asị na ọdịghị; mgbe onye nwe ya g’ata ahụhụ ihe otiti asaa nke ikpeazu ahụ, ma biliekwa na nbilite n’ọwu nke abụa ahụ, ma taakwa ahụhụ ọnwụ nke abụa jọkarịrị njọ. Mgbe ahụ ka iwe nke Chineke g’adajụ.NUA 204.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents