Go to full page →

Ihe Nādọrọ Uche Onye Hụrụ Ihe Ụtọ N’anya OdU 43

Nye ndị nke nāchọ ihe nke aka ha, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya, ndị akpịrị, ofufe mụo-ọjọ nēji ihe dị mfe a ghọgbụ ha. Ọbụna n’ujụ nke ọdịdị ihe obụla, ha nāhụ ụdị ihe nāgụ ha agụ. Ekwensu nēleta ụdị nmehie nke onye ọbụla nādabakarị nime ya ma hụkwa na ohere a gaghị akọ onye ahụ imejụputa ọchịchọ ahụ. Ọ nānwa umụ-madụ site na ndụ nke e merughị ihe n’oke, wee mee ka ịdamba dị n’anụ-arụ, n’akọ-nuche, ọbụna n’ike nke ezi-agwa. Ọ nēbibikwa nnụkuru-nnụ madụ site na ihe ụtọ nke anụ-arụ, nākwarukwa ọdịdị nile nke madụ. Ma n’ịluzukwa ọlụ ya, ndị mụọ wee nēkwukwa sị na “inwe amamihe nēbụli madụ elu kari iwu nile”; na “ihe ọbụla nke dị-adị, bụ ihe ziri ezi; na “Chineke adịghị ama ikpe”; na ọbụna mehie nile dị......... ọcha.” Mgbe ndị madụ si otua kwenye na ọchịchọ bụ iwu dịkasịrị elu, na nnwere-onwe bụ ikike ọlụ, na madụ gāhaziri onwe ya ọnọdụ ya, onyekwa pụrụ inwe ihe iju-anya na iri-ngàrì nāsọgharị site n’aka fere n’aka? Imerimè madụ nādị ngwangwa ịnabata nmetụta nke-ihe-ụtọ nke anụ-arụ. Ekwensu nāchịkọta nnukurunnụ madụ nime ọgbà ya bụ ndị sị na ha nēso-ụzọ Kraist. OdU 43.4

Kama Chineke enyeworị ìhè zuru-oke ịchọpụta ọnya ọbụla. Ntọ-ala nke ofufe mụo-ọjọ nọkwa n’agha ya na ihe e deworo n’akwụkwọ-nsọ. Akwụkwọ-nsọ nēkwupụta na ndị nwụrụ-anwụ adịghị-ama ihe ọbụla, na echiche niie ha alawokwa niyi; ha enweghikwa òkè n’ọñụ nile ma-ọbụ iri-ujụ nile nke ndị nọ n’ụwa. OdU 44.1