Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Ebe Obibi Ikpeazụ Anyị

    “M we hụ eligwe ọhụụ na ụwa ọhụụ; n’ihi pa eligwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ agabigala”. Nkpughe 21:1. Ọkụ ahụ repịara ndị mmehie ka ejiri mee ka ụwa dị ọcha. Ihe ọ bụla ejiri amata ọbụbụ ọnụ ahụ ka azachapụrụ. E nweghị ọkụ ala mmụọ ebighi ebi ga-adị n’iru ndị ahụ agbapụtara bụ nlụpụta na-atụ egwu nke mmehie.OdU 108.2

    Otu ihe ncheta ga-adị n’arụ Ya: Onye mgbapụta anyị gaeburịrị akara nke mkpọgbu n’obe n’aka Ya, nanị ya ga-abụ ihe ọmụma nke ọlụ ọjọọ nke mmehie lụtara. Site n’ọgbọ ebighi ebi nile, ọnya nke Kalvarị ga-egosi kwa otuto Ya, we kwupụtakwa ike Ya.OdU 108.3

    Kraịst mesiri ndị na-eso ụzọ Ya obi ike na Ya gara imeziri ha ebe obibi n’ụlọ Nna ahụ. Asụsụ mmadụ ezughị oke iji kọwaa ụgwọ ọlụ nke ndị ezi omume. A ga-eme ka nanị ndị ga-anata ya mata ya. E nweghị echiche mmadụ ọ bụla pụrụ ịghọta otuto nke Paradaịs nke Chineke!OdU 108.4

    N’ime akwụkwọ nsọ, ihe nketa nke ndị azọpụtara ka a kpọrọ “Obodo”. Ndị Hibru 11:14-16. N’ebe ahụ, onye ọzụzụ atụrụ nke eligwe duuru igwe atụrụ ya rue n’isi mmiri dị ndụ. E nwere iyi ha ndị na-asọ mgbe niile, na-enwu dịka ugegbe, n’akụkụ ha dịkwa osisi na-efegharị efegharị, na-ewerekwa onyonyo ha naekpuchi okporo ụzọ akwadebere maka ndị ahụ agbapụtara nke Onye Nwe Anyị. Mbara ala gbasara agbasa we zalie elu dịka ugwu mara mma, ugwu nile nke Chineke we wepụta ịdịmma nke ọgbakọ ahụ. N’ala udo ahụ dị larịị, n’akụkụ mmiri ndị ahụ dị ndụ, ndị nke Chineke, bụ ndị ije na ngagharị ọtụtụ oge, ga-achọta ebe obibi.OdU 108.5

    “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie...ndị M rọpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha lụtara mgbe dị anya nke ukuu”. Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwu ọñụ, gbawa okoko ọhịa dịka Ros.” “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa...nwatakịrị ga na-edukwa ha...Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m niile”. Aịsaịa 65:21, 22; 35:1; 11:6,9.OdU 109.1

    Ihe mgbu agaghị adị n’eligwe. Anya mmiri agaghị adịkwa ọzọ, agaghị enwekwa ndị bịara olili mmadụ. “Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ, iru uju ma ọ bụ ịkwa akwa agaghị adịkwa ọzọ...n’ihi na ihe ochie agabigawo”. “Onye obibi ya agaghị asị, A na m arịa ọrịa: a ga-ebupu ajọ omume nke ndị bi n’ime ya”. Nkpughe 21:4; Aịsaịa 33:24.OdU 109.2

    E nwere Jeruselem ọhụụ, bụ obodo edoziri edozi nke ụwa nwere otuto. “Ihe ọ na-enye yiri nkume dịkarịsịrị oke ọnụ ahịa, dịka nkume jaspa, dịka crystal”. “Mba nile ga-ewerekwa ihè Ya jegharịa: ndị eze nke ụwa na-ewebatakwa ebube ha n’ime ya”. “Ụlọ ikwu nke Chineke dinyere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe Ya gaanọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha” Nkpughe 21: 11; 24:3.OdU 109.3

    N’obodo Chineke ahụ, “abalị agaghị adị” Nkpughe 22:5. Ịda mba agaghị adị ya. Anyị ga-anata ufere oyi ụtụtụ nke naagaghị agwụ agwụ. Ihè nke anyanwụ nke igbu mara mara ya naadịghị afụ ụfụ n’arụ ga-ewere ọnọdụ ya, nke ogbu mara mara ya ga-akarị nke etiti ehihie. Ndị agbapụtara ga-ejegharị na ebube nke ehihie na-adịgide mgbe nile.OdU 109.4

    “Ọ dịghị kwa ụlọ nsọ ọ bụla m hụrụ n’ime ya: n’ihi na Onye Nwe Anyi, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, Ya na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ ya” Nkpughe 21:22. Ndị nke Chineke nwere iru ọma, ha na Nna, na Nwa Ya Nwoke, ikekọrịta ihe ọnụ. Ugbu a, anyị na-ahụ onyonyo Chineke ka ihe dị na ugegbe, kama mgbe ahụ anyị ga-ahụ Ya iru na iru, na-enweghị ihe mgbochi ọ bụla gaadị n’etiti.OdU 110.1

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents