Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Luther Gosiri Ihe Bụ Inweta Ngbaghara Nmehie Na Nzọpụta

    Ọchịchọ nke inweta udo n’ebe Chineke nọ dubara Martin Luther inye onwe ya n’ọnọdụ ụdi nke ofufe. N’ụdi ndụ nkaa ka a chọrọ ya ilụ-ọlụ nke órù dịkasiri àlà ọbụna dịka onye aririọ site n’ụlọ rue n’ụlọ. Ọ nagidekwara nweda n’àlà nkaa, kwenyekwa na ọ bụ ihe dị mkpa omume nihi nmehie ya.OdU 54.1

    O biri ndụ nime oke aramahụ n’agbalikwa site n’obubu-ọnụ, na iche-nche nke ekpere n’ofufe-abali, na ihe-otiti di iche iche igbanarị ajọ ihe nile nke anụ-arụ di nime ya. Mgbe e emesịrị o kwupụtakwara si; “Ọ bụrụ na onye e dotere n’ụdi ọnọdụ nkaa pụrụ inweta ala-eze elu-igwe site n’ọlu ya, nezie tnu-onwem gaara enwetakwa oke ahu . ...... Ọ bụrụkwa na ọnọdụa nọgidere gaa niru ogologo oge ọzọ, mụ-onwem kēbuwori ụdi ndụ ofufe nkaa ọbụna nwụakwa nime ya.” Nime mgbalị ya nile, mkpụrụ-obi ya nke e boworo ibu di arọ a chọtaghikwa ihe idi mfe ọbụla: Naanị na e dubara ya n’ikpeazụ n’ọnọdụ nke ida-mba olileanya nādịghịkwa.OdU 54.2

    Mgbe o mere dịka ihe nile efuwo, Chineke kpọlitere ótù enyi nye ya. Stọpiz meghere okwu Chineke nye uche nke Luther ma gwakwa ya ka o lepụ onwe-ya anya ma lekwasi anya na Jịsọs “Kama i nāta onwe gi ahụhụ nihi nmehie. gi, tukwasi onwe gị n’obaka nke Onye mgbaputa. Tukwasikwa Ya obi, nweekwa eziomume nke ndụ Ya, ma nime udo nke ọnwụ Ya ..... Ọkpara nke Chineke ...... biara ghọọ madụ inye gi olileanya nke iru-ọma Chineke ...... Hụkwa Ya n’anya bụ onye ahụ nke buworo ụzọ hụ gi nanya.” Okwu ya nile nwere nmetụta dị omimi nime uche nke Luther. Udo wee bata nime obi ya nke e sogbuworo.OdU 54.3

    Mgbe e mesiri, a nụrụ olu Luther site n’oche ozi ka ọ nākpọ òkù nke idọ-aka na nti. O kwupụtara ya n’iru ndi madụ bụ ụdị ajọ ihe nke dị na nmehie ma zikwà na ọ bụ ihe n’apụghị omume ka madụ site n’ọlụ nke onwe ya mee ka ikpe ọmụma ya di àlà maọbụkwa gbanari ntaramahụhụ ya. Ọdịghị ihe ọzọ ma-ọbụghi ichegharikute Chineke na okwukwe nime Kraist pụrụ izọpụta onye nmehie. Amara nke Kraist ka a n’apụghikwa izụta; nihi na ọ bụ onyinye a nēnye n’efu. O wee nye ndi madụ ndụmọdụ ka ha ghara izụ ihe mgbaghara nmehie azụ, kama ka ha lekwasi anya nke okwukwe n’onye mgbapụta ahụ a kpọgburu. Ọ kọpụtakwara akụkọ nke ndụ nhuju-anya nke ya onwe ya ma kwusiekwa ya ike nye ndi nēge ya ntị na ọ bụ naanị n’ịkwere na Kraist ka ya onwe ya nwetara udo na ọñụ.OdU 54.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents