Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 7—Isi Nke Asaa Nanị Ihe Nchekwa Anyị

    A na-agwa ndị nke Chineke ka ha na-agụ Akwụkwọ Nsọ dịka ihe nchekwa ha megide ihe nrafu nke ndị mọ nke ọchịchịrị. Ekwensu na-agbalị n’ụzọ nile ịhụ na o gbochiri mmadụ ịghọta ihe di na Akwụkwọ Nsọ, na ntute ọlụ ọ bụla nke Chineke, ka Ọ naebili lụsie ọlụ ike karịa. N’oge na-adịghị anya, a ga-ekpughe n’iru anyị, ndọrọ ndọrọ ikpe azụ megide Kraịst na ndị na-eso ụzọ Ya. Ụgha ahụ ga-eyi eziokwu nke uku nke mere na ọ ga-enye nsogbu ịmata nke bụ nke, ma ọ bụghị site n’Akwụkwọ Nsọ.OdU 63.1

    A ga-emegide ndi na-agbalị ige iwu nile nke Chineke ntị ma werekwa ha mere ihe ọchị. Na ịnagide ọnwụnwa ahụ, ha gaabụrịrị ndị ga-amata ọchịchọ nke Chineke dịka esi kpughe ya n’Okwu Ya. Ha ga-asọpụrụ Ya nanị mgbe ha nwere echiche ziri ezi banyere agwa, ọchịchọ na ebumnobi Ya ma me dịka ha si dị. Ọ bụ nanị ndị jiri eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ chekwa obi ha gaenwe mmeri na ọgụ nke ikpeazụ ahụ.OdU 63.2

    Tutu akpọgbue Ya, Onye Nzọpụta gwara ndị na-eso uzọ Ya na a ga-egbu Ya mana Ya ga-ebilikwa ọzọ. Ndị mọ ozi nọkwara mgbe ahụ ime ka okwu Ya dịgide n’obi ha. Ma okwu ndị ahụ pụrụ n’obi ndị na eso ụzọ Ya. Mgbe ọnwụnwa bịara, ọnwụ Jisọs bibiri olile anya ha dịka aga asị na ọ bụ ihe Ọ na-agwaghị ha agwa. N’ihi ya, site n’amụma ka ekpughere anyị ọdịnihu n’ụzọ were anya dịka Kraịst kpughere ndị na-eso ụzọ Ya. Ma igwe mmadụ anaghị aghọtakwa eziokwu ndị a dị mkpa dịka aga asị na ọ dịbeghị mgbe ọ bula ekpughere ya.OdU 63.3

    Mgbe Chineke na-enye ndụmọdụ, Ọ na-achọ ka onye ọ bụla nwere uche nabata ozi ahụ. Ikpe dị egwu megide ife ofufe nye nwa anụ ọhịa na ihe oyiyi ya (Lee Nkpughe 14:9-11) kwesiri iduru onye ọ bụla ịmata ihe bụ akara anụ ọhịa n’ụzọ a ga-esi gbanarị inweta ya. Ma igwe mmadụ achọghị ịma eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na ọ na-emekụta ihe ndị na-amasị obi nke mmehie. Ekwensu na-aghọgbu ha site na iwepụta ihe ndị ahụ naeduhie eduhie ha hụrụ na anya.OdU 63.4

    Ma Chineke ga-enwe mmadụ ndị ga-adabere na Akwụkwọ Nsọ, nanị Akwụkwọ Nsọ, dịka ntọala nke ozizi nile n’ebe ndabere nke ihe nile ahaziri ahazi. Echiche nke ndị ọka mmụta, ihe ndị sayensị wepụtara, mkpebi nke ndị isi nzukọ, olu nke ndị ka na ọnụọgụgụ; apụghị iwere otu n’ime ihe ndị a dịka ihe a ga-eji kwado ma ọ bụ megide ozizi ọ bụla. Anyị ga-achọpụtarịrị nke doro anya. Nke sị, “otu a ka Onye Nwe Anyị kwuru”. Ekwensu na-eduru ndị mmadụ ilekwasị ndị Pastọ na ndị nkuzi nke okpukperechi anya dịka ndị ndu ha karịa inyocha Akwụkwọ Nsọ n’onwe ha. Ọ na-enwe ike irute igwe mmadụ site n’iwere ndị ndu a na-alụ ọlụ.OdU 64.1

    Ndị na-enweghị otu ọ dịịrị ha were obi ụtọ nara Ya. Ma ndị nchụ aja na ndị ọchịchị were echiche ọjọọ gba onwe ha gburu gburu. Ha jụrụ ịnabata ihe ngosi nke ịbụ Mesaịa Ya. Ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ sị, “Olee otu o si bụrụ na ndị ndu anyị, ndị ode akwụkwọ na ndị ọka mmụta ekweghị na Jisọs? Ọ bụ ndị ozizi a mere ka ndị Ju ghara ịnabata Onye Mgbapụta ha.OdU 64.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents