Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ihe Nlụpụta Nke Ikpe Ekpere Na Ịmụ Akwụkwọ Nsọ

    Akwụkwọ nsọ abụghị ihe a ga-amụ na ekpeghị ekpere, nanị Mọ Nsọ pụrụ ime ka anyị nwe nhuku ịdị mkpa nke ndị ahụ dị mfe ịghọta ma ọ bụ gbochie anyị inwe nsogbu n’ịghọta eziokwu ndị ahụ siri ike na nghọta. Ndị mọ ozi nke eluigwe na-akwadebe obi anyị ịghọta okwu Chineke. Imamma Ya ga-adọta anyị, nkwa Ya ga-agba anyị ume. Ọtụtụ mgbe, ọnwụnwa na-adị ka ihe a naapụghị imeri n’ihi na oge ahụ ọnwụnwa rutere, enweghị ike mgbe ahụ icheta nkwa Chineke ma were ngwa agha nke akwụkwọ nsọ guzogide Ekwensu. Ma ndị mọ ozi nọ gburu gburu ndị ahụ mwere mmasị ka ezi ha ihe. Ha ga-emekwa ka ha cheta eziokwu ndị ahụ a chọrọ.OdU 66.4

    “Onye ahụ ga-ezi unu ihe nile, mekwa ka unu cheta okwu nile mụ onwem gwara unu”. Jọn 14:26. OdU 67.1

    Ma ozizi nke Kraịst abụrụlarị nke na-adịla adị n’ime obi nke ga-eme ka Mọ Chineke kpọghachite ha n’echiche anyị n’oge ọnwụnwa. N’oge na-adịghị anya, a ga-eme mkpebi banyere ọnọdụ igwe mmadụ jupụtara ụwa. Onye ọ bụla na-eso ụzọ Kraịst kwesiri iji obi ya nile jụọ ajụjụ sị, “Onye Nwe Anyị, gịnị ka ị chọrọ ka m mee? Ọlụ Ndị Ozi 9:6. Ugbu a ka anyị kwesiri ịchọ n’ụzọ dị omimi ibi ndụ n’ihe nke Chineke. Anyị enweghị ohere ọ bụla itufu. Anyị nọ na ala ebe Ekwensu na-adọrọ mmadụ. Unu ehila ụra, ndị nche nke Chineke! Ọtụtụ na-eto onwe ha na omume ọjọọ nke ha na-adịghị eme. O zughị oke na ha bụ osisi na ubi nke j Chineke, ha kwesiri ịmị mkpụrụ. N’akwụkwọ ndị dị n’eluigwe, edebara aha ha dịka ibu nye ala.OdU 67.2

    N’agbanyeghị nke a, Obi nke hụrụ ahụhụ dị uku n’ịhụnanya, ka na-arịọkwa arịrịọ nye ndị jụrụ ebere Chineke na amara Ya.OdU 67.3

    Mgbe ọkọchị na esichabeghị ike, anaghị ahụta ihe dị iche n’etiti osisi ndị na-enwe akwụkwọ ndụ mgbe nile na osisi ndị ọzọ ma mgbe ifufe ụgụrụ bịara, ndị na-enwe akwụkwọ ndụ mgbe nile na-anọgide na-enweghị mgbanwe ebe akwụkwọ osisi ndị ọzọ naadasịcha. Ka mmegide dị, ka nnagide ghara ịdịkwa ọzọ, ka mkpagbu bido, ndị na-enweghị mmasị na ndị na-ekwu ọzọ ma naeme ọzọ ga-ahapụ okwukwe ha; ma onye na-eso ụzọ Kraịst kwesiri ntụkwasị obi ga-eguzosike, okwukwe ya ga-adị ike karịa, olile anya ya ga-apụta ihe karịa n’ụbọchị ndị ahụ ọ nọ n’afọ ojuju.OdU 67.4

    “Ọ ga-adịkwa ka osisi akụworo n’akụkụ mmiri, ọ bụkwa n’akụkụ osimiri ka ọ na-awasa mkpọrọgwụ ya, ọ dịghị atụkwa egwu mgbe okpomọkụ na-abịa, ma akwụkwọ ya ga-abụ akwụkwọ ndụ; ọzọ, n’arọ mgbochi mmiri ozuzo, ọ gaghị echegbu onwe ya. Ọ gaghị apụkwa n’ịmị mkpụrụ.” Jeremaịa 17:8.OdU 68.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents