Ozizi ụgha dị iche iche n’ime ọtụtụ nzukọ ewepụla oke ala ndị okwu Chineke mere ka ha guzosie ike. Ole na ole ka ha dị bụ ndị na-akwụsị mgbe ha jụrụ nanị otu eziokwu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-ewezuga ọtụtụ ụkpụrụ eziokwu n’otu n’otu rue mgbe ha ghọrọ ndị na-ekweghị ekwe. OdU 24.4
Ozizi ụgha dị iche iche nke ọtụtụ mmadụ na-ezi dịka ozizi nke akwụkwọ nsọ edubawo ọtụtụ mkpụrụ obi n’ime ekweghị ekwe na obi abụa n’ebe akwụkwọ nsọ dị. Nye onye eduhiere n’ụzọ dị otu a, ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ ya ịnabata ozizi ndị bụ iju anya nye nghọta nke ikpe ziri ezi, ebere na in we obiọma. Ebe a na-egosi ozizi ọjọọ ndị ahụ dịka ozizi nke akwụkwọ nsọ, o we jụ ịnara akwụkwọ nsọ dịka okwu Chineke. OdU 24.5
Eji enweghị ntụkwasị obi na-elegide okwu Chineke anya n’ihi na ọ na-atụ mmehie n’anya, na-amakwa ya ikpe. Ndị ahụ naachọghị ige ọchịchọ ya ntị na-agba mbọ ịkwatu ikike ya. Ọtụtụ aghọwo ndị na-ekweghị ekwe n’ihi ka ha we gụa nhapụ nke ha hapụrụ ọlụ dịịrị ha ịlụ n’ihe ziri ezi. Ndị ọzọ, ebe ha na-enweghị ike ịluzu ọlụ ọbụla nke nagidere ịjụ onwe onye, n’ihi na ha hụrụ ume ngwụ n’anya, ha na-emere onwe ha aha dịka ndị oke amamihe, site n’ikwutọ akwụkwọ nsọ. OdU 25.1
Ọtụtụ na-eche na ọ bụ ihe dị mma iguzoro n’akụkụ enweghị okwukwe, in we obi abụa, na ekweghị ekwe. Mana okpuru ngosipụta onwe ha nke a dịka ndị eziokwu ka a ga-ahụ ịtụkwasị onwe onye obi na mpako. Ọtụtụ na-enwe ihe ụtọ site n’isi n’akwụkwọ nsọ chọpụta ihe ga-agba ndị ọzọ uche gharịị. Ụfọdụ, site naanị n’ịhụnanya nke ndọndọ, na-adọnyere ihe naabụghị eziokwu ukwu, na mmalite. Ma ebe ọ bụ na ha ejiwo ọnụ ha kwupụta ekweghị ekwe a, ha na-esoro ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke jikota aka. OdU 25.2