Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Emeriela Setan

    Dịka a ga-asị na ọ bụ ihe iju anya, ndị mmehie lekwasịrị anya n’ọchịchị eze nke Nwa Chineke. Ha na ahụ na aka Ya mbadamba nkume edepụtara iwu Chineke bụkwanụ nke ha lelịrị anya. Ha hukwara n’onwe ha ụdị mmasị ndị azọpụtara jiri fee ofufe; ma dịka ikuku ụda abụ dị ụtọ na efegharị n’ebe igwe mmadụ ndị a nọ, bụ ndị na-anọghị n’ime obodo ahụ, ha niile we tie mkpu sị, “Ụzọ Gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị Eze nke mba niile” Nkpughe 15:3.OdU 105.3

    Setan dịka onye kpọnwụrụ akpọnwụ. Onye bubu mmọ ozi na-ekpuchi ekpuchi, o chetara ebe o siri we dapụ. Na ọgbakọ ebe a naara asọpụrụ ya ka achụpụrụ ya rue ebighi ebi. O we hụ ka onye ọzọ guzoro n’ebe Nna ahụ nọ, bụ mmọ ozi nke dị ebube. Ọ matara na ọnọdụ dị elu nke mmọ ozi a gaara abụ nke ya.OdU 105.4

    O chetara ụlọ obibi ya mgbe ọ naara akpa agwa dị mma, udo na ihe ndị o nwere tupu nnupu isi we bata n’ime ya. O legharịrị anya n’ọlụ ya n’ebe mmadụ nọ, ya na ihe ọlụ ahụ lụpụtara bụ mmadụ ibu iro megide mmadụ ibe ya, ịla ndụ n’iyi n’ụzọ dị oke egwu, ala eze akwaturu akwatu, ọgbaghara, ndọrọ ndọrọ na ibu agha. Ọ kpọghachiri obi ya azụ na mbọ ya mgbe ọ bụla imegide ọlụ nke Kraịst. Mgbe ọ na-elegide anya na mkpụrụ nke ndọlị ya niile, nanị ihe ọ na-ahụ bụ ọdida. Mgbe ọ bụla ka oke ndọrọ ndọrọ na-aga n’iru ka a na emeri ya, e we mee ka ọ daa.OdU 105.5

    Ebumnobi onye nnupu isi a dị ukwuu bụ igosi na ọ bụ ọchịchị nke Chineke kpaliri ọgụ a. O mere ka ọtụtụ igwe mmadụ kwere n’okwu a o kwuru. N’ime ọtụtụ arọ ka onye isi ndị gbara izu ọjọọ a weere okwu ụgha gbanwe eziokwu. Ma oge eruola mgbe akụkọ ihe e mere, ya na agwa nke Setan ga-apụta ihe. Na mbọ ikpeazụ ya ịchụpụ Kraịst n’oche eze Ya, laa ndị Ya n’iyi we were obodo nke Chineke, onye nduhie ọjọọ a ka e kpughere nke ọma. Ndị niile ya na ha na-alụkọ ọlụ we hụ ikpu afọ n’ala nke mgbalị ya niile.OdU 106.1

    Setan, hụrụ na nhọrọ ya, bu ibu agha megide Chineke, emeela ka ọ ghara itozu oke ịga eligwe. Ọ zụrụ onwe ya nke ọma ibu agha megide Chineke; ịdị ọcha na nkwekọrịta nke eligwe naabụrụ ya ịta ahụhụ dị uku. O hudara isi ya ala we kwupụta na ikpe ekpere ya ziri ezi.OdU 106.2

    Ajụjụ niile banyere eziokwu na okwu ụgha n’ime ndọrọ ndọrọ a diterela anya ka e mere ka o doo anya. Ihe nlụpụta nke ịlelị ụkpụrụ nke eligwe ka e mere ka o ghere oghe n’anya mmadụ niile bi n’ụwa. Ihe akụkọ banyere mmehie ga-adịgide rue ebighi ebi ka ọ bụrụ ihe ama na n’ebe iwu Chineke dị ka ekekọrọ obi ụtọ nke mmadụ niile Chineke kere. Ụwa a niile, ndị na-ege Ya ntị na ndị nnupu isi weere otu olu we sị, “Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị Eze nke mba niile”.OdU 106.3

    Oge eruola mgbe a ga-enye Kraịst otuto karịa aha ọ bụla bụ aha. N’ihi na ọñụ dị n’iru Ya, ka Ya onwe Ya we dọbata ụmụ Ya n’ime otuto - Ọ tachiri obi Ya gaa n’elu obe. Ọ na-elekwasịkwa ndị ahụ agbapụtara anya, bụ ndị emere ka ha dị ọhụụ ọzọ na oyiyi nke Ya. Ọ na-ahụtakwa n’ime ha, ihe nlụpụta nke ihe niile mkpụrụ obi Ya gabigara, nke nyekwara Ya afọ ojuju; Aịsaịa 53:11. N’olu nke ruru ebe igwe mmadụ ndị a nọ, ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume, O we kwue sị: “Lee ndị ọbara M zụtara! N’ihi ndị a ka M tara ahụhụ, n’ihi ndị a ka M nwụrụ.”OdU 106.4

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents