Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Obi Abụọ N’Ebe Akwụkwọ Nsọ Dị

    Ozizi ụgha dị iche iche n’ime ọtụtụ nzukọ ewepụla oke ala ndị okwu Chineke mere ka ha guzosie ike. Ole na ole ka ha dị bụ ndị na-akwụsị mgbe ha jụrụ nanị otu eziokwu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-ewezuga ọtụtụ ụkpụrụ eziokwu n’otu n’otu rue mgbe ha ghọrọ ndị na-ekweghị ekwe.OdU 24.4

    Ozizi ụgha dị iche iche nke ọtụtụ mmadụ na-ezi dịka ozizi nke akwụkwọ nsọ edubawo ọtụtụ mkpụrụ obi n’ime ekweghị ekwe na obi abụa n’ebe akwụkwọ nsọ dị. Nye onye eduhiere n’ụzọ dị otu a, ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ ya ịnabata ozizi ndị bụ iju anya nye nghọta nke ikpe ziri ezi, ebere na in we obiọma. Ebe a na-egosi ozizi ọjọọ ndị ahụ dịka ozizi nke akwụkwọ nsọ, o we jụ ịnara akwụkwọ nsọ dịka okwu Chineke.OdU 24.5

    Eji enweghị ntụkwasị obi na-elegide okwu Chineke anya n’ihi na ọ na-atụ mmehie n’anya, na-amakwa ya ikpe. Ndị ahụ naachọghị ige ọchịchọ ya ntị na-agba mbọ ịkwatu ikike ya. Ọtụtụ aghọwo ndị na-ekweghị ekwe n’ihi ka ha we gụa nhapụ nke ha hapụrụ ọlụ dịịrị ha ịlụ n’ihe ziri ezi. Ndị ọzọ, ebe ha na-enweghị ike ịluzu ọlụ ọbụla nke nagidere ịjụ onwe onye, n’ihi na ha hụrụ ume ngwụ n’anya, ha na-emere onwe ha aha dịka ndị oke amamihe, site n’ikwutọ akwụkwọ nsọ.OdU 25.1

    Ọtụtụ na-eche na ọ bụ ihe dị mma iguzoro n’akụkụ enweghị okwukwe, in we obi abụa, na ekweghị ekwe. Mana okpuru ngosipụta onwe ha nke a dịka ndị eziokwu ka a ga-ahụ ịtụkwasị onwe onye obi na mpako. Ọtụtụ na-enwe ihe ụtọ site n’isi n’akwụkwọ nsọ chọpụta ihe ga-agba ndị ọzọ uche gharịị. Ụfọdụ, site naanị n’ịhụnanya nke ndọndọ, na-adọnyere ihe naabụghị eziokwu ukwu, na mmalite. Ma ebe ọ bụ na ha ejiwo ọnụ ha kwupụta ekweghị ekwe a, ha na-esoro ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke jikota aka.OdU 25.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents