Otu ihe kachasị iga n’ihu n’etiti ndị ozi nke onye nduhie uku ahụ bụ ọlụ ebube ụgha dị iche iche nke ndị mmụọ ọjọọ. Ka ndị mmadụ na-ajụ eziokwu, ha na-adaba n’aka nduhie dịka anụ oriri. OdU 23.2
Ozizi ọjọọ ọzọ bụ ozizi nke na-agọnarị ịbụ chi nke Kraịst, na-ekwu na Ọ dịghịrị adị tupu Ya abịa n’ụwa. Ozizi a na-emegide okwu ndị Onye Nzọpụta kwuru banyere mmekọrịta dị n’etiti Ya na Nna Ya na ụdịdị Ya tupu Ya abịa n’ụwa. Ọ na-akụda okwukwe site n’Akwụkwọ Nsọ banyere ịbụ chi nke Kraịst, Ọ dịghị onye ọ bụla ji ozizi ọjọọ a pụrụ inwe ezi nghọta nke Kraịst ma ọ bụ ụkpụrụ nke Chineke maka mgbapụta nke mmadụ. OdU 23.3
Ozizi ọjọọ ọzọkwa bụ nkwenye na Setan enweghị ọdịdị dịka onye dị adị, na e weere aha ahụ mee ihe na Akwụkwọ Nsọ naanị igosipụta echiche ọjọọ na agụụ ọjọọ dị ịche iche nke mmadụ. OdU 23.4
Ozizi ahụ na-ekwu na ọbịbịa abụọ nke Kraịst bụ ọbịbịa Ya nye mmadụ ọ bụla n’ọnwụ, bụ ngwa ọlụ iji wepụ uche ndị mmadụ site n’ọbịbịa Ya n’igwẹ ojii nke eluịgwe. Ya mere, Setan nọ naekwu, “Lee, Ọ nọ n’ụlọ” (Lee Matiu 24:23-26), ma ọtụtụ mmadụ efuola site n’ịnabata nduhie a. OdU 24.1
Ọzọ, ndị na-amụ sayensị na-ekwu na ọzịza ọ bula n’ezie adịghị nye ekpere; nke a ga-abụ mmebi nke iwu-ihe ịrịba ama, na ihe ịrịba ama dị iche iche adịghị. Ha na-ekwu na ọ bụ iwu dị iche iche ndị nọgidesiri ike na-achị ụwa nile, na Chineke n’onwe Ya adịghị eme ihe ọ bụla megidere iwu ndị a. N’ụzọ nke a, ha naegosi Chineke dịka Onye nọ n’okpuru iwu nke Ya Onwe Ya dịka iwu Chineke, ọ na-egbochi m’nwere onwe nke Chineke. OdU 24.2
Kraịst na ndị ozi Ya, ọ bụ ha emeghị ọtụtụ ihe ịrịba ama? Otu Onye Nzọpụta ahụ nwere ọchịchọ ịña ntị nye ekpere nke okwukwe ‘dịka na mgbe a hụrụ Ya mgbe O jegharịrị n’etiti ndị mmadụ. Ọdịdị nke anụ arụ na nke ime mmụọ na-alụkọ ọlụ. Ọ bụ otu ụzọ nke ụkpụrụ Chineke inye anyị n’ọzịza ekpere nke okwukwe, ihe ahụ Ọ na-agaghịrị enye anyị mgbe anyị na-arịọghị. OdU 24.3