Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 4—Isi Nke Anọ Ndụ Ebighi-Ebi

    Setan, ọnye ahụ nke kpaliworo nnupụ-isi n’elu-igwe, chọwokwara ịkpọrọ ndị bi n’elu-ụwa ka ha jikọọ aka n’ibu agha ya megide Chineke. Adam na Iv biworo n’obi-ụtọ zuru oke na nrube-isi n’iwu Chineke - nke ọgbụgba-ama ya nọgidekwara mgbe nile nēmegide agụgọ nke Ekwensu kpaliri n’elu-igwe na iwu Chineke nākpagbu-akpagbu. Ekwensu nweworo mkpebi siri ike ịkpatara ha ọdịda, ka ya onwe ya nwere elu-ụwa nkaa ma doziekwa ala-eze ya n’ebea imegide Onye kachasi ihe nile elu.OdU 28.1

    Adam na Iv ka a dọwokwara aka na ntị megide onye iro a di egwu, kama ọ lụrụ ọlụ ya n’ụzọ n’apụtaghị ihè nēzonarịkwa ebum-nobi ya. Ka o sitere n’aka agwọ nālụ ọlụ ya, mgbe ahụ agwọ bụụrụ ihe okike nke ọdịdị ya mabigara mma oke, o wee kwusara Iv okwu sị: “Ọ bụ ezie na Chineke sịrị, unu e rila mkpụrụ sitere n’osisi ọbụla nke ubia a gbara ogige?” Iv gara n’iru itụnye ọnụ na arụmarụ ụka ya wee daba n’ọnya nke aghụghọ ya: “Nwanyị ahụ we sị agwọ ahụ, Anyị nēri mkpụrụ osisi nile nke ubia: kama mkpụrụ nke osisi ahụ nke dị n’etiti ubia, Chineke a siwo, Unu erila mkpụrụ sitere na ya, unu emetụkwala ya aka, ka unu wee ghara ịnwụ-anwụ. Agwọ wee sị nwanyị ahụ, unu agaghị anwụ nezie; nihi na Chineke matara na n’ụbọchị unu gēri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a gēmehepụ anya unu, na unu gādịkwa ka ndị bụ chi, nāmarakwa ezi ihe na ajọ ihe.” Jenesis 3:1-5OdU 28.2

    Iv kwenyere, ma sitekwa na nhuku nke ya Adam wee bụrụ onye e dubakwara nime mmehie. Ha nabatara okwu nile nke agwọ ahụ; ha atụkwasịghịkwa onye kere ha obi kama nēche na O gbochiri ha inwere onwe ha.OdU 28.3

    Ma gịnị ka Adarh chọpụtara na mkpụrụ okwu ndịa nke si: “N’ụbọchị ahụ nke gị onwe gị gēri site na ya gị onwe gị aghaghị inwụ-anwụ?” Ọ bụ na a gēkuru ya rue n’ogo nke ibi ndụ dị-elu karị? Adam ahụghị nkaa dịka ihe okwu Onyenwe-anyị pụtara. Chineke kwupụtara ya na dịka ụgwọ a gākwụ nihi nmehie, na madụ gālaghachi n’aja: “Nihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’aja ka ị gālaghachi.” Jenesis 3:19 Ma okwu nke Ekwensu, “A gēmehepụ anya unu” gosiri ezi-okwu naanị n’otu nghọta nkaa: na e meghere anya ha abụa ilezu omume nzuzu ha. Ha matara nke bụ ihe ọjọ ma detụkwa ire ha n’ilu-ilu nke mkpụrụ mmebi iwu ahụ.OdU 28.4

    Osisi nke ndu ahụ nwewokwara ike ime ka ndụ nọgideanọgide. Adam gara anọgidekwa nēri site n’osisi nkaa ma biekwa ndu ebighi-ebi, kama mgbe o mehiere, a mapụrụ ya site n’ebe osisi nke ndụ ahụ o wee dịrị ọnwụ. Anwụghị-anwụ ka e tufuru nihi nmebi iwu. Olileanya ọbụla a garaghị adịrị ndị dara-ada ma asi na Chineke emeghị ka anwụghị-anwụ rute ha site n’ọchụchụ aja nke Ọkpara Ya. Ka “ọnwụ gabigara rue madụ nile, nihi na madu nile emehiewo,” Kraist “wetakwara ndụ na anwụghị-anwụ ka ọ pụta ìhè site n’ozi-ọma ahụ.” Ọ bụ naanị site n’aka Kraist ka a pụrụ inweta anwụghi-anwụ.” “Onye nke kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighi-ebi: ma onye nke n’ekweghị n’Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ. Ndị Rom 5:12; 2Timoti 1:10; Jọn 3:36.OdU 29.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents