Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Odido Nsọ Nke Sitere N’akwụkwọ-Nsọ

    Odido-nsọ nāmakụ madụ n’ozuzu-oke ya - mụọ, nkpụrụ-obi na anụ-arụ. Lee Ndị ITesalọnika 5:23. Ndị nke Kraist ka a nādụsiọdụ ike ka ha chee arụ ha, “aja dị ndụ, dị nsọ, nke dịkwa Chineke ezi ụtọ” Ndị Rom 12:1. Omume ọbụla nke nēweta ịda-mba nye anụ-arụ ma-ọbụ akọ-nuche nēme ka madụ ghara izu oke nye ọlụ nke Onye kere ya. Ndị nile ji obi ha dum hụ Chineke ha n’anya gānọgide mgbe nile nāchọ iweta ikike ọbụla nke ndụ ha n’inwe otu-olu n’iwu nile nke nēwuli amamihe ha nime ọchịchọ Ya. Ha agaghịkwa esite n’iso ọchịchọ nke akpịrị ma-ọbụ nke anụ-arụ gbuda ma-ọbụ merụọ ihe onyinye nke ha nēche niru Nna ha nke elu-igwe.OdU 59.2

    Ihe-ụtọ ọbụla nke nmehie nāga n’iru imerụ na igbu akọ-nuche na anya nke ime-mụọ; okwu rha-ọbụ mụọ nke Chineke pụrụ inwe naanị nkuku n’esighi-ike nime obi. “Ka anyị sachapụ n’onwe-anyị bụ nmerụ nile nke arụ na nke mụọ, nēmezu ịdị-nsọ n’egwu Chineke.” Ndị 2Korịnt 7:1.OdU 59.3

    Ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha ndị nke Kraist nēweda onwe ha pụa n’ọdịdị Chineke site n’oke erimeri-ọnụ, na añụñụ manya, na ihe ụtọ ndị n’ekwesịghị-ekwesị. Ọbụna nzụkọ nākwadokwa ajọomume ndia nigbe nile, ka o mejuekwa akpa-ego ya nke ọlụ ihụ Kraist n’anya n’adịghị enwe ike imejupụtara ha. Asị na Jisọs nābanye ụlọ-nzụkọ di iche iche nke ụbọchị taa ma lekwasịkwa anya n’ememe ndia a nēme n’aha nke okpukperechi, ọ gaghịkwa achụpụ ndia nile nēmerụ-emerụ, dịka o nupusirị ndị nāgbanwe ego n’ụlọ-ikwu ya.OdU 60.1

    “Ma-ọbụ unu amataghị na arụ unu bụ ụlọ-nsọ nke Mụọ-Nsọ, onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? na ọ bụghịkwa unu onwe unu nwe onwe unu; nihi na e ji ọnụ-ahia gbara unu; ya mere nyenu Chineke otuto n’arụ unu, nīme-mụọ unu kwa nke bụcha nke Chineke.” Ndị 1 Kọrint 6:19, 20. Onye ahụ arụ ya bụ ụlọ-nsọ nke Mụọ-nsọ agaghị abanye n’oru site na omume owere-arụ nke nēgbu-egbu. Ike ya nile bụ nke Kraist. Akụ ya nile bụ nke Onyenwe-anyị. Olee otu ọ gēsi gbarie isi-ego e nyere ya n’aka idebe.OdU 60.2

    Ndị sị na ha bụ ndị nke Kraist nēmefu ọnụ-ọgụgụ ego dị ukuu site n’afọ rue n’afọ n’ihe ụtọ dị iche iche nke nēgbu-egbu. Chineke ka a nēzukwa ori n’onyinye nke otu-ụzọ n’ụzọ-iri na onyinye ndị ọzọ, ọbụna mgbe ha nēripịa n’elu oche nke ịla niyi nke anụ-arụ karị ka ha nēnye ịnapụta ndị ogbeye ma-obụ ịkwado ozi-ọma. Asị na ndị nile nēkwupụta Kraist bụ ndị e doworo nsọ nezie, nkụta ha kama imefu ya n’ihe ndia nēmerụ-arụ n’abaghịkwa uru, ka a gēwetakwa n’ụlọ:akụ nke Onyenwe-anyi. Ndị nke Kraist kwesịrị iziputa ihe nlere-anya na ndụ nke imeru ihe n’oke na nke inyechasị onwe-onye. Mgbe ahụ ka ha gābụkwa ìhè nke ụwa.OdU 60.3

    “Agụ ihe ọjọ nke anụ-arụ, na agụ ihe ọjọ nke anya, na mpako nile nke ndụa, (lJọn 2:16) nāchị ụmụ madụ kama ndị nēso-ụzọ Kraist nwere ọkpụkpọ nke dị-nsọ karị. “Nihi nkaa, sinụ n’etiti ha pụta, ma guzokwanụ iche, ka Onyenwe-anyị kwuru, unu emetụkwala ihe nādịghị-ọcha aka.” Nye ndị nile soro ụkpụrụ ndia, nkwa nke Chineke bụ, “Mu onwem gākpọbatakwa unu, bụrụkwa unu Nna’ unu onwe-unu gābụkwaram ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ka O kwuru bụ Onyenwe-anyị nke pụrụ ime ihe nile.” Ndị 2Kọrịnt 6; 17, 18.OdU 60.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents