Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Ndọndọ Ukuu Ahụ - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isi Nke 4—Ọbibia Mbụ Nke Kraist

    Mgbe ahụ e kuuru m biarue oge ahụ mgbe Jisọs g’ eyikwasị onwe Ya ọdịdị nke madụ iweda onwe Ya àlà dịka madụ, na ihụ ahụhụ nke ọnwụnwa Ekwensu.NUA 21.1

    Ọmụmụ Ya abụghị nke onye a maara áhà ya. A mụrụ Ya n’ụlọ anụmanụ, were kwa nri atụrụ meere Ya ihe ndịna; ma otu ọdi, ọmụmụ Ya ka e nyere ùgwù karị nke madụ ọbụla. Ndị mụọ-ozi sitere n’eluigwe gwa ndị ọzụzụ atụrụ banyere ọbibia nke Jisọs, mgbe ihè na ebube nke sitere n’ebe Chineke nọ soro ọgbụgba àmà ha. Ụsụụ nile nke eluigwe kpatụrụ aka n’ụbọ akwara ha wee nye Chineke otuto. Ha ji iti nkpu ọñụ nmeri zie ozi ọbibia nke Ọkpara Chineke n’ime ụwà dara-ada iluzu ọlụ nke mgbapụta, ka O sitekwa n’ọnwụ Ya weta udo, obi-ụtọ, na ndụ eigh-ebi nye madụ. Chineke nyere ùgwù n’ọbibia nke Ọkpara Ya. Ndị mụọ-ozi fekwara Ya ofufe.NUA 21.2

    Ndị mụọ-ozi nke Chineke rụgharịrị gburu-gburu ebe e mere Ya baptizim, Mụo-nsọ ridakwara n’oyiyi nke nduru, ma nọkwasịkwa n’elu isi Ya, ọbụna mgbe ndị madụ guzo n’ihe itụnanya dị ukuu, n’elegịde Ya anya ha, olu nke Nna Ya ka a nụrụ site n’eluigwe, n’asi, Gị onwe Gị bụ Ọkpara m hụrụ n’anya, ihe Gị dị m ezi mma.NUA 22.1

    O weghị Jọn anya nke ọma na ọ bụ onye-nzọpụta ahụ biara ka o mee ya baptizim n’osimiri Jọdan. Ma Chineke e kwewo ya ri nkwa ihe iribama nke ọ g’esite na ya mara Nwatụrụ nke Chineke ahụ. Ihe iribamà ahụ ka e nyere mgbe nduru nke eluiwe nọkwasịrị n’isi Jisọs, na ebube nke Chinneke nwukwara gburu-gburu Ya. Jọn setịrị aka ya n’atụ Jisọs, werekwa oke-olu tie nkpu si, Lee Nwatụrụ nke Chineke onye n’ebupụ nmehie nke ụwà.NUA 22.2

    Jọn gwara ndị n’eso ụzọ ya na Jisọs bụ Mesaia ahụ e kwere na nkwa, Onye-nzọpụta nke ụwà. Ka ọlụ ya n’emechi, o ziri ndị n’eso ụzọ ya ilekwasi Jisọs anya, na iso Ya dịka onye-ozizi ukuu ahụ. Ndụ nke Jọn bụụrụ nke n’enweghị ihe ụtọ. Ọ bụ ndụ nke iri-uju na ijụ onwe onye. O kwupụtara ọbibia mbụ nke Kraist, ma e nyeghị ya ohere ihụ ihe iribama Ya dị iche-iche, ma rie uru ike Ya o gosịrị. Ọ matara na mgbe Jisọs g’ewusi onwe Ya ike dịka Onye-ozizi, na ya a haghị ịnwụ. Olu ya ka a n’adịghịkwa a nụ mgbe niile, kama naanị n’ime ọzara. Ndụ ya bụkwa ndụ naanị nke otu onye. Ọ dịghị a rapara n’arụ ezi-n’ụlọ Nna ya, iri uru nke ọgbakọ ha, kama ọ rapụrụ ha ka o wee mejupụta ozi ya. Ọtụtụ madụ rapụrụ obodo ukuu ha n’ekwo ekwo na obodo nta ha ndị ọzọ, ma gbakọta n’ọzara ịnụrụ okwu site n’ọnụ onye-amụma ọpụrụ-ichea, dị ebube. Jọn tinyere anyụ-ike na mkpọrọgwu-osisi. O kwuru megide nmehie n’atụghị ụjọ ihe nlụpụta ọbula, ma dozie kwa okpọrọ ụzọ nye Nwatụrụ nke Chineke.NUA 22.3

    O metụtra Herọd ka ọ n’anụ okwu ndịa n’adasi ike, na ntuzi-aka na àmà niile nke Jọn. Na nmasị dị-omimi ọ jụrụ ihe ya g’eme we bụrụ onye n’eso ụzọ ya. E mewọkwa ka Jọn mara na ọ n’achọ ikpọrọ nwụnye nwanne ya nwoke ka ọ lụa, ọbụna mgbe dị ya n’adị ndụ, o wee gwa Herọd ezi-okwu na ime nka ezighị-ezi n’iwu. Ma Herọd e kweghị ichụ àjà ọbụla. O wee lụa nwụnye nwanne ya, ma, site na nrụgịde nke nwanyị ahụ, o jidekwara Jọn tinye ya n’ụlọ nkpọrọ. Kama Herọd bukwaara n’obi itọpụ ya ọzọ. Ma mgbe ọ nọ na mkpọrọ, Jọn nụrụ site n’ọnụ ndị n’eso ụzọ ya banyere ọlụ ukuu dị iche-iche nke Jisọs. Ma o nweghị ohere ịnụrụ okwu amara Ya. Kama ndị n’eso ụzọ ya gwara ya, ma kasiekwa ya obi site n’ihe ha nụrụ. N’oge n’eteghị anya, e bipụrụ Jọn isi sitekwa na nrụgịde nke nwụnye Herọd. A hụrụ m na ọbụna onye dịkasịrị nta na ndị n’eso ụzọ Jisọs, nke hụzuru ihe iribama Ya niile, ma nụkwa okwu nkasi-obi niile si n’ọnụ Ya pụta, bụkwaara onye dị ukuu karị Jọn Baptist. Nke bụ na, ha bụ ndị ebulikasịrị elu ma nyekwa ùgwù, ma nwekwa ihe ụtọ n’ime ndụ ha karị.NUA 23.1

    Jọn biara n’ime-mụọ na ike nke Elaija, ikwusa ọbibia mbụ nke Jisọs. A tụrụ aka zi m ọbụna rue oge ikpeazụ, ma hụ na Jọn g’abụ onye nnọchite anya ndị g’aga n’iru n’ime-mụọ na ike nke Elaija, ikwusa ụbọchị nke iwe, na ọbịbịa nke ugbo-abụa nke Jisọs.NUA 24.1

    Mgbe e mesịrị Jisọs baptizim na osimiri Jọdan e duuru ya jee n’ime ọzara site n’ike nke Mụo-nsọ ka Ekwensu wee nwa ya ọnwụnwa. Mụo-nsọ e doziwo ya n’ihi ọnọdụa pụrụ iche nke ọnwụnwa dị oke egwu. Ọgụ ụbọchị abụa ka Ekwensu nwara ya, ma n’ime ụbọchị ndịa o righịkwa ihe ọbụla. Ihe niile gbara Jisọs gburu-gburu bụ naanị ihe ọjọọ, nke pụrụ ime ka ndụ madụ tálátá. Ọ nọ n’etiti anụ-ọhia ọjọọ dị iche-iche, na Ekwensu, n’ebe tọgbọrọ n’efu, n’òwù. A hụrụ m na Ọkpara nke Chineke tụgharịrị akpọ Ya ma taakwa arụ site n’ibu ọnụ na nhụju-anya. Kama ọnọdụ Ya nka ka e buworo ụzọ mapụta na Ọ ghaghịkwa iluzu ọlụ nke Ọ bịara ịlụ.NUA 24.2

    Ekwensu weere ohere ahụ nke ọnọdụ nhụju-anya nke Ọkpara Chineke, ma jikere ịdakwasị ya site n’ọtụtụ ọnwụnwa dị iche-iche, n’olile-anya na ọ g’emeri ya, n’ihi na O wedawo onwe ya àlà dịka madụ. Ekwensu ji ọnwụnwa nka bia. “ọbụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, nye iwu ka nkume nka ghọọ ogbe achịcha. Ọ nwara Jisọs ka O rudatara ya, ma gosi ya ejiri-mara na Ya bụ Mesai ahụ site n’igosi ike nke O ji bụrụ Chi. Ma Jisọs jiri nwayọ zaa ya si, E dewo ya n’akwụkwọ-nsọ si, Ọ bụghị naanị achịcha ka madụ g’eji dị ndụ, kama site n’okwu nile nke Chineke.NUA 24.3

    Ekwensu nọ n’achọ ka ya na Jisọs malite isi-agụgọ banyere ibụ Ọkpara Chineke Ọ bụ. Ọ rụtụrụ aka n’ike ọgwụgwụ Ya, na ọnọdụ nhụju-anya Ya, ma werekwa ilu-ọnụ kwusie ike na ya dị ike karịa Jisọs. Kama okwu ahụ nke ekwuru site n’eluigwe, Gị onwe gị bụ Ọkparam m hụrụ n’anya, ihe Gị dịkwa m ezi-mma, zuru oke ịgba Jisọs ume n’ime nhụju-anya Ya niile. A hụrụ m na n’ije-ozi Ya niile, O nweghị ihe ọbụla o ji edo Ekwensu anya banere ike Ya, na ịbụ onye-nzọpụta nke ụwà, Ekwensu nwere ihe nlere anya zuru oke banyere ọnọdụ Ya dị elu na ikike Ya. O bụ achọghị irudatara ikike nke Jisọs, chụpụrụ ya n’eluigwe.NUA 25.1

    Ekwensu, igosipụta ike ya, kuuru Jisọs rue Jeruslem, wee dute ya n’elu ụlọ ukuu Chineke, ma nwaakwa ya ọzọ, na ọbụrụ na ọ bụ Ọkpara Chineke ka o gosi ya site n’itụda onwe-ya n’àlà site n’elu ebe o dotere Ya. Ekwensu jikwa okwu-amụma nke Chineke bia. ‘N’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ si, Ọ g’enye ndị mụọ-ozi Ya iwu banyere gị, Ọ bụkwa n’ọbaka ha ka ha g’ebuli gị, ka ị ghara ikpọbi ụkwụ gị na nkume oge ọbụla. Jisọs wee zaghachi ya sị, e kwuwo ya si gị a nwàlà Onyenwe-anyị bụ Chineke gị ọnwụnwa. Ekwensu chọworo ime ka Jisọs were oche amara nke Nna ya n’ihe nganga, wee tinye ndụ ya n’ihe ọghọm tutu a luzue ọlụ ije ozi Ya. O nwewori olileanya na atụmatụ nke nzọpụta ahụ ga-ádà; kama a hụrụ m na a tụrụ atụmatụ ahụ n’ụzọ dị-omimi nke ukuu karị ihe Ekwensu g’eji otua kwatue, m’ọbụ metọọ.NUA 25.2

    Ahụru m na Kraist bụ onye nlere nya nke ndị niile n’eso ụzọ Ya mgbe a n’anwa ha, m’ọbụghị otua oke ha g’abụ ihe ndọndọ. Ha kwesịrị iji ntachi-obi nagịde ya. ha e kwesighị iche na ọ bụ oke ha ikpọku Chineke ka O gosipụta ike Ya, ka ha nweta nmeri ebe ndị iro ha nọ, karị kwa ma ọ dị ezi nchekube pụrụ iche a hụzuru anya, nke bụ naanị na ùgwù Chineke a g’esitekwa na ya nye Ya otuto. A hụrụ m na ọbụrụ na Jisọs tụdara onwe ya site n’elu ụlọ ahụ ọdịghị mgbe nke ahụ pụrụ inye Nna ya otụtọ n’ihi na ọdịghị onye ọzọ g’ahụ omume dị otua karị kwa Ekwensu, na ndị mụọ-ozi nke Chineke. Nke a g’abụkwa naanị ịnwa Onyenwe-anyị ka O gosi ike Ya nye onye iro Ya jọgburu onwe ya. Nka pụtakwara irudatara onye Jisọs biara imeri.NUA 26.1

    “O wee duru Ya rigo, igosi Ya ala-eze niile nke elu-ụwà dum madụ bi na mkpirimkpi oge. Ekwensu wee si Ya, ike ndịa nile ka m g’enye gị na ebube ha niile kwa; n’ihi na a rarawo ya nye n’aka m, onye ọbụla m chọkwara inye ya ka m g’enye ya. Ya mere, ọbụrụ na gị onwe gị g’akpo isi-àlà nye m, ihea niile g’abụ nke gị. Jisọs wee za si ya, gaa m n’azụ, Ekwensu, n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ-nsọ si, Onyenwe-anyị Chineke gị ka i g’akpọ isi-àlà nye. Ọ bụkwa naanị ya ka ị g’efe.”NUA 27.1

    Nebea, Ekwensu gosịrị Jisọs àlà-eze niile nke ụwà. E zipụtara ha n’ụzọ dịkasịrị mma n’anya. O kwere inye ha Jisọs ọbụrụ na Ọ g’efe ya offufe ebe ahụ. Ọ gwara Jisọs na ọ g’arapụrụ ya nketa ụwà nile. Ekwensu matara na ike ya a ghaghị inwe oke, ma bụrụkwa ihe a napụrụ n’ikpeazụ, m’ọbụrụ na e mezuru atụmatụ nzọpụta. Ọ matara na ọbụrụ na Jisọs g’anwụ ịgbapụta madụ, ike ya g’agwụ mgbe ntakịrị oge gasịrị, na a g’ebibikwa ya. n’ihi nka ọ haziri atụmatụ ya igbochi, ọbụrụ na o g’ekwe mee, nmezu nke ọlụ ukuu ahụ nke malitere site na Ọkpara Chineke. Ọbụrụ na atụmatụ nke mgbapụta madụ g’ada, ọ g’ejidesikwa àlà-eze ahụ ike bụ nke ahụ ọ kọọrọ. Ma ọbụrụkwa na ọ g’emeri na nka, ọ kwara onwe ya emo na ya g’achị ọchịchị imegịde Chineke nke eluigwe.NUA 27.2

    Ekwensu, ñụrịrị ọñụ mgbe Jisọs rapụrụ eluigwe, ma rapụkwa ike na ebube Ya ebe ahụ. O chere na Ọkpara Chineke ka e dotere n’okpuru ike nke ya. Ọnwụnwa ya dịrị mfe ebe madụ abụa ahụ dị nsọ nọ n’Iden, na o chere na ya pụrụ iji aghụghọ Ekwensu ya na ike ya kwatue ọbụna Ọkpara Chineke, ma site n’ụzọ dị otua zọpụta ndụ nke ya na àlà-eze ya. Ọbụrụ na ọ pụrụ inwata Jisọs ka Ọ rapụ ọchịchọ Nna ya, mgbe ahụ ọ g’enweta ihe ọ n’achọ. Jisọs gwara Ewensu ka ọ ga ya n’azụ. Ọ bụ naanị Nna ya ka Ọ g’erudatara isi. Oge g’abia mgbe Jisọs g’eji ndụ Ya gbapụta ihe niile dị n’aka Ekwensu ma, mgbe nwa-oge nta gasịrị, ọbụna ihe niile dị n’eliugwe na n’elu-ụwà g’edo onwe ha n’okpuru Ya. Ekwensu kọọrọ àlà-eze niile nke elu-ụwà dịka nke ya, wee rọsara Jisọs ụka na Ọ pụrụ irapụ nhụju-anya ya nille ndịa. Ọbụna inweta àlà-eze nile nke ụwà ekwesịghị ime ka Ọ nwụa. Kama naanị ikpọ isi-àlà nye ya g’eme ka o nweta ihe niile nke ụwà na ebube nke ịchị ha ọchịchị. Ma Jisọs nọgịdesịrị ike. O wee họrọ ndụ ya nke ahụhụ, nke ọnwụ arụ-ụfụ, na, ọbụna n’ụzọ nke Nna ya ropụtara, ibụrụ onye iwu kwadoro nketa nke àlà-eze nile nke ụwà, ma were ha nye n’aka Ya dịka ihe o nwere mgbe niile ebighị-ebi. Ekwensu kwa ka a g’enye n’aka Ya ibibi site n’ọnwụ, n’adịghị mgbe ọzọ ọ g’akpasu Jisọs iwe, m’ọbụ ndị nsọ nke ebube.NUA 27.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents