Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    A Gāzọpụta Madụ Nile?

    Ndị kwenyere. na nzọpụta nke madụ nile nāhịgharị Akwụkwọnsọ. Onye ozi nke Kraist nēkwughachikwa okwu ụgha ahụ nke agwọ kwuworo n’Iden, “Unu agaghị anwụ nezie.” “N’ụbọchị unu gēri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a gēmehepụ anya unu, unu gādịkwa ka ndị bụ chi.” Nkaa ka o kwupụtara na onye nmehie jọkasịrị njọ - onye ogbu-madụ, onye-ori, onye ọkwa-iko - mgbe ọ nwụsịrị gābanye n’ọñụ nke anwụghị-anwụ. Akụkọ ifo nkaa dị ụtọ nezie, nke kwesịrị inye añụrị n’obi nke anụ-arụ nāchi!OdU 32.2

    Ọbụrụ ezi-okwu na madụ nile gabigara rue elu-igwe n’oge awa nke ọgwụgwụ ndụ ha, ọ g’adịkwa nma ka anyị chọsie ọnwụ ike karị ndụ. E, ọtụtụ ka ụdị nkwenye nkaa dubara igbu onwe ha. Site n’oke nmetụta nke nsogbu na mkpọchu-iru dị iche iche, o yiri ka ọ dị mfe ịdọbi eriri nke ndụa ma rigoro baa nime ọñụ nke ụwa ebighi-ebi.OdU 32.3

    Chineke enyewo nime okwu ya ihe ngosi were anya na ya gāta ndị mmebi iwu ya ahụhụ. Ọ g’abụ na Ọ dị ebere nke uku n’agaghịkwa ekpe ikpe ziri ezi n’ebe onye nmehie nọ? Lerue anya n’obe Kalvarị. Ọnwụ nke Ọkpara Chineke nāgba ama na “Ụgwọọlụ nke nmehie bụ ọnwụ” (Ndị Rom 6:23), na omume ọbụla nke mebiri iwu Chineke aghaghị ịnata ụgwọ. Kraist onye n’enweghị mmehie ghọrọ mmehie nihi madụ. O wee hụrụ ikpe ọmụma nke mmebi iwu na nzotu iru nke Nna ya rue mgbe obi ya tiwara ma ndụ ya bụrụkwa nke a kwọriri-akwọri - ihe ndịa nile bụ ka e nwee ike gbaputa ndị nmehie. Ma mkpụrụ-obi ọbụla nke jụrụ ikere oke nke ime ka idị n’otu ahụ e wetara n’ụzọ dị oke ọnụ-ahia otua aghaghị iburu n’isi onwe ya bụ ikpe ọmụma ahụ na ntaramahụhụ nke mmebi iwu.OdU 32.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents