Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ezi Ndị Nēso Ụzọ Nke Kraist

    Nāgbanyeghi ntalata nke okwukwe n’ebe nile, ọ dikwa ezi ndi nēso-ụzọ nke Kraist na nzukọ ndia nile. Tutu nleta ikpeazụ nke ikpe Chineke n’elu ụwa, a gēnwe ntute nke omume Chineke n’ụdi nke nādighị mgbe a nuworo ya ọbụna n’oge nke ndi ozi ochie. Mụọ nke Chineke ka a gāwusakwa. Ọtụtụ gēkewapụkwa onwe ha site na nzukọ ndia nile nke ihụnanya nke ihe ụwa gbudaworo ihụnanya nke Chineke na Okwu Ya. Ọtụtụ ndi-ozi na ndị madụ gēji obi-ụtọ nara ezi-okwu nile ndia nke n’ejikere òtù ndị madụ nye ọbibia abụa nke Onyenwe-anyi.OdU 50.4

    Onye iro nke mkpụrụ-obi nwere nmasi igbochi ọlụ nkaa, ma tutu oge ahụ nke ụdị òtù ndị dịka nkaa gāpụta, ọ gāgbalisikwa ike igbochi ya site n’iwepụta oyiri ya. Nime nzukọ ndia nile nke ọ pụrụ iweta n’okpuru ike ya, ọ gēmekwa ka ọ dịka a wụsara ezingọzi nke Chineke n’ụzo pụrụ iche. Imerimè madụ gāwuli-elu n’ọñụ-nmeri nāsikwa: “Chineke nālụ ọlụ n’ụzọ dị ebube,” ọbụna mgbe ọlụ ahụ bụkwa nke mụọ ọzọ. Site n’ụdị nke okpukperechi, Ekwensu gāchọ idọrọ nhuku ya rue n’akụkụ ụwa nile nke ndi Kristen. Nkpali nke omume anụ-arụ dikwa, ngwakọ nke ezi-okwu na okwu-ụgha, e doziri nke ọma iduhie-eduhie.OdU 51.1

    Ma otu-ọdị, sitekwa nìhè nke okwu Chineke ọ bụghi ihe siriike imata ọdịdị nke òtù nile ọbụla. Ebe ọbụla ụmụ madụ lepụrụ anya n’ọgbụgba-ama nke akwụkwọ-nsọ, nēwepụkwa iru ha site n’ezi-okwu ndia were-anya nānwalekwa ime-obi, nke chọkwara ịjụ onwe-onye na irapụ ihe nke ụwa, ayi kwesirị ịmara na a wụsaghị ngọzi nke Chineke n’ebe di otua. Ma sitekwa n’ụkpụrụ nke si, “Unu gēsitekwa na mkpụrụ ha mazue ha” (Matiu 7:16), ọ pụtara ìhè na òtù ndia a bughị ọlụ-aka nke mụọ nke Chineke.OdU 51.2

    Ezi-okwu nile nke Okwu Chineke bu ọta megide nduhie nile nke Ekwensu. Ileghara ezi-okwu ndia anya emeghewo ụzọ nye ihe ọjọ nile nke gbasaworo n’ụwa. Idi-mkpa nke iwu Chineke efuwokwa n’anya madụ. Enweghi ezi-nghọta banyere iwu nke Chineke a lụpụtawo-kwa nghọhiè n’ihe banyere nchegharị na odido-nsọ, nēwedatakwa ọnọdụ nke ezi-okpukperechi. N’ebea ka a gāhụtkwa ihe nzuzo nke e nweghi mụọ Chineke n’udi ntute nile nke oge anyi ugbua.OdU 51.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents