Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ndị Mmụọ ọjọọ Na-Eguzogide Ụkpụrụ Dị Iche Iche Nke Chineke

    Ndị mmụọ ọjọọ, ndị e kere na mbụ na-enweghị mmehie, ha na ndị mmụọ ozi dị nsọ, ndị na-ejere Chineke ozi ugbu a, hata ahata mgbe e kere ha, ma n’ụdịdị nke okike ha, ma n’ike, ma n’ebube. Ma ebe mmehie meworo ka ha daa, ha jikọtara onwe ha n’otu imegide nsọpụrụ nke Chineke na iwetara mmadụ mbibi. Ebe ha na Ekwensu jikọrọ aka na nnupu isi, ha na-ejikọtakwa aka n’otu, na-ebu agha megide ịchị isi nke Chineke.OdU 15.1

    Akụkọ agba ochie nke akwụkwọ nsọ na-ekwu na ha dị adị, ma n’oge mgbe Kraịst nọọrọ n’ụwa, ndị mmụọ ọjọọ mere ka ike ha pụta ihe n’ụzọ dị ịtụnanya. Ebe Kraịst bịaworo ka Ọ gbapụta mmadụ, Ekwensu we kpebie ma chọsie ike ka o doo ụwa nile n’okpuru ya. O mewo ka ikpere arụsị bụrụ ihe ehiwere n’akụkụ nile nke ụwa ewezuga Palestain. Ọ bụ n’ime ala nke a, nke nanị ya fọdụrụ ịbụrụ nke onye ọnwụnwa n’ozuzu oke, ka Kraịst bịara na esetịpụ aka nke ịhụnanya Ya, na-akpọ mmadụ nile ka ha chọta mgbaghara na udo n’ime Ya. Ụsụụ ndị agha nke ọchịchịrị matara na ọ bụrụ na ije ozi nke Kraịst agaa n’iru, na ọchịchị ha ga-ebi ngwa.OdU 15.2

    E kwuru ya nke ọma n’ime Agba Ọhụụ nke Akwụkwọ nsọ na ndị mmụọ ọjọọ weere arụ ndị mmadụ mere ebe obibi ha. Ndị e tiri ihe otiti dị otu a abụghị ọrịa nke ọnọdụ ụwa ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e-kere eke kpatara ka ha na-arịa. Kraịst n’onwe Ya matara na ndị ọjọọ bi ebi, na-alụkwa ọlụ n’ime mmadụ. Ndị ahụ ndị mmụọ ọjọọ biiri n’ime ha na Gadara, bụ ndị ara, ndị ọnọdụ ha jọgburu onwe-ya, ndị na-añagharị onwe ha n’ihe mgbu, na-asụ ụfụfụ n’ọnụ, ma na agagharị n’oke iwe, na-emerụkwa onwe ha arụ n’ihe ike ma na-etinyekwa ndụ ndị na-abịaru ha nso n’ihe ize ndụ. Arụ ha nke na-agba ọbara, nke nwewokwara nkwarụ na akọ na uche ha nke na-ezukwaghị oke gosipụtara ụdị ọnọdụ nke dị onye isi nke ọchịchịrị ezi mma. Otu n’ime ndị mmụọ ọjọọ ndi naara achị ndị nhuju anya ahụ kwupụtara sị, “Aha m bụ Lijiọn; n’ihi na anyị dị ọtụtụ”. (Mak 5:9). N’ụsụụ agha nke ndị Rom, otu lijiọn pụtara ndị agha dị n’ọnụ ọgụgụ sitere na puku atọ rue puku ise. N’iwu nke Jisọs nyere ha, ndị mmụọ ọjọọ ndị a siri n’arụ ndị ahụ ha bi n’ime ha wee pụa, ndị ahụ wee bụrụ ndị dajụrụ adajụ, ndị maara ihe, na ndị dị nwayọ. Ma ndị mmụọ ọjọọ ahụ chụbara igwe ezi n’ime oke osimiri, ndị Gadara wee hụ mfụ nke a dịka ihe karịrị ngọzi Kraist wetara uku; ha we rịọ Onye ọgwụgwọ a nke sitere na Chineke ka Ọ pụa. (Lee Matiu 8:23-24). Site n’ibokwasị Jisọs ikpe ọmụma nke mfu ha, Ekwensu kpaliri ụjọ ahu nke sitere n’ọchịchọ nke onwe onye n’ime obi ndị ahụ, we gbochie ha ịnụ okwu Jisọs.OdU 15.3

    Kraịst kwere ka ndị mmụọ ọjọọ bibie ezi ndị ahụ ka ọ bụrụ jta uta nye ndị Ju ndị na-akpa anụ ndị na-adịghị ọcha n’ihi inweta uru. A sị na Kraịst egbochighị ndị mmụọ ọjọọ ahụ, ọ bụghị naanị ezi ka ha gaara enudakwa, ọ bụna ndị nwe ha na ndị na-azụ ha n’ime mmiri.OdU 16.1

    Tụkwasị nke a, e kwere ka ihe a mee, ka ndị na-eso ụzọ Jisọs hụ ike Ekwensu, nke ọnụma dị n’ime ya, bụ nke o nwere n’ebe mmadụ na anụmanụ dị, ka ha we ghara ịbụ ndị eduhiere site n’aghụghọ ya nile. Ọ bụkwaara ọchịchọ Kraịst ka ndị mmadụ hụ ike O nwere iji tijie agbụ nile nke Ekwensu ma tọpụ ndị ọ dọtara n’agha. Ọ bụ ezie na Jisọs onwe Ya si n’ebe ahụ pụa, ma ndị ahụ, ndị O ji ụzọ dị ebube dị otu a napụta nọgidere, ka ha we kwusaa ebere nke Onye ahụ mere ha mma.OdU 16.2

    E dekwara ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ: Nwa nwanyị nke SaịrọFjnisia, onye mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu nke uku, nke Jisọs ji okwu ọnụ Ya chụpụ (Mak 7:25-30); Nwa okoroọbịa onye nwere mmụọ nke na-atụba ya otụtụ ugbo “n’ime ọkụ na n’ime mmiri ịla ya n’iyi” (Mak 9:17-27); Onye ara ahụ nke mmụọ ọjọọ na-adịghị ọcha naara emekpa arụ, bụ onye webatara ụzụ n’ime ịdị nwayọ nke ụbọchị izu ike ahụ na Kapanaụm (Luk 4:33-36) - ha nile ka Onye Nzọpụta gwọrọ. Ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ na mgbe nile ha zutere na Jisọs na-agwa mmụọ ọjọọ okwu dịka ihe nwere izu, naenye ya iwu ka ọ ghara imekpakwa onye ahụ ọ na-esogbu arụ. Ihe nile bịara ofufe na Kapanaụm bụ ndị “ibobo nwụrụ n’arụ, ha we sịrịtaa onwe ha, Gịnị bụ okwu a! n’ihi na O ji ịchị isi na ike naenye ndị mmụọ ọjọọ iwu, ha na-apụtakwa” (Luk 4:36).OdU 17.1

    N’ihi inweta ike nke karịrị nke mmadụ, ụfọdụ nabatara nhuku nke Ekwensu. Ndị dị otu a, dịka a tụrụ anya ya, enweghị nram ahụ ọ bụla dị n’etiti ha na ndị mmụọ ọjọọ. N’etiti ha ka a hụtara ndị ahụ ndị nwere mmụọ nke ịjụ ase - ndị dịka: Saịmọn Magụs, Elimas onye mgbaasị, na nwa agbọghọ ahụ onye sooro Pọl na Saịlas na Filipaị. (Lee Ọlụ Ndị Ozi 8:9, 18; 13:8; 16:1618).OdU 17.2

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents