Loading...
Larger font
Smaller font
Copy
Print
Contents
Olileanya Dị Ukuu - Contents
  • Results
  • Related
  • Featured
No results found for: "".
  • Weighted Relevancy
  • Content Sequence
  • Relevancy
  • Earliest First
  • Latest First
    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents

    Mmeri Nke Ịhụnanya Chineke

    N’ebe ahụ ka ịhụnanya nke ọmiko nke Chineke kụnyere n’obi mmadụ ga-enweta ezigbo ihe omume kachasị ụtọ. Nkekọrịta ahụ dị ọcha nke dị n’etiti ndị nsọ nke eligwe na ndị kwesiri ntụkwasị obi nke oge niile, njikọta dị nsọ na-ekechikọta ọnụ “nke ezi na ụlọ nke eligwe na ụwa” - ndị a ga-enye aka we mejupụta ọñụ nke ndị agbapụtara (Ndị Efesọs 3:15).OdU 110.2

    N’ebe ahụ, echiche nke ndị n’adịghị anwụ anwụ, ndị nwekwara mmasị dị ukuu, chere echiche banyere ọlụ ebube nke dị n’ike okike, ihe omimi dị n’ịhụnanya nke mgbapụta. Ike nke mmụọ onye bụla ga-eto eto, ike ime ihe niile ga-amụba. Ịmụta ihe agaghị eme ka ike gwụ mmadụ. Ihe omume dịkarịsịrị mma ka a ga-eme, a ga-enwetekwa mmezu nke ọchịchọ ndị ahụ mara nnukwu mma, a ga-enwetekwa ọchịchọ ndị ahụ dịkarịsịrị elu. A ga-enwekwarịị ihe ndị ahụ dị ọhụụ a ga-emezurịrị, ihe ebube dị ọhụụ ga-adị mma n’anya, eziokwu dị ọhụụ ka a ga-aghọta ya na ihe ndị ha dị ọhụụ nke ga-akpali ike nke obi, nke mmụọ na nke anụ arụ.OdU 110.3

    Akụ niile nke ụwa a, ka a ga-emeghere ndị nke Chineke agbapụtara. Ihe ndị na-enweghị mgbochi nke sitere n’ịnwụ anwụ. Ha na-efekwa rue ụwa ndị dị ebe dị anya ma ike agaghị agwụ ha.OdU 111.1

    Ụmụntakịrị nke batara n’ime ọñụ na izu ndị na-emehieghi wee keta oke na akụ nke ihe ọmụma e nwetara site na ọgbọ rue na ọgbọ. Site n’ilegide anya na ebube nke ihe e kere eke nke naenweghị mgbochi anyanwụ ha, kpakpando na usoro ha niile bụ ndị nọ n’ọnọdụ edobeere ha, gbara oche eze nke Chineke gburu gburu.OdU 111.2

    Dịka arọ niile nke ebighi ebi na-agafe, a ga-ekpughekwa ebube ndị ọzọ banyere Chineke, otu a kwa ka mmasị banyere agwa Ya ga-esi dịkwa elu. Dịka Jisọs na-emeghere ha ihe ọma niile banyere mgbapụta Ya, na ihe nnweta ịtụnanya nke dị na oke ndọrọndọrọ a dị n’etiti Ya na Ekwensu, obi ndị agbapụtara gaejupụta n’ofufe, nnụ-kwuru-nnụ mmadụ ga-ejikọ olu ha ọnụ wee bụa abụ otuto.OdU 111.3

    “M we nụ ihe niile ọ bụla e kere eke, nke dị n’eligwe na n’elu ụwa, na n’okpuru ụwa, na n’elu oke osimiri, ha na ihe niile dị ha n’ime, ka ha na-asị: “Ọ bụ Onye ahụ nke na-anọkwa n’oche eze ahụ, ya na Nwa Atụrụ ahụ, ka ngọzi niile, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile, dịịrị rue mgbe niile ebighi ebi” Nkpughe 5:13.OdU 111.4

    Oke ndọrọndọrọ a akwụsila. Mmehie na ndị mmehie anọghịkwa ọzọ. Emeela ka ụwa niile dị ocha. Otu uda nke udo na obi ụtọ dara site n’ebe ihe ekere eke dị. site n’ebe Onye ahụ kere ihe niile, ka ndụ na ihè, na obi ụtọ, na-asọpụta, nke na-erukwa n’ala Eze nke oghere ya enweghị atụ. Site na ihe dịkarịsịrị ntakịrị e ji eme ihe, ruekwa n’ụwa kachasị ụwa niile, ihe niile, ndị na-eku ume, na ndị na anaghị eku ume, n’irna mma ha nke n’enweghị mkpuchi, ya na ọñụ zuru oke, ha na-ekwupụta sị na Chineke bụ ịhụnanya.OdU 111.5

    Larger font
    Smaller font
    Copy
    Print
    Contents