Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Isiokwu 8—Isi Asatọ Nchekwa Echekwara Eziokwu

    Ihe mere anyị ji bụrụ ndị kwesiri ife Chineke ofufe bụ n’ihi na Ọ bụ Onye kere ihe niile. “Batanụ ka anyị kpọ isi ala, huruokwa ala, k’anyị gbuo ikpere n’ala n’iru Jehova, Onye meworo anyị” Abụọma 100:3; 95:6.OdU 69.1

    N’akwụkwọ Mkpughe 14, a kpọrọ anyị k’anyị kpọ isi ala nye Onye Okike, ma debe iwu niile nke Chineke. Otu n’ime iwu ndị na-atụ Chineke aka kpọmkwem bụ ịbụ Onye Okike. “Ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izu ike nke Onye Nwe Anyị...n’ihi na ụbọchị isii ka Jehova mere eligwe na ụwa, n’oke osimiri, na ihe niile dị ha n’ime, we zue ike n’ụbọchị nke asaa: n’ihi nke a, ka Jehova gọziri ụbọchị izu ike, dokwa ya nsọ” (Ọpụpụ 20:10, 11). Maka ụbọchị izu ike, Onye Nwe Anyị sịrị, “Doonụ ụbọchị izu ikem nile nsọ; ha ga-aghọkwa ihe ịrịba ama n’etiti Mụ na unu, ka unu we mara na Mụ ọnwe bụ Jehova, bụ Chineke unu” Ezekiel 20:20. A sị na ụwa niile edobe ụbọchị izu ike Chineke, echiche na ịhụnanya mmadụ gaara ahụ Chineke dị ka Onye a na-asọpụrụ na Onye a naefe, OdU 69.2

    agaghị enwe ndị na-efe arụsị, ndị na-ekweghị na Chineke, ma ọ bụ ndị na-amaghị Chineke. Idebe ụbọchị izu ike bụ ihe ịrịba ama na anyị na-erubere Ezi Chineke isi, “Onye mere eligwe na ụwa, na oke osimiri, na isi iyi niile”. Ọ na-egosi na ozi nke kwadoro mmadụ ịkpọ isi ala na idebe iwu niile nke Chineke, na-akpọ anyị n’ụzọ pụrụ iche idebe iwu nke anọ.OdU 69.3

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents