Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ozizi Ụgha Nke Ntaramahụhụ Dị Ebighi-Ebi

    Ihe ọjọọ ka a lụpụtara site n’irọ-otu nke ntaramahụhụ dị ebighiebi. Okpukperechi nke akwụkwọ-nsọ, nke jupụtakwara n’ịhụnanya na ịdị nma, ka e mere ka ọ gbaa itiri site nihe nēnweghị njide aka nke e gbokwasikwara ihe iyi-egwu. Ekwensu etewo agwa Chineke agba ọjọ. Onye obi ebere keworo anyị ka a nātụ egwu, nāsọ asọ, ọbụna ikpọkwa Ya asi. Nkọwa nēyi egwu banyere ọdịdị Chineke nke a gbasara n’ụwa nile site n’elu-oche ozizi nke ndị ụkọ-chukwu emewo ka nnụkuru-nnụ madụ bụrụ ndi n’ekweghi-ekwe ma ọbụ ndị n’achọghi ịnụ ihe ọbụla.OdU 31.2

    Ntaramahụhụ ebeghi-ebi bụ otu nime ọtụtụ ozizi ụgha, bụ manya nke ihe-arụ dị iche iche (Mkpuhe 14:8, 17:2), bụ nke Babilọn nēme ka mba nile nụa. Ndị ozi nke Kraist nabatara irootua nke sitere na Rom dịka ha nabatakwara ụbọchị izu-ike ụgha. Ọbụrụ na anyị arapụ okwu Chineke ma nabata ozizi ụgha ndịa nihi na ndị nna anyị ha kụziri ha, anyị nādabakwa n’ọmụma-ikpe nke ahụ a mara Bibilọn; nihi na anyị nāñụkwa manya nke ihe-arụ ya nile.OdU 31.3

    Ọtụtụ ndị ka n’ọnụ-ọgụgụ ka a nāmahie ira n’ebe ụzọ n’ezighi ezi. Ha nahụ na akwụkwọ-nsọ nēgosi Chineke dịka onye ịhụnanya na onye ọmiko nke ha n’apụghị ikwenyekwa na ọ gēnyefe ndị O kere eke n’aka ọku ala-mụọ nēre ebighi-ebi. Ka ha nēkwu na mkpụrụ-obi nwere ndụ anwụghị-anwụ, ha nēkwesikwa ike na madụ nile ka a g’azọpụta. Otua onye mmehie pụrụ ibi ndụ nihe ụtọ nke onwe onye; n’agụghịkwa ihe Chineke nāchọ, ma bụrụkwa onye a nabatara n’iru ọma Ya. Ụdị ozizi nkaa nke n’adabere n’ebere Chineke ma n’eleghara ezi-ikpe ya anya nādị obi anụ-arụ nāchị ezi nma.OdU 31.4

    *Nihi nkọwa bayere ụbọchị izu-ike, lee chapta 8 nke akwụkwọ a.OdU 32.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents