Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Mgbapụta Abịawo!

    N’etiti abalị, Chineke gosiri ike Ya nke ngbapụta ndị Ya. Anwụ na-amụ n’ike ya. Ihe ịrịba ama na ihe iju anya na-esokwa ya. Ndị ajọ omume weere ịtụ egwu na-ele ihe ndị na-eme, ebe ndị ezi omume na-añụrị ọñụ n’ihi mgbapụta ha. N’ime eluigwe naewe iwe, e nwere oghere dị ebube na-enweghị nkọwa nke olu Chineke sitere na ya na-ada dịka oke mmiri ozuzo, na-asị, “Emewo ya”. Olu nke a mtere oke mkpọtụ n’igwe na n’ụwa. E nwere oke ala ọma jijiji, “nke na-adịtụbeghị mgbe ọ bụla site na mgbe mmadụ pụtara n’elu ụwa” Nkpughe 16:18. Okwute etiwara etiwa ewee jupụta n’ebe niile. E jiri iwe wezuga oke osimiri. A nụrụ mkpatụ oke ifufe dịka olu ndị mọ ọjọọ. Ụwa na-agbawa agbawa. A na-ewezuga ntọala ya n’ọnọdụ ya. Oke osimiri ebe ụgbọ mmiri na-alọta adịwo ka Sọdọm n’ime ihe ọjọọ. Ọ bụ ya ka mmiri lomiri. Babịlọn ukuu ahụ abịawo na ncheta n’ịru Chineke, “inye ya iko nke mmanya nke ọnụma nke iwe ya” Nkpughe 19:19. Oke nkume si n’elu bibie ha. Ewedara obodo ndị amara aha ha n’ala. Ụlọ ndị eze, ebe ndị mmadụ na-egosipụta ịdị ukuu ha dakpọrọ n’anya ha. Emehepụrụ ụlọ mkpọrọ, ewe mee ka ndị nke Chineke nwere onwe ha.OdU 89.1

    Ili niile mehere, ụfọdụ ndị na-ararụ ụra n’ala bụ aja, gaeteta, ụfọdụ, baa na ndụ ebighi ebi, ụfọdụ, n’ịta ụta dị ukuu. “Ọ bụna ndị ahụ mara ya ube”, ndị ahụ mere ya ihe ọchị n’obe, na ndị ahụ na-ekweghị na eziokwu Ya, ka a ga-eme ka ha kulie site n’ili ha ka ha wee were anya ha abụọ hụ mbuli elu nke ebuliri ndị ahụ wedara-onwe ha n’ala ma rubekwa isi. Danịel 12:2; Nkpughe 1:7.OdU 89.2

    N’otu ntabi anya, igwe ojii dị oke egwu kpuchiri ụwa. Olu nke dakarịrị egbe eluigwe, olu nke dịkwa oke egwu, wee naekwupụta ihe ga-adakwasị ndị ọjọọ. Ndị mpako na ndị jụrụ ige ntị, ndị na-emegide ndị ahụ na-edobe iwu Chineke, na-atụ egwu ugbu a. Ndị mọ ọjọọ na-amakwa jijiji ebe ọtụtụ mmadụ na-arịọ ka emeere ha ebere.OdU 90.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents