Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 36—Oge Nke Nsogbu Jekob

    Ahụrụ m ndị-nsọ ka ha n’arapụ obodo uku na obodo nta dị iche-iche, n’enwe nnọkọta na ọgbakọ dị iche-iche, ma n’ebikwa n’ebe zoro-ezo dị iche-iche. Ndị mụọ-ozi nyere ha nri na miri, kama ndị ajụọ-omume n’ata ahụhụ agụọ na akpịrị ikpọ-nkụ. Mgbe ahụ ahụrụ m ndị-ndu nke elu ụwà ka ha n’enwe nzukọ n’ime onwe ha, Ekwensu na ndị mụọ-ozi ya nọkwa n’ọlụ gburu-gburu ha. A hụrụ m ihe odide, na akwụkwọ ka a gbasara ya n’elu-àlà niile, n’enye iwu sị, na ọ bụ naanị ma ndị nsọ rapụrụ okwukwe ha pụrụ iche, rapụkwa ụbọchị-izuike, ma debe ụbọchị mbụ n’izu, ka ha ga enwere onwe ha, n’ogwụgwụ oge dị otua, ka a g’egbu ha. Ma n’oge nka ndị nsọ ahụ nọdụrụ nwayọọ guzozie kwa eguzozie n’uche, n’atụkwasịkwa obi na Chineke, ma daberekwa na nkwa ya, na a g’emere ha ụzọ mgbapụ. N’ụfọdụ ebe dị iche-iche, tutu oge e dere n’akwụkwọ g’eru imezu ya, ndị ajụọ-omume mere ngwa-ngwa ịdakwasị ndị nsọ igbu ha; ma ndị mụọ-ozi n’udị madụ ndị agha n’alụtara ha ọgụ. Ekwensu chọrọ inwe ohere ịla ndị nsọ nke Onye kachasi ihe niile elu n’iyi; kama Jisọs gwara ndị mụọ-ozi ya chee ha nche, n’ihi na Chineke g’anara nsọpụrụ n’inwe ọgbụgba ndụ ya na ndị debere iwu ya n’iru ndị na ekpere arụsị gbara ha gburu-gburu; ma Jisọs ga anarakwa nsọpụrụ n’ebe ndị ahụ kwesịrị ntụkwasi-obi nọ, ndị nọkwa na nche, ndị n’eleworị anya ya ọtụtụ oge, ikpọrọ ha na ndụ, n’ahụghị ọnwụ anya. NUA 213.1

    Na nso nso, A hụrụ m ndị-nsọ ka ha n’enwe oke ihe mgbu nke ime-mụọ. Ọ dị ka ndị ajụọ-omume niile bi n’ụwà gbara ha gburu-gburu. Ihe ọbụla a na ahụ anya n’emegịde ha. Ụfọdụ malitere itụ ụjọ na Chineke arapụwo ha n’ikpeazu ịla n’iyi n’aka ndị ajụọ-omume. Ma a sị na anya ha abụa pụrụ imehe, ha k’ahụwori onwe ha ka ndị mụọ-ozi nke Chineke gbara ha gburu-gburu. Ọzọ igwe ndị ajụọ-omume jupụtara n’iwe biara, ozọkwa igwe ndị mụọ-ọjọọ, na agba ndị nmehie ọhụhụ ka ha malite igbusi ndị-nsọ ahụ. Ma ka ha ga anwa irute ha nso, ha g’ebu ụzọ gafee ụsụụ ndị mụọ-ozi ukuu ndịa dị nsọ, bụ ihe n’ekweghị-omume. Ndị mụọ-ozi nke Chineke na eme ka ha laghachi azụ, ma n’emekwa ka ndị mụọ-ọjọọ ndịa n’arụgịde ha gburu-gburu, dalaa azụ. Ọ bụ oge-awa dị oke egwu, na ihe mgbu nke obi nye ndị nsọ niile. Ha kwara-kwa ehihie na abali nye Chineke n’ihi nnapụta. N’ihe a n’ahụ anya, Ọ bụghị ihe pụrụ omume na ha g’enwe ngbapu. Ndị ajụọ-omume amalitewori nmeri ha, n’etikwa mkpu sị, gịnị mere Chineke unu adịghị anapụta unu pụa n’aka anyị? Gịni mere unu arịgoghị elu, wee zọpụta ndụ onwe unu? Ndị-nsọ añaghịkwa ha ntị. Ha n’agbaso Chineke ngba dịka Jekob. Ndị mụọ-ozi chọrọ inapụta ha; kama ha aghaghị ichere nwoge ọzọ, ma ñụakwa iko, ma narakwa baptizim ahụ. Ndị mụọ-ozi, dịka ha kwesịrị ntụkwasị-obi n’ọlụ ha, nọgịdekwara na nche ha. Oge ahụ fọdụrụ nta ibiaru mgbe Chineke g’egosipụta ike ukuu ya, ma napụtakwa ha n’ebube. Chineke agaghị ekwe ka áhà ya bụrụ ihe ịta-ụta n’etiti ndị n’ekpere arụsị. N’ihi otuto nke áhà Ya ọ g’anapụta onye ọbụla n’ime ndị ji ntachị-obi chere Ya, na ndị e dere áhà ha n’akwụkwọ.NUA 214.1

    A tụụrụ m aka laghachi azu n’ebe Noa onye kwesịrị ntụkwasi-obi nọ. Miri zoro, uju miri biakwara. Noa na ezi-n’ụlọ ya abanyewori n’ugbọ ahụ, ma Chineke gbachigịdere ha ụzọ n’ime. Noa a dowori ndị bi n’elu ụwà ochie ahụ aka na ntị nikwesi ntụkwasi-obi, mgbe ha kwara ya emo ma meekwa ya ihe-ọchị. Ma dịka uju-miri ahụ dara n’elu ụwà, na dịka ha na’ñụgbusi na miri n’otu n’otu, ha hụrụ ụgbọ ahụ nke ha jiworo tie egwuri-egwu, ka ọ n’arị n’elu miri ahụ n’udo, n’echekwa Noa na ezi-n’ụlọ ya nke ọma. Otua ka m hụrụ na ndị nke Chineke, ndị dọworo ụwà aka na ntị banyere iwe ya nke n’abia, g’abụkwa ndị a napụtara. Ha ejiriwo ikwesi ntụkwasi-obi dọọ ndị bi n’ụwà aka na ntị, ma Chineke agaghị ekwe ka ndị ajụọ-omume bibie ndị ahụ n’ele anya ka a kpọrọ ha la n’eluigwe na ndụ, bụ ndị n’adịghị erudatara iwu nke nwa anụ-ọhia ahụ, m’ọbụ nara akàrà ya. A hụrụ m na ọbụrụ na e kwere ka ndị ajụọ-omume laa ndị-nsọ n’iyi, Ekwensu na ndị mụọ ọjọọ ya niile, na ndị kpọrọ Chineke asị, g’enwe obi-añuri. Ma leenụ, ka ụdị oge nke nmeri a g’abụ nye ịdị ukuu nke Ekwensu, inwe ike, n’oge ikpeazu nke nmechi ndọndọ a, megide ndị niile na echerewo ogologo-oge ihụ ya bụ onye ha hụrụ n’anya. Ndị niile kwara-emo n’echiche nke ndị-nsọ ịla eluigwe, ga ahụ nnọyere nke Chineke nye ndị ya, na nnapụta ha dị ebube.NUA 216.1

    Ka ndị nsọ rapụrụ obodo uku na ime-obodo dị iche-iche, ndị ajụọ-omume chụsokwara ha. Ha weliri mma agha ha igbu ndị-nsọ ndịa, kama nma agha ha gbajisịrị, ma dasia dịka okporo-ahihia. Ndị mụọ-ozi nke Chineke kpuchitere ndị nsọ niile. Ka ha kwara-akwa ehihe na abalị n’ihi nnapụta, akwa ha biarutere elu n’iru Chineke.NUA 217.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents